Joshụa 14:1-15
14 Ihe a bụ ala ndị Izrel ketara n’ala Kenan. Ọ bụ Elieza onye nchụàjà na Joshụa nwa Nọn na ndị isi ọnụmara ọ bụla n’ebo dị iche iche n’Izrel keere ha ya.+
2 E fere nza keere ebo itoolu na ọkara ala ahụ,+ otú Jehova gwara Mosis ka e mee.+
3 Mosis ebula ụzọ kenye ebo abụọ na ọkara ala n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ Ma, o kenyeghị ndị Livaị ala ọ bụla.+
4 E weere na ụmụ Josef, bụ́ Manase na Ifrem,+ bụ ebo abụọ.+ E kenyeghịkwa ndị Livaị ala n’ala ahụ, ma e wezụga obodo ndị+ ha ga-ebi na ala anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa nakwa ebe ha ga na-akwasa ngwongwo ha.+
5 Ndị Izrel kere ala ahụ otú Jehova gwara Mosis ka e si kee ya.
6 Mgbe ha kechara ala ahụ, ụfọdụ ụmụ nwoke ndị Juda bịakwutere Joshụa na Gilgal,+ Keleb+ nwa Jefune onye Kinaz asị ya: “Ị manụ ihe Jehova, bụ́ ezi Chineke, gwara+ ohu ya Mosis+ gbasara mụ na gị mgbe anyị nọ Kedesh-bania.+
7 Adị m afọ iri anọ mgbe Mosis ohu Jehova si na Kedesh-bania zipụ m, mụ agaa nyopụta otú ala a dị.+ Mgbe m lọtara, m kọọrọ ya ihe m hụrụ n’ezoghị ọnụ.*+
8 Ụmụnne m mụ na ha so gaa mere ka obi mapụ ndị obodo anyị.* Ma, m ji obi m niile soro Jehova bụ́ Chineke m.+
9 Mosis ṅụrụ iyi n’ụbọchị ahụ, sị: ‘Ọ bụ gị na ụmụ gị ga-eketa ala ahụ ị gara ije na ya, unu ga-ebitekwa ya aka, n’ihi na i ji obi gị niile soro Jehova bụ́ Chineke m.’+
10 Ugbu a, Jehova edowela m ndụ+ otú o kwere ná nkwa.+ O meela afọ iri anọ na ise kemgbe Jehova kwere Mosis nkwa a mgbe ndị Izrel jere ije n’ala ịkpa.+ Ma, m ka nọ ndụ ruo taa. Adị m afọ iri asatọ na ise.
11 M ka dị ike taa otú m dị n’ụbọchị Mosis zipụrụ m. Otú ike m hà n’oge ahụ ịga agha na ime ihe ndị ọzọ, ka ọ ka hà ugbu a.
12 N’ihi ya, nye m ebe bụ́ ugwu ugwu Jehova kwere m ná nkwa n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ eziokwu na ndị Anakim+ nọ ebe ahụ nakwa na a rụsiri obodo ndị dị ebe ahụ ike,+ otú ị nụrụ ya n’ụbọchị ahụ, obi siri m ike na* Jehova ga-anọnyere m.+ M ga-achụpụkwa ha n’ala ha,* otú Jehova kwere ná nkwa.”+
13 N’ihi ya, Joshụa gọziri Keleb nwa Jefune ma kenye ya ala Hebrọn.+
14 Ọ bụ ya mere Keleb nwa Jefune, onye Kinaz, ji keta ala Hebrọn ruo taa. O ketara ala a n’ihi na o ji obi ya niile soro Jehova bụ́ Chineke Izrel.+
15 Aha Hebrọn tupu mgbe ahụ bụ Kiriat-aba+ (Aba bụ nnukwu mmadụ n’ime ndị Anakim). A lụghịkwa agha n’obodo ahụ ọzọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “m kọọrọ ya otú ọ dị m n’obi.”
^ Na Hibru, “ka obi anyị gbazee.”
^ Ma ọ bụ “M ga-anapụkwa ha ala ha.”
^ Ma ọ bụ “ikekwe.”