Akwụkwọ Ezikiel

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Chineke mere ka Ezikiel hụ ọhụụ na Babịlọn (1-3)

    • Ezikiel hụrụ ụgbọ ịnyịnya Jehova nke na-agba n’eluigwe (4-28)

      • Oké ifufe, ígwé ojii, na ọkụ (4)

      • Ndị mmụọ ozi anọ (5-14)

      • Wiil anọ (15-21)

      • Ihe yiri mbara igwe nke na-egbu maramara ka mkpụrụ mmiri (22-24)

      • Ocheeze Jehova (25-28)

  • 2

    • A họpụtara Ezikiel ka ọ bụrụ onye amụma (1-10)

      • “Ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ” (5)

      • Akwụkwọ mpịakọta e dere abụ iru uju (9, 10)

  • 3

    • A gwara Ezikiel ka ọ taa akwụkwọ mpịakọta Chineke nyere ya (1-15)

    • A họpụtara Ezikiel ka ọ bụrụ onye nche Izrel (16-27)

      • Ọbara onye ajọ omume ga-adị Ezikiel n’isi ma ọ́ dọghị ya aka ná ntị (18-21)

  • 4

    • Ezikiel mere ihe gosiri na a ga-anọchibido Jeruselem (1-17)

      • Ezikiel ga-eburu mmehie ndị mmadụ ụbọchị 390 nakwa ụbọchị 40 (4-7)

  • 5

    • Ezikiel mere ihe gosiri na a ga-ebibi Jeruselem (1-17)

      • Ezikiel onye amụma ga-akpụ isi ya ma kee ntutu ya ụzọ atọ (1-4)

      • Ndị Jeruselem na-eme ihe ọjọọ karịa mba ndị gbara ha gburugburu (7-9)

      • Ụzọ ahụhụ atọ a tara ndị na-enupụ isi (12)

  • 6

    • Ihe a ga-eme ugwu niile dị n’Izrel (1-14)

      • A ga-ala arụsị dị iche iche na-asọ oyi n’iyi (4-6)

      • “Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova” (7)

  • 7

    • Ọgwụgwụ eruola (1-27)

      • Ọdachi a na-enwetụbeghị ụdị ya (5)

      • Ndị mmadụ ga-atụfu ego ha n’okporo ámá (19)

      • A ga-emerụ ụlọ nsọ (22)

  • 8

    • E bugara Ezikiel Jeruselem n’ọhụụ (1-4)

    • Ezikiel hụrụ arụ dị iche iche a na-akpa n’ụlọ nsọ (5-18)

      • Ụmụ nwaanyị na-ebere chi bụ́ Tamọz ákwá (14)

      • Ụmụ nwoke na-akpọrọ anyanwụ isiala (16)

  • 9

    • Mmadụ isii na-ebibi obodo na otu nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ (1-11)

      • A ga-ebido n’ụlọ nsọ kpewe ikpe (6)

  • 10

    • E si n’etiti wiil dị iche iche chịrị icheku ọkụ (1-8)

    • Otú ndị cherob na wiil ndị Ezikiel hụrụ dị (9-17)

    • Ebube Chineke si n’ụlọ nsọ pụọ (18-22)

  • 11

    • Ihe a ga-eme ndị isi na-eme ihe ọjọọ (1-13)

      • E ji Jeruselem tụnyere ite e ji esi nri (3-12)

    • A ga-akpọghachite ndị bi na Jeruselem n’ala ha (14-21)

      • Chineke ga-eme ka mmụọ ya na-akpa ike n’ahụ́ ndị ya (19)

    • Ebube Chineke si na Jeruselem pụọ (22, 23)

    • E buuru Ezikiel buga Kaldia n’ọhụụ (24, 25)

  • 12

    • Ezikiel mere ihe gosiri na a ga-adọrọ ndị Izrel n’agha (1-20)

      • Ngwongwo Ezikiel ga-ebu pụọ ka onye a dọọrọ n’agha (1-7)

      • Onyeisi ga-apụ mgbe ọchịchịrị gbara (8-16)

      • Obi agaghị eru ndị mmadụ ala ka ha na-eri nri, ụjọ ga na-atụkwa ha ka ha na-aṅụ mmiri (17-20)

    • Chineke ga-egosi na ihe ndị mmadụ na-ekwu iji duhie ndị ọzọ abụghị eziokwu (21-28)

      • “Ihe ọ bụla m kwuru ga-emezu n’egbughị oge” (28)

  • 13

    • Ihe ga-eme ndị amụma ụgha (1-16)

      • Mgbidi ndị e tere nzu ga-ada (10-12)

    • Ihe a ga-eme ụmụ nwaanyị na-ebu amụma ụgha (17-23)

  • 14

    • Ihe a ga-eme ndị na-ekpere arụsị (1-11)

    • E nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi Jeruselem (12-23)

      • Noa, Daniel, na Job bụ ndị ezi omume (14,20)

  • 15

    • Jeruselem dị ka osisi vaịn na-abaghị uru (1-8)

  • 16

    • Chineke hụrụ Jeruselem n’anya (1-63)

      • Chineke nyeere Jeruselem aka mgbe ọ dị ka nwa a jụrụ ajụ (1-7)

      • Chineke chọrọ Jeruselem mma, ha agbaakwa ndụ ịbụ di na nwunye (8-14)

      • Jeruselem hapụrụ di ya kwawa iko (15-34)

      • A tara Jeruselem ahụhụ maka iko ọ kwara (35-43)

      • Jeruselem na-eme ka Sameria na Sọdọm (44-58)

      • Chineke chetara ndụ ya na Jeruselem gbara (59-63)

  • 17

    • Ihe atụ gbasara ugo abụọ na otu osisi vaịn (1-21)

    • Otu ome ga-aghọ nnukwu osisi sida (22-24)

  • 18

    • Onye ọ bụla ga-aza ajụjụ ihe o mere (1-32)

      • Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie ga-anwụ (4)

      • Nwa agaghị aza ajụjụ maka mmehie nna ya mere (19, 20)

      • Ọnwụ onye ajọ omume anaghị atọ Chineke ụtọ (23)

      • Mmadụ ichegharị ga-eme ka ọ dịrị ndụ (27, 28)

  • 19

    • Abụ iru uju gbasara ndị isi Izrel (1-14)

  • 20

    • Ụzọ dị iche iche ndị Izrel si nupụrụ Chineke isi (1-32)

    • E kwere ndị Izrel nkwa na a ga-akpọghachite ha n’ala ha (33-44)

    • Ihe a ga-eme mpaghara ndịda (45-49)

  • 21

    • Chineke si n’ọbọ mịpụta mma o ji asụ ndị mmadụ akwụ (1-17)

    • Eze Babịlọn ga-alụso Jeruselem agha (18-24)

    • A ga-anapụ onyeisi ọjọọ na-achị ndị Izrel ọchịchị (25-27)

      • ‘Kpupụ okpueze ya’ (26)

      • “Ruo mgbe onye o ruuru bịara” (27)

    • A ga-eji mma agha gbuo ndị Amọn (28-32)

  • 22

    • Jeruselem bụ obodo ikpe ọbara mara (1-16)

    • Ndị Izrel yiri ọla na-abaghị uru ọ bụla (17-22)

    • Ihe a ga-eme ndị Izrel na ndị ndú ha (23-31)

  • 23

    • Ụmụnne abụọ ndị hapụrụ di ha gaa na-akwa iko (1-49)

      • Ohola na ndị Asiria na-akwa iko (5-10)

      • Oholiba na ndị Babịlọn nakwa ndị Ijipt na-akwa iko (11-35)

      • Ahụhụ a ga-ata ụmụnne abụọ ahụ (36-49)

  • 24

    • Jeruselem dị ka ite tara nchara e ji esi nri (1-14)

    • Ọnwụ nwunye Ezikiel nwere ihe ọ na-egosi (15-27)

  • 25

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Amọn (1-7)

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Moab (8-11)

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Ịdọm (12-14)

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Filistia (15-17)

  • 26

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Taya (1-21)

      • “Ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ” (5,14)

      • A wụnyere nkume na ájá n’ime osimiri (12)

  • 27

    • Abụ iru uju banyere Taya bụ́ obodo kpuru ka ụgbọ mmiri (1-36)

  • 28

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme eze Taya (1-10)

      • “Abụ m chi” (2,9)

    • Abụ iru uju banyere eze Taya (11-19)

      • “Ị nọbu n’Iden” (13)

      • “Ị bụ cherob e tere mmanụ” (14)

      • “Ị na-akpa ezigbo àgwà mgbe niile” (15)

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme Saịdọn (20-24)

    • A ga-akpọghachite ndị Izrel n’ala ha (25, 26)

  • 29

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme Fero (1-16)

    • A ga-enye ndị Babịlọn ala Ijipt ka ihe e ji kwụọ ha ụgwọ (17-21)

  • 30

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Ijipt (1-19)

      • E buru amụma na Nebukadneza ga-alụso ndị Ijipt agha (10)

    • A napụrụ Fero ike ya (20-26)

  • 31

    • A ga-ebibi Ijipt bụ́ nnukwu osisi sida (1-18)

  • 32

    • Abụ iru uju banyere Fero na Ijipt (1-16)

    • A ga-elikọta Ijipt na ndị a na-ebighị úgwù (17-32)

  • 33

    • Ọrụ dị iche iche onye nche na-arụ (1-20)

    • Ezikiel nụrụ na e wegharala Jeruselem (21, 22)

    • Ihe a ga-agwa ndị bi n’obodo a lara n’iyi (23-29)

    • Ndị mmadụ emeghị ihe a gwara ha (30-33)

      • Ndị mmadụ weere Ezikiel ka onye na-agụ “egwú ịhụnanya” (32)

      • “Ha na onye amụma nọ kemgbe” (33)

  • 34

    • Ihe ga-eme ndị ọzụzụ atụrụ Izrel (1-10)

    • Jehova ga-elekọta atụrụ ya (11-31)

      • “Devid ohu m” ga na-azụ ha (23)

      • “Ọgbụgba ndụ udo” (25)

  • 35

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme Sia bụ́ ugwu ugwu (1-15)

  • 36

    • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ugwu ndị dị n’Izrel (1-15)

    • A ga-akpọghachite ndị Izrel n’ala ha (16-38)

      • “M ga-eme ka mmadụ niile mara na aha m nke dị ebube dị nsọ” (23)

      • “Ala nke tọgbọbu nkịtị dịzi ka ogige Iden” (35)

  • 37

    • Ọhụụ gbasara ndagwurugwu ọkpụkpụ kpọrọ nkụ juru (1-14)

    • A ga-ejikọta osisi abụọ ka ha bụrụ otu (15-28)

      • Otu mba nke otu eze ga na-achị (22)

      • Ọgbụgba ndụ udo nke ga-adịru mgbe ebighị ebi (26)

  • 38

    • Gọg ga-alụso ndị Izrel agha (1-16)

    • Jehova ga-eji iwe mee Gọg ihe (17-23)

      • ‘Mba dị iche iche ga-amara na m bụ Jehova’ (23)

  • 39

    • A ga-ebibi Gọg na ndị agha ya (1-10)

    • A ga-eli Gọg na ndị agha ya na Ndagwurugwu Hemọn-Gọg (11-20)

    • A ga-akpọghachite ndị Izrel n’ala ha (21-29)

      • Chineke ga-enye ndị Izrel mmụọ nsọ ya (29)

  • 40

    • A kpọtara Ezikiel n’ala Izrel n’ọhụụ (1, 2)

    • Ezikiel hụrụ ụlọ nsọ n’ọhụụ (3, 4)

    • Ogige dị iche iche na ọnụ ụzọ ámá dị iche iche (5-47)

      • Ọnụ ụzọ ámá chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ (6-16)

      • Ogige dị ná mpụta na ọnụ ụzọ ámá ndị ọzọ (17-26)

      • Ogige nke dị n’ime na ọnụ ụzọ ámá ndị dị na ya (27-37)

      • Ọnụ ụlọ dị iche iche a rụrụ maka ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ (38-46)

      • Ebe ịchụàjà (47)

    • Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ (48, 49)

  • 41

    • Ebe nsọ dị n’ụlọ nsọ (1-4)

    • Ahụ́ ụlọ nsọ na ọnụ ụlọ ndị dị n’akụkụ ya (5-11)

    • Ụlọ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ (12)

    • A tụrụ ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ atụ̀ (13-15a)

    • Ọnụ ụlọ dị n’ime ebe nsọ (15b-26)

  • 42

    • Ọnụ ụlọ ndị a na-anọ eri ihe (1-14)

    • A tụrụ akụkụ anọ nke ụlọ nsọ (15-20)

  • 43

    • Ebube Jehova juru n’ụlọ nsọ (1-12)

    • Ebe ịchụàjà (13-27)

  • 44

    • Ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-emechi emechi mgbe niile (1-3)

    • Ntụziaka gbasara ndị mba ọzọ (4-9)

    • Ntụziaka gbasara ndị Livaị na ndị nchụàjà (10-31)

  • 45

    • Ala dị nsọ na ala nke obodo (1-6)

    • Ala onyeisi ga-eketa (7, 8)

    • Ndị isi ga na-akwụwa aka ọtọ (9-12)

    • Onyinye ndị obodo na onyeisi ga-enye (13-25)

  • 46

    • Ihe ndị a ga na-eji achụ ụdị àjà dị iche iche (1-15)

    • Onye kwesịrị iketa ala onyeisi (16-18)

    • Ebe ndị a ga-anọ na-esi anụ ndị e ji chụọ àjà (19-24)

  • 47

    • Mmiri si n’ụlọ nsọ sọrọ na-aga (1-12)

      • Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-eto (2-5)

      • E mere ka Osimiri Nnu dị mma (8-10)

      • A gaghị eme ka ebe dị apịtị apịtị dị mma (11)

      • Osisi ndị na-amị mkpụrụ a na-ata ata, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa (12)

    • Ebe ókè dịgasị n’ala ndị Izrel (13-23)

  • 48

    • Ebe e kenyere ebo ọ bụla ala n’Izrel (1-29)

    • Ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ dị n’obodo (30-35)

      • Obodo aha ya bụ “Jehova Nọ Ebe Ahụ” (35)