Ezikiel 17:1-24
17 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, tụọrọ ndị Izrel ilu ma ọ bụ meere ha ihe atụ.+
3 Kwuo, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Otu nnukwu ugo+ feere gaa Lebanọn+ fegoro n’elu elu otu osisi sida.+ Ugo ahụ tụrụ àgwà, nwee nnukwu nku. Ábụ́bà* juru ya n’ahụ́. Ábụ́bà ndị ahụ tokwara ogologo.
4 Ọ tụbiri ọnụ ọnụ alaka osisi ahụ, buru ya bute n’ala ndị na-azụ ahịa,* busa ya n’obodo ndị ahịa.+
5 O wekwaara ụfọdụ n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ*+ kụọ n’ala na-eme nri. Ọ kụrụ ya n’akụkụ nnukwu mmiri otú e si akụ mkpụrụ wilo.
6 Mkpụrụ ahụ pukwara ma bụrụ osisi vaịn dị mkpụmkpụ, nke wasara awasa.+ Alaka ya na-agbasa gburugburu gburugburu. Mgbọrọgwụ ya na-agbasakwa n’okpuru alaka ya ahụ. Otú a ka o si bụrụ osisi vaịn, waa ngalaba, waakwa alaka.+
7 “‘“E nwekwara nnukwu ugo ọzọ,+ nke nwere nnukwu nku, nweekwa nnukwu ábụ́bà.+ Osisi vaịn ahụ hapụrụ ala a kụrụ ya gbasaa mgbọrọgwụ ya ka o ruo ebe ugo a nọ. Ọ gbasakwara alaka ya ka ugo ahụ gbaa ya mmiri.+
8 Ma, a kụrụ ya n’ala dị mma, n’akụkụ nnukwu mmiri, ka ọ bụrụ nnukwu osisi vaịn, ka alaka ya gbasaa, ka ọ mịakwa mkpụrụ.”’+
9 “Kwuo, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ ga-eme nke ọma? Ọ̀ bụ na mmadụ agaghị efopụ mgbọrọgwụ ya,+ nke ga-eme ka mkpụrụ ya mebie, alaka ya akpọnwụọkwa?+ Ọ ga-akpọ ezigbo nkụ nke na nwoke siri ike ma ọ bụ ìgwè mmadụ agaghị efopụli ya.
10 Ọ bụrụgodị na a dọgharịa ya, ọ̀ ga-eme nke ọma? Ọ̀ bụ na ọ gaghị akpọnwụcha ma ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee ya? Ọ ga-akpọnwụ n’ebe a kụrụ ya.”’”
11 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:
12 “Biko, gwa ndị a na-enupụ isi, sị, ‘Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe ihe ndị a pụtara?’ Gwa ha, sị, ‘Eze Babịlọn bịara Jeruselem kpụrụ eze ya na ndị isi ya laa Babịlọn.+
13 Ọ kpọkwaara otu n’ime ụmụ eze,*+ ya na ya agbaa ndụ, ya emeekwa ka ọ ṅụọrọ ya iyi.+ Ọ kpụkwaara ndị a ma ama n’obodo,+
14 ka e wee wetuo mba Izrel ala, ka ha gharakwa ibili, ka ha wee dịrị na-aga naanị ma ha mee ihe ha na eze Babịlọn gbara ná ndụ.+
15 Ma, eze Juda mechara nupụrụ eze Babịlọn isi.+ O zigara ndị mmadụ Ijipt ka ndị Ijipt kpụnye ha ịnyịnya,+ kpọnyekwa ha ìgwè ndị agha.+ Ọ̀ ga-agaziri ya? Ọ̀ bụ na a gaghị ata onye mere ihe ndị a ahụhụ? Ọ̀ ga-ahapụ ime ihe ha gbara ná ndụ a ghara ịta ya ahụhụ?’+
16 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, eze Juda ga-anwụ na Babịlọn. Ebe ahụ ka eze* chiri ya* eze bi, onye ọ na-emeghị ihe ọ ṅụụrụ ya n’iyi, onye ọ na-emeghịkwa ihe ya na ya gbara ná ndụ.+
17 Ìgwè ndị agha Fero niile agaghị enyere eze Juda aka ọ bụla+ mgbe ndị agha Babịlọn ga-eji ájá rụọ mgbidi siri ike iji nọchibido obodo a.
18 Eze Juda emeghị ihe ọ ṅụrụ n’iyi. O mebikwara ndụ ya na onye ọzọ gbara. O mere ihe a niile n’agbanyeghị na o kwere nkwa irube isi. A ga-ata ya ahụhụ.”’
19 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eme ka o jiri isi ya buru ihe ga-eme ya maka na o meghị ihe o ji aha m ṅụọ iyi na ọ ga-eme.+ O mebikwara ndụ ya na onye ọzọ nọ n’ihu m gbaa.
20 M ga-eji ụgbụ m ji achụ nta kpuchie ya, jirikwa ya jide ya.+ M ga-akpụrụ ya gaa Babịlọn, kpeekwa ya ikpe ebe ahụ n’ihi isi o nupụụrụ m.+
21 A ga-eji mma agha gbuo ndị agha ya niile gbara ọsọ ndụ. A ga-achụsasịkwa ndị nke fọrọnụ ebe niile.+ Unu ga-amarakwa na ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova kwuru ihe a.”’+
22 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-agbajiri otu alaka n’ọnụ ọnụ osisi sida ahụ toro ogologo.+ M ga-adọkwa ya. M ga-agbajiri ome o pupụtara n’elu alaka ya.+ M ga-adọkwa ya n’elu otu ugwu dị elu.+
23 M ga-adọ ya n’otu ugwu dị elu n’Izrel. Alaka ya ga-agbasakwa, ya amịa mkpụrụ, ghọọkwa nnukwu osisi sida. Ụdị nnụnụ dị iche iche ga-ebi n’okpuru ya, ebe ndò si n’alaka ya na-ekpuchi.
24 Osisi niile dị n’ọhịa ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, ewedala osisi dị elu ala ma bulie osisi dị ala elu.+ M meela ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, meekwa ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ dịrị ndụ.+ Mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a, meekwa ya.”’”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Ugbene.”
^ Na Hibru, “n’ala Kenan.”
^ Ọ ga-abụ ala Juda ka a na-ekwu ebe a.
^ Na Hibru, “mkpụrụ eze.”
^ Ya bụ, Nebukadneza.
^ Ya bụ, Zedekaya.