Ezikiel 15:1-8

  • Jeruselem dị ka osisi vaịn na-abaghị uru (1-8)

15  Jehova gwara m ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, olee otú osisi vaịn si dị iche n’osisi ndị ọzọ ma ọ bụ alaka ndị dị n’osisi ndị ọzọ dị n’oké ọhịa?  À na-esi na ya egbute osisi e ji arụ ọrụ? Ka ndị mmadụ hà na-esi na ya egbute osisi ha ji ekonye arịa dị iche iche?  A ga-atụnye ya n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ. Ọkụ ahụ ga-ere isi ya abụọ. Etiti ya ga-erekwa ghọọ icheku ọkụ. À ka nwere ihe a ga-eji ya rụọ?  Mgbe ọkụ na-erebeghị ya, e jilighị ya rụọ ihe ọ bụla. Gịnịzi ka a ga-eji ya rụọ mgbe ọkụ rere ya, ya aghọọ icheku ọkụ?”  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘M ga-emesi ndị bi na Jeruselem ike otú m mere osisi vaịn ahụ dị n’oké ọhịa ebe osisi ndị ọzọ dị. M tụbara ya n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ.+  Echeela m ha ihu ka m mee ha ihe. Ha si n’ọkụ pụta, ma ọkụ ga-erepịa ha. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m ga-eche ha ihu ka m mee ha ihe.’”+  “‘M ga-emekwa ka ala ha tọgbọrọ nkịtị+ n’ihi na ha nupụụrụ m isi.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji