Levitikọs 8:1-36

  • A họpụtara Erọn na ụmụ ya ka ha bụrụ ndị nchụàjà (1-36)

8  Jehova wee gwa Mosis, sị:  “Kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke,+ chịrị uwe ha,+ were mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ,+ kpụrụ oké ehi e ji achụ àjà mmehie na ebule abụọ, burukwa nkata nke achịcha na-ekoghị eko dị na ya+  ma kpọkọta nzukọ Izrel niile ka ha gbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.”  Mosis mere nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Nzukọ ahụ wee gbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.  Mosis gwara nzukọ ahụ, sị: “Ọ bụ ihe a ka Jehova nyere anyị iwu ka anyị mee.”  Mosis wee kpọta Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nso ma gwa ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́.*+  O yiweziri Erọn uwe mwụda,+ kee ya ákwà a na-eke n’úkwù,+ yiwe ya uwe na-enweghị aka,+ yiwekwa ya efọd+ ma jiri eriri*+ efọd ahụ kegide efọd ahụ n’ahụ́ ya.  O kegidere ya akpa a na-anya n’obi+ ma tinye Yurim na Tọmịm*+ n’ime akpa ahụ.  O keziri ya ákwà isi+ n’isi ma tinye ihe dị mbadamba na-egbuke egbuke e ji ọlaedo mee n’ihu ákwà isi ahụ, ya bụ, ihe àmà dị nsọ.*+ Mosis mere nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu. 10  Mosis wee were mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ tee ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya+ ma mee ka ha dị nsọ. 11  O fesaziri mmanụ ahụ ugboro asaa n’ebe ịchụàjà ma tee ebe ịchụàjà na arịa ya niile na nnukwu ite ahụ na ihe e ji adọkwasị ya mmanụ ka ha wee dị nsọ. 12  N’ikpeazụ, ọ wụsatụrụ mmanụ ahụ e ji ete mmadụ mmanụ n’isi Erọn ma tee ya mmanụ ka ọ dị nsọ.+ 13  Mosis kpọtaziri ụmụ Erọn ndị nwoke yiwe ha uwe mwụda ma kee ha ákwà n’úkwù, keekwa ha ákwà n’isi,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 14  O wee kpụta oké ehi e ji achụ àjà mmehie, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie.+ 15  Mosis gburu ya, jiri mkpịsị aka ya rụrụ ọbara+ ya tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ n’akụkụ ya niile ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ma, ọ wụsara ọbara fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà ahụ ka o mee ka ọ dị nsọ, ka e wee na-ekpuchi mmehie n’elu ya. 16  Mosis wee were abụba niile dị n’elu eriri afọ oké ehi ahụ, abụba kpuchiri imeju ya, nakwa akụrụ ya abụọ na abụba ha, suo ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.+ 17  E wee kpọọ ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ ọkụ, ya bụ, akpụkpọ ya, anụ ya, na nsị ya. A kpọrọ ha ọkụ n’ebe dị anya n’ebe ha mara ụlọikwuu,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 18  Ọ kpụtaziri ebule ahụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 19  Mosis wee gbuo ya ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 20  E gburisịrị ebule ahụ. Mosis wee suo isi ya, akụkụ ya dị iche iche, na abụba* ya ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 21  E ji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Mosis wee suo ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà e suru ọkụ ka o sie ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova, otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 22  Ọ kpụtara ebule nke abụọ, bụ́ ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà.+ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke wee bikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 23  Mosis gburu ya, weretụ ọbara ya tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya. 24  Mosis kpọtaziri ụmụ Erọn ndị nwoke, tesatụ ha ọbara ahụ n’ọnụ ọnụ ntị aka nri ha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ha nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ha. Ma, Mosis fesara ọbara nke fọrọ afọ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 25  O wee were abụba ya, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba niile dị n’elu eriri afọ ya, na abụba kpuchiri imeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na ụkwụ aka nri ya.+ 26  O si na nkata achịcha na-ekoghị eko dị na ya, nke dị n’ihu Jehova, were otu ogbe achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri+ na otu ogbe achịcha dị okirikiri a gwara mmanụ+ na otu achịcha dị fere fere. Ọ tụkwasịrị ha n’elu abụba ndị ahụ na ụkwụ aka nri anụ ahụ. 27  O wee chịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke ma malite ifegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. 28  Mosis wee chịrị ha n’aka ha ma suo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà ahụ e suru ọkụ. Ha bụ àjà e ji ahọpụta ndị nchụàjà nke na-esi ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova. 29  Mosis wee were okpuru afọ* anụ ahụ, fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ Ọ bụ òkè Mosis nke si n’ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+ 30  Mosis wee weretụ mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ na ọbara dị n’ebe ịchụàjà fesa n’ahụ́ Erọn nakwa n’uwe ya, fesakwa n’ahụ́ ụmụ ya ndị nwoke nakwa n’uwe ụmụ ya ndị nwoke. O si otú a mee ka Erọn na uwe ya dị nsọ, meekwa ka ụmụ ya ndị nwoke+ na uwe ha dị nsọ.+ 31  Mosis gwaziri Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị: “Sienụ+ anụ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Unu ga-anọkwa ebe ahụ rie ya na achịcha ndị dị na nkata e ji ahọpụta ndị nchụàjà, otú e nyere m n’iwu, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eri ya.’+ 32  Unu ga-akpọ ihe fọrọ n’anụ ahụ nakwa n’achịcha ahụ ọkụ.+ 33  Unu agaghị esi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ ruo ụbọchị asaa, ruo mgbe ụbọchị ole e ji ahọpụta unu zuru, n’ihi na ọ bụ ụbọchị asaa ka a ga-eji mee unu ndị nchụàjà.+ 34  Jehova nyere iwu ka anyị mee ihe a anyị mere taa ka e wee kpuchiere unu mmehie.+ 35  Unu ga-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ehihie na abalị ruo ụbọchị asaa.+ Unu ga na-emekwa ihe Jehova nyere unu n’iwu+ ka unu wee ghara ịnwụ; n’ihi na ọ bụ ihe e nyere m n’iwu.” 36  Erọn na ụmụ ya ndị nwoke wee mee ihe niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye n’iwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “jiri mmiri saa ha ahụ́.”
Ma ọ bụ “ájị̀.”
Ma ọ bụ “ihe àmà na-egosi na e nyefeela Erọn n’aka Chineke; okpu dị nsọ.”
Ma ọ bụ “abụba ndị dị n’akụrụ ya.”
Ma ọ bụ “ka ísì ya mee ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”