Levitikọs 10:1-20

  • Jehova zitere ọkụ, ya eregbuo Nedab na Abaịhu (1-7)

  • Iwu e nyere ndị nchụàjà gbasara ịṅụ mmanya na iri ihe (8-20)

10  Mgbe e mechara, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu+ weere ihe ha ji amụ insens, gụnye ọkụ na ha ma tinye insens*+ na ha. Ha wee malite ịchụ àjà* iwu na-akwadoghị+ n’ihu Jehova, nke ọ na-enyeghị ha iwu ka ha chụọ. 2  Jehova wee zite ọkụ, ya eregbuo ha,+ ha anwụọ n’ihu Jehova.+ 3  Mosis wee sị Erọn: “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị na-abịa m nso+ kwesịrị icheta na m dị nsọ. A ga-enyekwa m otuto n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị. 4  Mosis kpọziri Mishel na Elzefan, bụ́ ụmụ Ọziel,+ nwanne nna Erọn, sị ha: “Bịanụ ebe a. Sinụ n’ihu ebe nsọ buru ozu ụmụnne unu pụọ n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.” 5  Ha wee bịa buru ozu ha mgbe ha ka yi uwe mwụda ha ma bupụ ha n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, otú Mosis gwara ha. 6  Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ndị nke ọzọ, bụ́ Elieza na Ịtama, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi, unu adọwakwala uwe unu,+ ka unu ghara ịnwụ, ka Chineke gharakwa iwesa nzukọ a niile iwe. Ụmụnne unu, bụ́ ezinụlọ Izrel niile, ga-ebere ndị a Jehova ji ọkụ gbuo ákwá. 7  Unu esila n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ, ma ọ́ bụghị ya unu ga-anwụ, n’ihi na Jehova tere unu mmanụ.”+ Ha wee mee ihe Mosis kwuru. 8  Jehova gwaziri Erọn, sị: 9  “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọzọ na-aba n’anya, gị na ụmụ gị ndị nwoke, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute,+ ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ iwu na-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. 10  Ọ ga-eme ka a mata ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+ 11  meekwa ka a kụziere ndị Izrel iwu niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha.”+ 12  Mosis wee gwa Erọn na Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị nwoke fọrọnụ, sị: “Werenụ ihe fọrọ n’àjà ọka e suru ọkụ a chụụrụ Jehova mee achịcha na-ekoghị eko, nọrọkwanụ n’ebe dị nso n’ebe ịchụàjà rie ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 13  Unu ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya+ maka na ọ bụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, n’ihi na ọ bụ ihe e nyere m n’iwu. 14  Unu ga-anọkwa n’ebe dị ọcha rie okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ n’ihi na e nyela unu ihe ndị a ka ha bụrụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà udo ndị Izrel na-eweta. 15  Ha ga na-eweta ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ na okpuru afọ* anụ e ji achụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa abụba nke àjà e suru ọkụ, ka e wee fegharịa àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụ òkè unu na ụmụ unu ga na-eketa mgbe niile,+ otú Jehova nyere n’iwu.” 16  Mosis chọsiri anụ fọrọ n’ewu ahụ e ji chụọ àjà mmehie+ ike. O wee chọpụta na e suola ya ọkụ. O wee wesa Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị fọrọnụ, ezigbo iwe. Ọ sịrị: 17  “Gịnị mere na unu erighị anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie n’ebe dị nsọ+ ebe ọ bụ ihe kacha nsọ, Chineke enyekwala ya unu ka unu wee na-aza ajụjụ maka mmehie nzukọ a ma na-ekpuchiri ha mmehie n’ihu Jehova? 18  Lee, e webataghị ọbara ya n’ime ebe nsọ. Unu kwesịrị iri ya n’ebe dị nsọ,+ otú e nyere m n’iwu.” 19  Erọn zara Mosis, sị: “Lee, taa ha chụụrụ Jehova àjà mmehie ha na àjà ha a na-esu ọkụ.+ N’agbanyeghị ya, ihe ndị a mere m. A sị na m riri anụ àjà mmehie ahụ taa, ọ̀ gaara adị Jehova mma?” 20  Mgbe Mosis nụrụ ihe o kwuru, ọ dị ya mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “iche ọkụ.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”