Ezikiel 1:1-28

  • Chineke mere ka Ezikiel hụ ọhụụ na Babịlọn (1-3)

  • Ezikiel hụrụ ụgbọ ịnyịnya Jehova nke na-agba n’eluigwe (4-28)

    • Oké ifufe, ígwé ojii, na ọkụ (4)

    • Ndị mmụọ ozi anọ (5-14)

    • Wiil anọ (15-21)

    • Ihe yiri mbara igwe nke na-egbu maramara ka mkpụrụ mmiri (22-24)

    • Ocheeze Jehova (25-28)

1  N’abalị ise n’ọnwa anọ n’afọ nke iri atọ,* mgbe mụ na ndị a dọọrọ n’agha bi+ n’akụkụ osimiri Kiba,+ eluigwe meghere, Chineke emee ka m hụwa ọhụụ.  N’abalị ise n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke ise a dọọrọ Eze Jehoyakin n’agha,+  Jehova gwara Ezikiel* nwa Buzaị bụ́ onye nchụàjà okwu n’ala ndị Kaldia,+ n’akụkụ osimiri Kiba. Jehova nyekwara ya ike ebe ahụ.+  M hụrụ ka oké ifufe+ si n’ebe ugwu fere na-abịa, hụkwa nnukwu ígwé ojii na ọkụ na-enwu enwu.*+ Ìhè na-egbuke egbuke gbakwara ígwé ojii ahụ gburugburu. Ihe yiri ọla na-egbu maramara* dịkwa n’etiti ọkụ ahụ.+  Ahụrụ m ndị yiri ndị mmụọ ozi anọ*+ n’ime ọkụ ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha yiri mmadụ.  Nke ọ bụla nwere ihu anọ na nku anọ.+  Ụkwụ ha kwụ nnọọ ọtọ. Ọbụ ụkwụ ha yikwara ọbụ ụkwụ nwa ehi. Ụkwụ ha na-egbukekwa egbuke ka ọla kọpa nke na-egbu maramara.+  Ha nwere aka mmadụ n’okpuru nku nke ọ bụla. Ha anọ nwere ihu, nweekwa nku.  Nke ọ bụla n’ime nku ha na-emetụ ibe ya. Ha anọ anaghị atụgharị atụgharị ma ha na-aga. Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu.+ 10  A bịa n’otú ihu ha dị, ha anọ nwere ihu mmadụ, nwee ihu ọdụm+ n’akụkụ aka nri, nweekwa ihu oké ehi+ n’akụkụ aka ekpe. Ha anọ nwekwara ihu+ ugo.+ 11  Otú ahụ ka ihu ha dị. Ha gbasapụkwara nku ha agbasapụ ma chịlie ha elu. Nke ọ bụla nwere nku abụọ na-emetụ ibe ha, abụọ kpuchikwara ahụ́ ha.+ 12  Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu. Ha na-aga ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa.+ Ha anaghị atụgharị atụgharị ma ha na-aga. 13  Ndị mmụọ ozi ahụ* na-acha ọkụ ka icheku ọkụ. Ihe yiri ọwa ọkụ na-enwu enwu na-aga ihu na azụ n’agbata ha. Àmụ̀mà sikwa n’ọkụ ahụ na-egbu.+ 14  Ndị mmụọ ozi ahụ* na-egbu ka àmụ̀mà ka ha na-apụ ma na-alọghachi. 15  Ka m nọ na-ele ndị mmụọ ozi ahụ,* m hụrụ otu wiil dị n’ala n’akụkụ nke ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi ahụ nwere ihu anọ.+ 16  A rụrụ wiil ndị ahụ otú ha na-egbu maramara ka nkume krisolaịt. Ha anọ yiri ibe ha. Otú ha dị dị ka à ga-asị na otu wiil dị n’ime wiil ọzọ.* 17  Ha gawa ebe ha na-aga, ha nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha n’atụgharịghị atụgharị ka ha na-aga. 18  Gburugburu elu wiil ndị ahụ dị elu nke na ha na-atụ egwu. Gburugburu elu wiil anọ ahụ bụ anya anya.+ 19  Ebe ọ bụla ndị mmụọ ozi ahụ* na-aga, wiil ndị ahụ na-eso ha. Ọ bụrụ na e si n’ala bulie ndị mmụọ ozi ahụ elu, a na-ebulikwa wiil ndị ahụ.+ 20  Ha na-aga ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ya bụ, ebe ọ bụla mmụọ nsọ na-aga. A na-ebuli ha na wiil ndị ahụ elu otu mgbe, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dịkwa na wiil ndị ahụ. 21  Ha gawa, wiil ndị ahụ agawa. Ha kwụrụ otu ebe, wiil ndị ahụ akwụrụkwa otu ebe. Ọ bụrụ na e si n’ala bulie ha elu, a na-ebulikọta ha na wiil ndị ahụ, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dịkwa na wiil ndị ahụ. 22  N’elu isi ndị mmụọ ozi ahụ, e nwere ihe yiri mbara igwe nke na-egbu maramara ka mkpụrụ mmiri. Ọ dị egwu, gbasaakwa n’elu isi ha.+ 23  Ha gbasara nku ha agbasa n’okpuru mbara igwe ahụ. Otu na-emetụ ibe ya. Nke ọ bụla n’ime ha nwere nku abụọ kpuchiri otu akụkụ ahụ́ ya. Nke ọ bụla nwekwara nku abụọ kpuchiri akụkụ ahụ́ ya nke ọzọ. 24  Mgbe m nụrụ ụda nku ha mgbe ha na-aga, ọ na-ada ka mmiri na-asọsi ike nakwa ka olu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ha gawa, mkpọtụ ha na-adị ka nke ndị agha. Ha kwụrụ otu ebe, ha na-achịtu nku ha. 25  M nụrụ otu olu n’elu mbara igwe ahụ dị n’elu isi ha. (Mgbe ha kwụ otu ebe, ha na-achịtu nku ha.) 26  N’elu mbara igwe ahụ nke dị n’elu isi ha, e nwere ihe yiri nkume safaya.+ O yikwara ocheeze.+ E nwekwara onye yiri mmadụ nke nọ ọdụ n’elu ihe ahụ yiri ocheeze.+ 27  M hụrụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ ka ọkụ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo. M hụkwara ihe yiri ọkụ, malite n’ihe yiri úkwù ya gbadaa.+ Ìhè na-enwu gburugburu ya 28  yiri eke na egwurugwu+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala. M nụwakwara olu onye na-ekwu okwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ n’afọ Ezikiel gbara afọ iri atọ.
Ezikiel pụtara “Chineke Na-enye Ike.”
Ma ọ bụ “na àmụ̀mà.”
Ọlaedo a gwara ọlaọcha, ya ana-egbu maramara.
Na Hibru, “ihe yiri ihe anọ dị ndụ.”
Na Hibru, “Ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “Ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Ọ ga-abụ na wiil ndị a hà otu.
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “mmụọ nke ihe ndị ahụ dị ndụ.”
Na Hibru, “ihe ndị ahụ dị ndụ.”