Ndị Ikpe 5:1-31

  • Abụ mmeri Debora na Berak bụrụ (1-31)

    • Kpakpando lụsoro Sisera agha (20)

    • Iyi Kaịshọn bufuru ndị iro (21)

    • Ndị hụrụ Jehova n’anya na-acha ka anyanwụ (31)

5  N’ụbọchị ahụ, Debora+ na Berak+ nwa Abinoam bụrụ abụ a:+   “N’ihi ntutu isi a hapụrụ ka ọ ghasasịa* n’Izrel,N’ihi ndị wepụtara onwe ha,+Toonụ Jehova!   Geenụ ntị, unu ndị eze! Ṅaanụ ntị, unu ndị na-achị achị! M ga-abụku Jehova abụ. M ga-abụku Jehova, bụ́ Chineke Izrel,+ abụ otuto.+   Jehova, mgbe i si na Sia pụta,+Mgbe i si n’ala Ịdọm zọrọ ije pụta,Ala mara jijiji, mmiri sikwa n’eluigwe zoo. Mmiri si n’ígwé ojii zosie ike.   Ugwu gbazere* n’ihu Jehova.+ Saịnaị gbazedịrị n’ihu Jehova,+ bụ́ Chineke Izrel.+   N’oge Shamga+ nwa Enat,N’oge Jeel,+ e nweghị ndị na-aga n’okporo ụzọ. Ndị njem nọ na-aga n’ụzọ ọhịa.   Ndị bi n’obodo nta ndị dị n’Izrel anọghịzi. Ha anọghịzi ruo mgbe mụnwa, bụ́ Debora,+ biliri,Ruo mgbe m biliri ka nne n’Izrel.+   Ha họọrọ chi ọhụrụ dị iche iche.+ Agha wee daa n’ọnụ ụzọ ámá obodo dị iche iche.+ A hụghị onye ji ọta ma ọ bụ ubeN’ime puku ụmụ nwoke iri anọ (40,000) n’Izrel.   Obi m dịnyeere ndị ọchịagha Izrel,+Ndị wepụtara onwe ha n’ime ndị Izrel.+ Toonụ Jehova! 10  Unu ndị na-agba jakị ndị na-acha anwụ anwụ,Unu ndị na-anọ ọdụ n’ọmarịcha kapet,Unu ndị na-eje ije n’okporo ụzọ,Chebaranụ ihe a echiche. 11  A nụrụ olu ndị na-esepụtara anụmanụ mmiri n’ebe ndị a na-enye anụmanụ mmiri. Ha nọ n’ebe ndị ahụ na-akọ gbasara ihe ọma dị iche iche Jehova mere,Ihe ọma dị iche iche ndị ya, bụ́ ndị bi n’obodo nta ndị dị n’Izrel, mere. Ndị Jehova wee gaa n’ọnụ ụzọ ámá obodo dị iche iche. 12  Teta, Debora,+ teta! Teta, teta, bụọ abụ!+ Berak,+ bilie! Duru ndị ị dọtara n’agha laa, gị nwa Abinoam! 13  Ndị fọdụrụ wee gbadakwuru ndị a ma ama. Ndị Jehova gbadakwutere m ka ha lụso ndị dike agha. 14  Ọ bụ n’Ifrem ka ha si, bụ́ ndị nọ na ndagwurugwu. Ha na-eso gị, Benjamin, n’ime ndị gị. Ndị ọchịagha si na Mekia+ gbadaa,Ndị ji mkpara nke ndị na-ahọrọ ndị ga-abụ ndị agha* sikwa na Zebulọn. 15  Ndị bụ́ ndị isi n’Ịsaka sooro Debora. Otú Ịsaka mere ka Berak+ mekwara. E dunyere ya ka o jiri ụkwụ gaa na ndagwurugwu.+ Ndị bi n’ógbè dị iche iche nke Ruben nwere obi abụọ. 16  Gịnị mere i ji nọrọ ọdụ ka ịnyịnya nke bu ibu abụọ e bukwasịrị ya,Na-ege ntị ka ha na-egburu ìgwè atụrụ ha+ ọjà? Ndị bi n’ógbè dị iche iche nke Ruben nwere obi abụọ. 17  Gilied nọdụsiri ike n’ofe Osimiri Jọdan.+ Gịnịkwa mere Dan ji nọrọ n’ebe ụgbọ mmiri ya dị?+ Asha nọ nkịtị n’ụsọ oké osimiri. Ọ nọdụsiri ike n’ọdụ ụgbọ mmiri ya.+ 18  Ndị Zebulọn mere ihe gaara ata isi ha. Naftalaị mekwara otú ahụ,+ n’ugwu dị iche iche.+ 19  Ndị eze bịara, ha lụrụ agha. Ndị eze Kenan wee lụọ agha+Na Teanak, n’akụkụ mmiri Megido.+ E nweghị ọlaọcha ọ bụla ha kwatara.+ 20  Kpakpando si n’eluigwe lụọ agha. Ha si n’ụzọ ha lụso Sisera agha. 21  Iyi Kaịshọn buuru ha bufuo,+Iyi oge ochie, iyi Kaịshọn. Mkpụrụ obi* m, ị zọdara ndị dị ike. 22  Ụkwụ ịnyịnya wee na-adasi ike n’alaKa ịnyịnya agha ya na-awụ oké ọsọ.+ 23  Mmụọ ozi Jehova kwuru, sị, ‘Bụọnụ Mirọz ọnụ,Bụọnụ ndị bi na ya ọnụ,N’ihi na ha abịaghị nyere Jehova aka. Ha esoghị ndị dike nyere Jehova aka.’ 24  Jeel+ nwunye Hiba+ onye KenaịtBụ onye a gọziri agọzi karịa ụmụ nwaanyị niile. Ọ bụ ya kacha bụrụ onye a gọziri agọzi n’ime ụmụ nwaanyị niile bi n’ụlọikwuu. 25  Sisera rịọrọ mmiri, ya enye ya mmiri ara ehi. O ji ọmarịcha efere nye ya mmiri ara ehi rọrọ arọ.+ 26  Ọ matịrị aka were mkpọ́ e ji ejide ụlọikwuu,Jiri aka nri ya were hama ndị ọrụ. O wee kụọ ya Sisera, kụpuo ya isi. O wee kụrie akụkụ ntị ya ma kpọpuo ya.+ 27  N’agbata ụkwụ ya abụọ ka ọ dara. O ruru ala ma tọgbọrọ. N’agbata ụkwụ ya abụọ ka ọ dara, daruo ala. Ọ bụ n’ebe ahụ ọ dara ka ọ tọgbọ nwụọ. 28  Otu nwaanyị si na windo lepụ anya. Nne Sisera si na mpio ụlọ na-elepụ anya, sị,‘Gịnị mere ụgbọ ịnyịnya agha ya ji na-egbu oge ịlọta? Gịnị mere na anụbeghị m ụda ụkwụ ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha ya?’+ 29  Ndị kacha mara ihe n’ụmụ nwaanyị ya a ma ama na-aza ya;Yanwa na-agwakwa onwe ya, sị, 30  ‘Ọ ga-abụ na ha na-eke ihe ndị ha kwatara. Onye agha ọ bụla ga-eketa otu nwa agbọghọ,* ụmụ agbọghọ* abụọ,Sisera ga-eketa ákwà e sijiri esiji ha kwatara, ákwà e sijiri esiji ha kwatara,A ga-eji otu uwe a kpara ihe, otu ákwà e sijiri esiji, uwe abụọ a kpara iheChọọ olu ndị kwatara ihe mma.’ 31  Jehova, ka e si otú a laa ndị iro gị niile n’iyi,+Ma ka ndị hụrụ gị n’anya dị ka anyanwụ nke na-achasi ike.” Ala ahụ wee zuru ike* ruo afọ iri anọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị agha hapụrụ ntutu isi ha ka ọ ghasasịa.”
O nwere ike ịbụ, “mara jijiji.”
O nwere ike ịbụ, “Ndị ji ihe odeakwụkwọ ji ede ihe.”
Na Hibru, “akpa nwa.”
Na Hibru, “akpa nwa.”
Ma ọ bụ “Udo wee dịrị n’ala ahụ.”