Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • E debara aha ụmụ nwoke ndị ga-eso aga agha n’akwụkwọ (1-46)

    • Ndị Livaị agaghị eso aga agha (47-51)

    • Otú ndị Izrel ga-esi maa ụlọikwuu n’usoro n’usoro (52-54)

  • 2

    • Ha ga-ama ụlọikwuu n’ìgwè ebo atọ ebo atọ (1-34)

      • Ìgwè nke Juda ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ (3-9)

      • Ìgwè nke Ruben ga-ama ụlọikwuu n’ebe ndịda (10-16)

      • Ndị Livaị ga-ama ụlọikwuu n’etiti (17)

      • Ìgwè nke Ifrem ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọdịda anyanwụ (18-24)

      • Ìgwè nke Dan ga-ama ụlọikwuu n’ebe ugwu (25-31)

      • Ole ụmụ nwoke niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị (32-34)

  • 3

    • Ụmụ Erọn ndị nwoke (1-4)

    • A họọrọ ndị Livaị ka ha na-eje ozi (5-39)

    • Ihe e ji gbara ụmụ nwoke e bu ụzọ mụọ (40-51)

  • 4

    • Ọrụ ụmụ Kohat (1-20)

    • Ọrụ ụmụ Geshọn (21-28)

    • Ọrụ ụmụ Meraraị (29-33)

    • Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ (34-49)

  • 5

    • A ga-akpọpụ onye na-adịghị ọcha iche (1-4)

    • Mmadụ ikwupụta mmehie na ịkwụ ụgwọ ma ikpe ma ya (5-10)

    • Mmiri e ji achọpụta ma nwaanyị ọ̀ gbaala n’èzí (11-31)

  • 6

    • Mmadụ ikwe nkwa na ọ ga-abụ onye Naziraịt (1-21)

    • Otú ndị nchụàjà ga-esi na-agọzi ndị Izrel (22-27)

  • 7

    • Onyinye ndị e wetara mgbe a na-enyefe Chineke ụlọikwuu (1-89)

  • 8

    • Erọn mụnyere ọkụ asaa (1-4)

    • E mere ka ndị Livaị dị ọcha, ha amalite ije ozi (5-22)

    • Afọ ole ndị Livaị na-eje ozi ga-adị (23-26)

  • 9

    • Mgbe ndị na-esoghị mee Ememme Ngabiga ga-eme ya (1-14)

    • Ígwé ojii na ọkụ pụtara n’elu ụlọikwuu (15-23)

  • 10

    • Opi ọlaọcha abụọ (1-10)

    • Ndị Izrel si na Saịnaị pụọ (11-13)

    • Otú ndị Izrel si akwali (14-28)

    • A gwara Hobab ka ọ na-ezi ndị Izrel ụzọ (29-34)

    • Ekpere Mosis na-ekpe ma ha pụwa (35, 36)

  • 11

    • Chineke zitere ọkụ maka na ndị Izrel nọ na-eme mkpesa (1-3)

    • Ndị Izrel bere ákwá ka e nye ha anụ (4-9)

    • Mosis kwuru na ya erughị eru (10-15)

    • Jehova nyere ndị okenye iri asaa mmụọ nsọ (16-25)

    • Eldad na Midad; Joshụa kwochiteere Mosis ekworo (26-30)

    • Chineke zitere nnụnụ kwel; a tara ndị Izrel ahụhụ maka anyaukwu (31-35)

  • 12

    • Miriam na Erọn kwujọrọ Mosis (1-3)

      • Mosis dị umeala n’obi karịa mmadụ niile (3)

    • Jehova gbachiteere Mosis (4-8)

    • Ekpenta pụtara Miriam n’ahụ́ (9-16)

  • 13

    • E zigara mmadụ iri na abụọ ka ha nyopụta otú Kenan dị (1-24)

    • Akụkọ ọjọọ mmadụ iri kọrọ (25-33)

  • 14

    • Ndị Izrel chọrọ ịlaghachi n’Ijipt (1-10)

      • Akụkọ ọma Joshụa na Keleb kọrọ (6-9)

    • Iwe were Jehova; Mosis rịọchiteere ndị Izrel arịrịọ (11-19)

    • Ahụhụ ha ga-ata: Ha ga-agagharị n’ala ikpa afọ iri anọ (20-38)

    • Ndị Amalek meriri ndị Izrel (39-45)

  • 15

    • Iwu ndị na-achị àjà dị iche iche (1-21)

      • Otu iwu ga na-achị nwa afọ na onye mbịarambịa (15, 16)

    • Àjà a na-achụ maka mmehie e mere n’amaghị ụma (22-29)

    • Ahụhụ a ga-ata onye kpachaara anya mehie (30, 31)

    • E gburu onye dara iwu Ụbọchị Izu Ike (32-36)

    • Ndị Izrel ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe ha (37-41)

  • 16

    • Kora, Detan, na Abaịram nupụrụ isi (1-19)

    • Ahụhụ a tara ndị nnupụisi (20-50)

  • 17

    • Mkpara Erọn wara okooko (1-13)

  • 18

    • Ọrụ ndị nchụàjà na ọrụ ndị Livaị (1-7)

    • Òkè a ga na-enye ndị nchụàjà (8-19)

      • Ọgbụgba ndụ ga-adịgide adịgide (19)

    • Ndị Livaị ga na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri, na-enyekwa ya (20-32)

  • 19

    • Ehi na-acha ọbara ọbara na mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha (1-22)

  • 20

    • Miriam nwụrụ na Kedesh (1)

    • Mosis kụrụ mkpara ná nnukwu nkume wee mehie (2-13)

    • Eze Ịdọm ekweghị ka ndị Izrel gafere (14-21)

    • Erọn nwụrụ (22-29)

  • 21

    • E meriri eze na-achị Erad (1-3)

    • Agwọ ọla kọpa (4-9)

    • Ndị Izrel gara Moab gburugburu (10-20)

    • E meriri eze ndị Amọraịt bụ́ Saịhọn (21-30)

    • E meriri eze ndị Amọraịt bụ́ Ọg (31-35)

  • 22

    • Belak kpọrọ Belam ka ọ bụọ ndị Izrel ọnụ (1-21)

    • Jakị Belam kwuru okwu (22-41)

  • 23

    • Ihe mbụ Belam kwuru (1-12)

    • Ihe nke abụọ Belam kwuru (13-30)

  • 24

    • Ihe nke atọ Belam kwuru (1-11)

    • Ihe nke anọ Belam kwuru (12-25)

  • 25

    • Ndị Izrel na ụmụ nwaanyị Moab kwara iko (1-5)

    • Finihas kpara ike (6-18)

  • 26

    • Nke ugboro abụọ a gụrụ ndị Izrel ọnụ n’ebo n’ebo (1-65)

  • 27

    • Ụmụ nwaanyị Zelofehad (1-11)

    • E mere Joshụa onye ndú ga-anọchi Mosis (12-23)

  • 28

    • Otú a ga-esi na-achụ àjà dị iche iche (1-31)

      • Àjà ndị a ga na-achụ kwa ụbọchị (1-8)

      • Ndị a ga na-achụ n’Ụbọchị Izu Ike (9, 10)

      • Àjà ndị a ga na-achụ kwa ọnwa (11-15)

      • Ndị a ga na-achụ n’Ememme Ngabiga (16-25)

      • Ndị a ga na-achụ n’Ememme Izu (26-31)

  • 29

    • Otú a ga-esi na-achụ àjà dị iche iche (1-40)

      • Ụbọchị a ga-afụ opi (1-6)

      • Ụbọchị Ikpuchi Mmehie (7-11)

      • Ememme Ụlọ Ndò (12-38)

  • 30

    • Nkwa nwoke kwere (1, 2)

    • Nkwa nwaanyị ma ọ bụ nwa agbọghọ kwere (3-16)

  • 31

    • Ndị Izrel megwaara ndị Midian (1-12)

      • E gburu Belam (8)

    • E nyere ntụziaka maka ihe ndị a kwatara n’agha (13-54)

  • 32

    • Ndị ga-ebi n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (1-42)

  • 33

    • Otú ndị Izrel si gaa ebe ndị ha gara n’ọzara (1-49)

    • Ntụziaka e nyere gbasara imeri Kenan (50-56)

  • 34

    • Ebe ndị ga-abụ ókè ala Kenan (1-15)

    • A họpụtara ụmụ nwoke ndị ga-ekere ndị Izrel ala (16-29)

  • 35

    • Obodo ndị Livaị (1-8)

    • Obodo mgbaba (9-34)

  • 36

    • Iwu e nyere gbasara ndị ga-alụ ụmụ nwaanyị e kenyere ala nna ha (1-13)