Abụ Solomọn 8:1-14

  • Nwa agbọghọ Shulem (1-4)

    • “A sị nnọọ na ị bụ nwanne m nwoke” (1)

  • Ụmụnne nwoke nwa agbọghọ Shulem (5a)

    • ‘Ònye bụ onye a konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?’

  • Nwa agbọghọ Shulem (5b-7)

    • “Ịhụnanya siri ike ka ọnwụ” (6)

  • Ụmụnne nwoke nwa agbọghọ Shulem (8, 9)

    • “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, . . . ma ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ, . . .” (9)

  • Nwa agbọghọ Shulem (10-12)

    • “Abụ m mgbidi” (10)

  • Onye na-azụ atụrụ (13)

    • ‘Mee ka m nụ olu gị’

  • Nwa agbọghọ Shulem (14)

    • “Gbara ọsọ bịa ka ele”

8  “A sị nnọọ na ị bụ nwanne m nwoke,Onye ṅụrụ ara nne m,M ga-esusu gị ọnụ ma m hụ gị n’èzí,+E nweghịkwa onye ga-ele m anya ọjọọ.   M ga-eduru gị. M ga-akpọbata gị n’ụlọ nne m,+Onye kụziiri m ihe. M ga-enye gị mmanya na-esi ísì ọma ka ị ṅụọNakwa mmiri pomigranet a pịpụtara ọhụrụ.   M ga-atụkwasị isi m n’aka ekpe ya,Ọ ga-ekonyekwa m aka nri ya.+   Ụmụ nwaanyị Jeruselem, m na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyiNa unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+   “Ònye bụ onye a nke si n’ala ịkpa na-abịa,Nke konyere onye ọ hụrụ n’anya aka?” “M kpọtere gị n’okpuru osisi apụl. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime gị mere nne gị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime mere nwaanyị mụrụ gị.   “Kanye m ka akara n’obi gị,Kanye m ka akara n’ogwe aka gị,N’ihi na ịhụnanya siri ike ka ọnwụ,+Ịhụnanya nke siri ezigbo ike na-emekwa ka mmadụ ghara ịhapụ onye ọ hụrụ n’anya otú ili* na-anaghị ahapụ onye o ji. Ụdị ihụnanya a dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa.*+   Mmiri na-ekwo ekwo enweghị ike imenyụ ịhụnanya,+Osimiri enweghịkwa ike ibupụ ya.+ Ọ bụrụ na mmadụ enye akụ̀ niile dị n’ụlọ ya ka e wee hụ ya n’anya,A ga-eleda ya* nnọọ anya.”   “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị.+ Ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyịN’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?”   “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,Anyị ga-eji ọlaọcha chọọ elu ya mma. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ,Anyị ga-eji ibé osisi sida tụbichie ya.” 10  “Abụ m mgbidi,Ara m dịkwa ka ụlọ elu. N’ihi ya, n’anya ya,Abụ m onye obi ruru ala. 11  Solomọn nwere otu ubi vaịn+ na Bel-hemọn. O nyefere ubi vaịn ahụ n’aka ndị ga na-elekọta ya. Onye nke ọ bụla na-eweta otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha maka mkpụrụ ubi ahụ na-amị. 12  Otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ nke gị, Solomọn,Narị abụọ abụrụ nke ndị na-elekọta mkpụrụ ubi vain ahụ na-amị. Ma ubi vaịn nke m bụ naanị nke m.” 13  “Gị onye bi n’ubi,+Ndị enyi gị na-eche ka ha nụ olu gị. Mee ka m nụ ya.”+ 14  “Onye m hụrụ n’anya, mee ngwa ngwa. Gbara ọsọ bịa ka ele+Ma ọ bụ ka oké mgbadaNke nọ n’ugwu ebe ahịhịa na-esi ísì ọma dị.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ akụ̀ ya ka a na-ekwu.