Joshụa 12:1-24
12 Ndị a bụ ndị eze chịrị ala ndị Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, malite na Ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:+
2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn. Ọ chịrị Aroa+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn.+ Ọ bụkwa ya chịrị malite n’etiti ndagwurugwu ahụ ruo na Ndagwurugwu Jabọk. Ọ chịkwara ọkara Gilied. Ndagwurugwu Jabọk bụkwa ókè ala ndị Amọn.
3 Ebe ọzọ ọ chịrị bụ malite n’Araba ruo n’Oké Osimiri Kineret*+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Araba, ya bụ, Oké Osimiri Nnu, n’ebe e si aga Bet-jeshimọt, nakwa n’ebe ndịda nke dị ná mkpọda Pisga.+
4 Ndị Izrel merikwara ebe Ọg+ eze Beshan na-achị. Eze Ọg so ná ndị fọrọ ná ndị Refeyim,+ ndị biri n’Ashtarọt na Edraị.
5 Ọ chịrị obodo ndị dị malite n’ebe Ugwu Hemọn nakwa Saleka nakwa Beshan niile,+ ruo n’ókè ndị Geshọ na ndị Meakat,+ na ọkara Gilied, ruokwa n’ókè ebe Saịhọn eze Heshbọn chịrị.+
6 Mosis ohu Jehova na ndị Izrel meriri ha.+ Mosis ohu Jehova wee nye ebo Ruben na ebo Gad na ọkara ebo Manase ala ha.+
7 Ndị eze chịrị ala Joshụa na ndị Izrel meriri dị ọtụtụ. Ha meriri ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan, malite na Bel-gad+ nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn,+ ruo n’Ugwu Helak,+ nke dị nso na Sia.+ Mgbe ha merichara ha, Joshụa nyere ebo Izrel niile ala ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara. O kenyere ebo nke ọ bụla nke ruuru ya,+
8 ma n’ebe bụ́ ugwu ugwu, ma na Shefila,* ma n’Araba, ma ebe ndị dị ná mkpọda, ma n’ala ịkpa, ma na Negeb.*+ Ala ndị a bụ ala ndị Het, na nke ndị Amọraịt,+ na nke ndị Kenan, na nke ndị Perizaịt, na nke ndị Haịvaịt nakwa nke ndị Jebus.+ Ndị a bụ ndị eze ha meriri:
9 Eze Jeriko,+ otu. Eze E-aị+ nke dị n’akụkụ Betel, otu.
10 Eze Jeruselem, otu. Eze Hebrọn,+ otu.
11 Eze Jamọt, otu. Eze Lekish, otu.
12 Eze Eglọn, otu. Eze Giza,+ otu.
13 Eze Diba,+ otu. Eze Gida, otu.
14 Eze Họma, otu. Eze Erad, otu.
15 Eze Libna,+ otu. Eze Adọlam, otu.
16 Eze Makida,+ otu. Eze Betel,+ otu.
17 Eze Tapua, otu. Eze Hifa, otu.
18 Eze Efek, otu. Eze Lasharọn, otu.
19 Eze Medọn, otu. Eze Hezọ,+ otu.
20 Eze Shimrọn-mirọn, otu. Eze Akshaf, otu.
21 Eze Teanak, otu. Eze Megido, otu.
22 Eze Kidesh, otu. Eze Jọkniam+ dị na Kamel, otu.
23 Eze Dọọ nke dị n’ebe mkpọda Dọọ,+ otu. Eze Goyim nke dị na Gilgal, otu.
24 Eze Teza, otu. Ndị eze ahụ niile dị iri atọ na otu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, ọdọ mmiri Genesaret, ma ọ bụ Oké Osimiri Galili.
^ Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
^ Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”