Ezikiel 10:1-22

  • E si n’etiti wiil dị iche iche chịrị icheku ọkụ (1-8)

  • Otú ndị cherob na wiil ndị Ezikiel hụrụ dị (9-17)

  • Ebube Chineke si n’ụlọ nsọ pụọ (18-22)

10  Ka m nọ na-ekiri ihe na-eme, m hụrụ ihe yiri nkume safaya n’elu mbara igwe dị n’elu isi ndị cherob. Ihe ahụ yiri ocheeze.+  Chineke* gwaziri nwoke ahụ yi uwe linin,+ sị: “Banye n’etiti wiil ndị ahụ,+ n’okpuru ndị cherob ahụ, si n’agbata ndị cherob ahụ chịjuo icheku ọkụ n’aka gị abụọ+ ma wụọ ha n’obodo ahụ.”+ O wee banye ebe ahụ ka m nọ na-ele ihe na-eme.  Ndị cherob ahụ guzo n’akụkụ aka nri nke ụlọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere, ígwé ojii jukwara n’ogige dị n’ime.  Ebube Jehova+ sikwa n’ebe ndị cherob ahụ nọ pụọ gaa dịrị n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ígwé ojii wee jiri nwayọọ nwayọọ ju n’ụlọ ahụ.+ Ìhè nke ebube Jehova jukwara n’ogige ahụ.  A nọkwa n’ogige dị ná mpụta na-anụ ụda nku ndị cherob ahụ. Ọ na-ada ka ebe Chineke, bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na-ekwu okwu.+  Chineke gwaziri nwoke ahụ yi uwe linin, sị: “Gụrụ ọkụ n’etiti wiil ndị ahụ, n’agbata ndị cherob ahụ.” Nwoke ahụ banyekwara ma guzoro n’akụkụ wiil ndị ahụ.  Otu cherob matịkwara aka ka o si n’ọkụ dị n’agbata ndị cherob ahụ gụrụ ọkụ.+ Ọ gụkwaara ụfọdụ icheku ọkụ gụnye n’ọbụ aka onye ahụ yi uwe linin,+ ya achịrị ha pụọ.  Ndị cherob ahụ nwere ihe yiri aka mmadụ n’okpuru nku ha.+  Ka m nọ na-ekiri ihe na-eme, m hụrụ wiil anọ n’akụkụ ndị cherob ahụ. Otu wiil dị n’akụkụ cherob nke ọ bụla. Wiil ndị ahụ na-egbu maramara ka nkume krisolaịt.+ 10  A bịa n’otú ha dị, ha anọ yiri ibe ha. Otu wiil dịkwa ka à ga-asị na ọ dị n’ime wiil ọzọ. 11  Ha gawa ebe ha na-aga, ha nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha n’atụgharịghị atụgharị, n’ihi na ha na-aga ebe ọ bụla isi ya chere ihu n’atụgharịghị atụgharị. 12  Ahụ́ cherob ndị ahụ, azụ ha, aka ha, nku ha, na wiil ha niile, ya bụ, wiil ha anọ nwere, bụcha anya anya.+ 13  M nụkwara olu gwara wiil ndị ahụ, sị, “Wiil, gawanụ!” 14  Nke ọ bụla* nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ bụ ihu cherob. Ihu nke abụọ bụ ihu mmadụ. Ihu nke atọ bụ ihu ọdụm. Ihu nke anọ bụ ihu ugo.+ 15  Ndị cherob ahụ bụ ndị mmụọ ozi ahụ* m hụrụ n’osimiri Kiba.+ Ha na-ebili, 16  mgbe ha na-agakwa, wiil ndị ahụ na-eso ha aga. Ndị cherob ahụ welie nku ha ka ha si n’ala felie, wiil ndị ahụ dị n’akụkụ ha anaghị atụgharị atụgharị.+ 17  Ọ na-abụ cherob ndị a kwụrụ otu ebe, wiil ndị ahụ akwụrụkwa otu ebe. Ha bilie, wiil ndị ahụ esorokwa ha bilie, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dị n’ime ha. 18  Ebube Jehova+ sikwa n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ ma dịrị n’elu ndị cherob ahụ.+ 19  Ka m nọ na-ele ihe na-eme, ndị cherob ahụ weliri nku ha si n’ala felie. Mgbe ha feliri, wiil ndị ahụ dịkwa n’akụkụ ha. Ha kwụsịrị n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ụlọ Jehova. Ebube Chineke Izrel dịkwa n’elu ha.+ 20  Ndị a bụ ndị mmụọ ozi ahụ* nọ n’okpuru ocheeze Chineke Izrel, ndị m hụrụ mgbe m nọ n’akụkụ osimiri Kiba.+ Otú a ka m si mata na ha bụ ndị cherob. 21  Nke ọ bụla n’ime ha anọ nwere ihu anọ na nku anọ. Ihe yiri aka mmadụ dịkwa n’okpuru nku ha.+ 22  Ihu ha dị ka ihu ndị ahụ m hụrụ n’akụkụ osimiri Kiba.+ Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ọ.”
Ya bụ, cherob nke ọ bụla.
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”