Aịzaya 53:1-12
53 Ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+
Ònyekwa ka Jehova mere ka ọ mara ike* ya?+
2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị.
Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+
Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso.
3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya.+
Ọ ma gbasara ihe mgbu, marakwa ihe ọrịa bụ.
Ọ dị ka à ga-asị na e zoro ihu ya ezo ka anyị ghara ịhụ ya.*
E ledara ya anya. Anyị ejighịkwa ya kpọrọ ihe.+
4 N’eziokwu, o buuru ọrịa anyị niile,+Burukwa ihe na-egbu anyị mgbu.+
Ma anyị weere ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o mesiri ike, na onye o mekpara ahụ́.
5 A mara ya ube+ n’ihi mmehie anyị.+
E chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ihe anyị mejọrọ.+
Ahụhụ a tara ya mere ka anyị nwee udo.+
Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ anyị.+
6 Anyị niile akpafuola ka atụrụ.+
Onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya.
Ma, Jehova emeela ka onye ahụ buru mmehie anyị niile.+
7 E mesiri onye ahụ ike.+ O kwere ka e mekpaa ya ahụ́.+
O kwughịkwa ihe ọ bụla.
A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu.+
Ọ dị ka nne atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị.
O kwughịkwa ihe ọ bụla.+
8 A kpụụrụ ya pụọ mgbe e kpechara ya ikpe mkpegbu.
Ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile gbasara ezinụlọ o si?*
N’ihi na e gburu ya ya agharazie iso ná ndị dị ndụ.+
E tiri ya ihe* n’ihi na ndị m mere ihe ọjọọ.+
9 N’agbanyeghị na o meghị ihe ọjọọ ọ bụla,*Nakwa na o kwughị ihe ga-eduhie onye ọ bụla,+Mgbe ọ nwụrụ, ebe e kenyere ya a ga-eli ya dị ebe nke ndị ajọ omume dị.+
E likwara ya ebe e liri ndị ọgaranya.*+
10 Ma, ọ bụ uche* Jehova ka a taa ya ezigbo ahụhụ. O kwekwara ka ọ rịa ọrịa.
Ọ bụrụ na ị ga-eme ka e jiri ndụ* ya chụọ àjà ikpe ọmụma,+Ọ ga-ahụ ụmụ* ya. Ọ ga-adịtekwa ndụ aka.+
A ga-esi n’aka ya mee ka uche* Jehova mezuo.+
11 N’ihi ahụhụ niile ọ* tara, ọ ga-ahụ uru ihe o mere bara. Ọ ga-ejukwa ya afọ.
Ohu m,+ bụ́ onye ezi omume, ga-eji ihe ọ maMee ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume.+
Ọ ga-eburukwa mmehie ha.+
12 N’ihi ya, m ga-ekenye ya na ọtụtụ ndị òkè.
Ya na ndị dike ga-ekekwa ihe a kwatara n’agha,N’ihi na o kwere ka e gbuo* ya.+
A gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.+
O buuru mmehie ọtụtụ ndị,+Gbachitekwara ndị na-emebi iwu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “n’ihe anyị nụrụ?”
^ Na Hibru, “aka.”
^ “Ya” nwere ike ịbụ onye nọ mgbe ihe a na-eme. “Ya” nwekwara ike ịbụ Chineke.
^ O nwere ike ịbụ, “O yiri onye ndị mmadụ na-anaghị ekwe ele anya n’ihu.”
^ Ma ọ bụ “E tigburu ya.”
^ Ma ọ bụ “gbasara ndụ onye ahụ?”
^ Ma ọ bụ “o nweghị onye o tiri ihe.”
^ Na Hibru, “onye ọgaranya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “ihe masịrị.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “Ma, ọ masịrị.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
^ Na Hibru, “ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi.”

