Daniel 9:1-27

  • Daniel kpere ekpere kwupụta mmehie ha (1-19)

    • Jeruselem ga-atọgbọ chakoo afọ 70 (2)

  • Gebriel bịakwutere Daniel (20-23)

  • E buru amụma banyere izu 70 (24-27)

    • Mezaya ga-abịa ma izu 69 gachaa (25)

    • A ga-egbu Mezaya (26)

    • A ga-ebibi obodo ahụ na ebe nsọ (26)

9  N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Darayọs+ nwa Ahazuirọs onye Midia, onye e mere eze ka ọ chịwa n’alaeze ndị Kaldia,+  n’afọ nke mbụ n’ọchịchị ya, mụnwa, bụ́ Daniel, si n’akwụkwọ dị iche iche* ghọta na Jeruselem ga-atọgbọrọ chakoo+ afọ iri asaa,+ otú Jehova gwara Jeremaya onye amụma.  N’ihi ya, m chere ihu n’ebe Jehova bụ́ ezi Chineke nọ, kpee ekpere ma rịọsie ya arịrịọ ike. M bukwara ọnụ+ ma yiri ákwà iru uju, wụọkwa onwe m ntụ.  M kpere ekpere ma kwupụtara Jehova bụ́ Chineke m mmehie m. M sịrị ya: “Jehova bụ́ ezi Chineke, Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya+ gbara, onye na-egosikwa ha na ọ hụrụ ha n’anya,+  anyị emehiela, mee ihe ọjọọ, meekwa ajọ omume ma nupụrụ gị isi.+ Anyị ahapụla iwu gị na ihe ndị i kpebiri.  Anyị egeghị ndị ohu gị bụ́ ndị amụma ntị,+ ndị gwara ndị eze anyị, ndị isi anyị, nna nna anyị hà, na ndị obodo anyị niile okwu n’aha gị.  Jehova, ọ bụ gị bụ onye ezi omume, ma ọ bụ anyịnwa ka ihere na-eme, otú ọ na-eme anyị taa. Ihere na-eme ndị Juda, ndị si na Jeruselem, nakwa ndị Izrel niile, ma ndị bi n’ebe dị nso ma ndị bi n’ebe dị anya. Ihere na-eme ha n’ebe niile ị chụsasịrị ha maka na ha nupụụrụ gị isi.+  “Jehova, ihere na-eme anyị, na-emekwa ndị eze anyị, ndị isi anyị, nna nna anyị hà, maka na anyị mehiere gị.  Jehova Chineke anyị na-emere anyị ebere ma na-agbaghara anyị,+ ma anyị enupụrụla ya isi.+ 10  Anyị erubeghị isi n’ihe Jehova Chineke anyị kwuru. Anyị edebeghị iwu ya ndị o si n’aka ndị ohu ya bụ́ ndị amụma nye anyị.+ 11  Ndị Izrel niile emebiela Iwu gị. Ha ahapụla gị ma ghara ime ihe i kwuru. Ọ bụ ya mere i ji mee ka iyi a ṅụrụ na a ga-abụ anyị ọnụ otú e dere ya n’iwu Mosis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ maka na anyị mehiere gị. 12  O mezuru ihe o kwuru ga-eme anyị+ na ndị eze anyị bụ́ ndị chịrị anyị.* O mere ka nnukwu ọdachi dakwasị anyị. N’ụwa* niile, e nwebeghị ebe e mere ụdị ihe e mere na Jeruselem.+ 13  Ọdachi a niile adakwasịla anyị otú e dere ya n’iwu Mosis.+ Ma anyị arịọbeghị gị, Jehova Chineke anyị, ka i meere anyị amara,* ebe ọ bụ na anyị ahapụbeghị ajọ omume anyị,+ anyị aghọtabeghịkwa eziokwu gị. 14  “Ebe ọ bụ na Jehova mụ anya, o mere ka ọdachi dakwasị anyị, n’ihi na Jehova Chineke anyị bụ onye ezi omume n’ihe niile o merela, ma anyịnwa erubereghị ya isi.+ 15  “Ugbu a, Jehova Chineke anyị, Onye ji aka ya dị ike kpọpụta ndị ya n’Ijipt+ ma meere onwe ya aha ruo taa,+ anyị emehiela, meekwa ihe ọjọọ. 16  Jehova, ebe ọ bụ na ị na-eme ezi omume mgbe niile,+ biko, ka oké iwe ị na-ewesa obodo gị bụ́ Jeruselem, bụ́ ugwu nsọ gị, dajụọ, n’ihi na mmehie anyị na ihe ọjọọ nna nna anyị hà mere emeela ka ndị niile gbara anyị gburugburu jiri Jeruselem na ndị gị mere ihe ọchị.+ 17  Ugbu a, Chineke anyị, biko, nụrụ ekpere ohu gị na arịrịọ ya. Jehova, n’ihi aha gị, cheta ụlọ nsọ gị*+ nke tọgbọ chakoo.+ 18  Chineke m, biko, gee m ntị ma nụrụ ihe m na-ekwu. Meghee anya gị hụrụ otú obodo anyị a kpọkwasịrị aha gị si tọgbọrọ chakoo. Anyị na-arịọ gị arịrịọ a maka na ị na-eme ebere nke ukwuu, ọ bụghị maka na anyị bụ ndị ezi omume.+ 19  Jehova, biko, gee anyị ntị. Jehova, biko, gbaghara anyị.+ Jehova, biko, ṅaa anyị ntị ma mee ihe. Chineke m, egbula oge n’ihi aha gị, n’ihi na a kpọkwasịrị obodo gị na ndị gị aha gị.”+ 20  Mgbe m ka kpụ okwu a n’ọnụ ma na-ekpe ekpere ma na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị obodo m Izrel ma na-arịọ Jehova Chineke m arịrịọ ka o mee amara ma cheta ugwu nsọ ya,+ 21  mgbe ahụ m ka na-ekpe ekpere a, otu onye bịakwutere m. Ọ bụ Gebriel,+ onye ahụ m hụburu n’ọhụụ.+ Ọ bịakwutere m mgbe ike gwụcharala m, n’ihe dị ka n’oge e ji achụ àjà ná mgbede. 22  O wee mee ka m ghọta ihe ga-eme. Ọ sịrị m: “Daniel, ugbu a abịala m ime ka ị mata ihe niile ma ghọta ha. 23  Mgbe ị malitere ịrịọ arịrịọ, e ziri m ozi m ga-ezi gị. Abịala m ịgwa gị banyere ya n’ihi na ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.*+ N’ihi ya, chebara ozi a echiche, ghọtakwa ọhụụ ị hụrụ. 24  “Chineke ekpebiela na ọ bụ izu iri asaa* ka ndị gị nakwa obodo nsọ unu ga-anọ,+ ka e wee mee ka mmebi iwu kwụsị, ka e wee mee ka mmehie kwụsị,+ ka e wee gbaghara mmehie,+ ka e wee mee ka ezi omume dịrị ruo mgbe ebighị ebi,+ ka e wee kaa ọhụụ na amụma* akara,+ nakwa ka e wee tee Ebe Nsọ Kacha Ebe Nsọ* mmanụ. 25  Mara ma ghọta na malite mgbe e kwuru ka e mee ka Jeruselem dịghachi otú ọ dịbu nakwa ka a rụghachi ya+ ruo mgbe Mezaya*+ bụ́ Onye Ndú+ ga-abịa, a ga-enwe izu asaa, nweekwa izu iri isii na abụọ.+ A ga-eme ka Jeruselem dịghaghị otú ọ dịbu, a ga-arụghachikwa ya, ya enwee ámá. A ga-egwukwa olulu gburugburu ya. Ma ihe ga-esi ike n’oge ahụ. 26  “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gachara, a ga-egbu Mezaya,+ ya agbara aka.+ “Ndị agha nke onyeisi na-abịanụ ga-ebibi obodo ahụ nakwa ebe nsọ ahụ.+ A ga-ebibi ya ka* à ga-asị na ọ bụ idei mmiri bibiri ya. Ma a ga na-alụ agha ruo n’ọgwụgwụ. Ihe e kpebiri bụ mbibi.+ 27  “Ọ* ga-eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dịruo otu izu maka ọtụtụ ndị. N’ọkara izu ahụ, ọ ga-eme ka a kwụsị ịchụ àjà na inye onyinye.+ “Onye na-ebibi ihe ga-anọ na nku nke ihe arụ.+ A ga-emekwa onye ahụ nke tọgbọ chakoo ihe e kpebiri ruo mgbe e kpochapụrụ ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Akwụkwọ Nsọ.
Na Hibru, “ndị ikpe anyị bụ́ ndị kpere anyị ikpe.”
Na Hibru, “N’okpuru eluigwe.”
Ma ọ bụ “ka obi gị jụrụ.”
Na Hibru, “ka ihu gị nwuoro ebe nsọ gị ìhè.”
Ma ọ bụ “e ji gị kpọrọ ihe nke ukwuu.”
N’ebe a, otu izu bụ afọ asaa.
Ma ọ bụ “Ebe Kacha Nsọ.”
Na Hibru, “onye amụma.”
Ma ọ bụ “Onye E Tere Mmanụ.”
Na Hibru, “Ọgwụgwụ ya ga-adị ka.”
O nwere ike ịbụ Mezaya ka a na-ekwu.