Maịka 7:1-20

  • Ọtụtụ ihe ọjọọ ndị Izrel mere (1-6)

    • Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya (6)

  • “M ga-echere Chineke” (7)

  • Chineke kpepụtara ndị ya (8-13)

  • Maịka rịọrọ Chineke arịrịọ, tookwa ya (14-20)

    • Ihe Jehova zara Maịka (15-17)

    • ‘Olee Chi dị ka Jehova?’ (18)

7  Nke m agwụla. Adị m ka onyeGhọrọ mkpụrụ osisi n’oge ọkọchịMa tụtụkọta mkpụrụ vaịn fọrọnụ mgbe e wechara ihe ubi,Ma ọ hụghị ụyọkọ mkpụrụ vaịn ọ ga-aracha. Ọ hụghịkwa mkpụrụ fig mbụ na-agụ ya agụụ.*  2  Ezigbo mmadụ anọghịzi n’ụwa. O nweghịkwa mmadụ ọ bụla na-eme ihe dị mma.+ Ha niile na-ezo ka ha gbuo mmadụ.*+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.  3  Aka ha ma nnọọ otú e si eme ihe ọjọọ.+ Onyeisi na-ekwu ihe a ga-enye ya. Onye na-ekpe ikpe na-ekwu ka a kwụọ ya ụgwọ.+ Onye a ma ama na-ekwukwa ihe ọ chọrọ ka e nye ya.*+ Ha na-agbakọkwa aka eme ya.  4  Onye kacha mma n’ime ha yiri ogwu. Onye kacha ha eme ihe dị mma dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige. Ụbọchị ndị nche gị kwuru gbasara ya, nke bụ́ ụbọchị a ga-ekpe gị ikpe, ga-eru.+ Ha agaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme.+  5  Unu atụkwasịla enyi unu obi. Unu atụkwasịkwala enyi ọma unu obi.+ Agwala onye dina gị n’akụkụ ihe ị na-ezo ezo,  6  N’ihi na nwa nwoke na-eleda nna ya anya. Nwa nwaanyị na-emegide nne ya.+ Nwunye nwa na-emegidekwa nne di ya.+ Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+  7  Ma mụnwa ga na-ele anya Jehova.+ M ga-echere* Chineke, onye nzọpụta m.+ Chineke m ga-anụ olu m.+  8  Onye iro m, aṅụrịla ọṅụ n’ihi ihe mere m. Ọ bụ eziokwu na adaala m, m ga-ebili. Ọ bụ eziokwu na m bi n’ọchịchịrị, Jehova ga-abụrụ m ìhè.  9  M ga-edi iwe Jehova na-ewesa mN’ihi na emehiela m ya.+ M ga na-edi ya ruo mgbe o kpechitere ọnụ m, kpeekwara m ikpe ziri ezi. Ọ ga-akpọrọ m bịa n’ìhè. M ga-elekwasị ezi omume ya anya. 10  Onye iro m ga-ahụ ya. Ihere ga-emegbukwa onye jụrụ m, sị: “Olee ebe Jehova Chineke gị nọ?”+ M ga na-ele onye iro m anya. A ga na-azọ ya ụkwụ otú e si azọ apịtị dị n’okporo ámá. 11  Ọ ga-abụ ụbọchị a ga-eji nkume rụọ mgbidi gị. N’ụbọchị ahụ, ị ga-enwekwu ala. 12  N’ụbọchị ahụ, ha ga-esiN’Asiria na obodo ndị dị n’Ijipt bịakwute gị. Ha ga-esi n’Ijipt ruo n’Osimiri Yufretis. Ha ga-esi n’otu oké osimiri ruo n’oké osimiri ọzọ, sikwa n’otu ugwu ruo n’ugwu ọzọ.+ 13  Ala a ga-aghọ ebe tọgbọ nkịtị n’ihi ndị bi na ya,N’ihi ihe ha metara.* 14  Jiri mkpara gị zụọ ndị gị, bụ́ ìgwè atụrụ i ketara,+Ndị naanị ha bi n’oké ọhịa, n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche. Ka ha taa ahịhịa n’ala Beshan na Gilied+ otú ha tara n’oge ochie. 15  “M ga-egosi unu ihe ndị dị ebube+Otú m gosiri unu n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta. 16  Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere emee ha n’agbanyeghị na ha dị ike.+ Ha ga-ekpuchi aka n’ọnụ ha. Ntị ga-echikwa ha. 17  Ha ga-aracha ájá dị ka agwọ.+ Ha ga-esi ná mgbidi ha ndị siri ike mara jijiji pụta dị ka anụ na-arị arị. Ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova bụ́ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa ya* egwu.”+ 18  Olee Chi dị ka gị,Onye na-agbaghara mmehie+ nke ndị fọdụrụ n’Izrel bụ́ ndị ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,N’ihi na ịhụnanya* na-atọ ya ụtọ.+ 19  Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ.+ Ọ ga-emeri mmehie* anyị. Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile n’ala ala oké osimiri.+ 20  Ị ga-egosi Jekọb na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi,Gosikwa Ebreham ịhụnanya,*Otú ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi n’oge ochie.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-agụ mkpụrụ obi ya agụụ.”
Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
Ma ọ bụ “ihe mkpụrụ obi ya chọrọ.”
Ma ọ bụ “M ga-enwe ndidi chere.”
Na Hibru, “N’ihi mkpụrụ ihe ha na-eme mịtara.”
Na Hibru, “gị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-azọda mmehie.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”