Samuel nke Abụọ 23:1-39

  • Ihe ndị ikpeazụ Devid kwuru (1-7)

  • Ike ndị agha Devid bụ́ ndị dike kpara (8-39)

23  Ihe ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:+ “Ihe Devid nwa Jesi+ kwuru,Ihe nwoke Chineke buliri elu kwuru.+ Ọ bụ onye Chineke Jekọb tere mmanụ+ Nakwa onye na-abụrụ ndị Izrel abụ dị ụtọ.+   Mmụọ Jehova si n’ọnụ m kwuo okwu.+ Okwu Chineke dịkwa n’ire m.+   Chineke Izrel kwuru okwu. Oké Nkume ndị Izrel+ gwara m, sị: ‘Mgbe onye na-achị ụmụ mmadụ bụ onye ezi omume,+Na-atụkwa egwu Chineke,+   Ọ dị ka ìhè na-adị n’ụtụtụ ma anwụ chawa,+Ya bụ, n’ụtụtụ ihu ígwé gbachapụrụ agbachapụ. Ọ dịkwa ka ìhè nke na-adị ma mmiri zochaa,Nke na-eme ka ahịhịa topụta.’+   Ezinụlọ m dị otú ahụ n’anya Chineke,N’ihi na mụ na ya gbara ndụ ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.+ A haziri ihe niile gbasara ọgbụgba ndụ a ahazi. Aka agaghịkwa akpa ya. Ọ bụ ya ga-eme ka nzọpụta m zuo okè. Ọ bụkwa ya bụ isi ọṅụ m. Ọ bụ ya mere o ji eme ka ihe na-agaziri ezinụlọ m.+   Ma, ndị na-abaghị uru ọ bụla dị ka osisi ogwu e kpofuru ekpofu,+Nke a na-enweghị ike iji aka chịrị.   Onye chọọ imetụ ha aka,O kwesịrị iji ígwè na ube. E kwesịkwara ịgba ha ọkụ kpamkpam.”  Ndị a bụ aha ndị dike bụ́ ndị agha Devid:+ Josheb-bashibet, onye Takimọnaịt, onyeisi ndị dike atọ.+ E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ asatọ (800) otu mgbe.  Onye na-esote ya bụ Elieza+ nwa Dodo,+ nwa Ahohaị. Mgbe ndị Filistia bịara ịlụso ndị Izrel agha, o so ná ndị dike atọ ha na Devid so gaa cheere ndị Filistia aka mgba. Mgbe ndị Izrel ndị ọzọ gbara ọsọ, 10  yanwa kwụụrụ, na-egbu ndị Filistia ruo mgbe aka fụwara ya ụfụ. O nweghịzi ike ijidesi mma agha ya ike.+ Otú a ka Jehova si mee ka ha merie* n’ụbọchị ahụ.+ Ndị Izrel so Elieza laghachikwara gaa yipụwe ndị o gburu ihe ha yi. 11  Onye na-esote ya bụ Shama nwa Egi onye Hararaịt. O nwere ụbọchị ndị Filistia zukọtara na Lihaị, n’ala ebe ahịhịa lentil juru, ndị Izrel agbaara ha ọsọ. 12  Ma Shama kwụụrụ n’etiti ala ahụ na-egbu ndị Filistia, napụtakwa ha ala ahụ. Otú a ka Jehova si mee ka ndị Izrel merie n’agha ahụ.*+ 13  Mmadụ atọ n’ime mmadụ iri atọ bụ́ ndị isi gakwuuru Devid n’ọgba Adọlam+ n’oge a na-ewe ihe ubi. Ma, ndị Filistia nọ ebe ha mara ụlọikwuu na Ndagwurugwu Refeyim.+ 14  N’oge ahụ, Devid nọ ebe a rụsiri ike.+ Ebe ndị agha Filistia na-anọ eche nche dịkwa na Betlehem. 15  Devid sịrị: “Obi ga-adị m ụtọ ma m ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem.” 16  Mgbe o kwuchara ihe a, ndị dike atọ ahụ banyere ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu, sere mmiri n’olulu mmiri ahụ dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem, butekwara ya Devid. Ma o kweghị aṅụ ya, kama ọ wụsaara ya Jehova n’ala.+ 17  Ọ sịkwara: “Tụfịakwa! Jehova, agaghị m aṅụ mmiri a. Olee ihe mere m ga-eji ṅụọ ọbara+ ụmụ nwoke a gaara anwụ ebe ha gara iseta mmiri?” N’ihi ya, o kweghị aṅụ ya. Ihe a ka ndị dike atọ ahụ so ná ndị agha ya mere. 18  Abishaị+ nwanne Joab nwa Zeruya+ bụ onyeisi ndị dike atọ ọzọ. E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300). Aha ya na-edekwa ude ka nke ndị dike atọ mbụ ahụ.+ 19  Ọ bụ eziokwu na a na-akwanyere ya ùgwù karịa ndị dike atọ nke ọzọ ahụ, ya abụrụkwa onyeisi ha, ọ harughị ka ndị dike atọ mbụ ahụ. 20  Benaya,+ nwa Jehoyada, bụ nwoke obi kara.* O mere ọtụtụ ihe na Kabzil.+ O gburu ụmụ nwoke abụọ Ariel onye Moab mụrụ. Ọ bụkwa ya banyere n’olulu mmiri gbuo ọdụm n’otu ụbọchị snoo na-ada.+ 21  Ọ bụkwa ya gburu otu nwoke Ijipt gbara ajọ dimkpa. N’agbanyeghị na onye Ijipt ahụ ji ube n’aka, yanwa ji mkpara gakwuru ya, napụta ya ube ya ahụ, jirikwa ya gbuo ya. 22  Ihe ndị a ka Benaya nwa Jehoyada mere. Aha ya na-edekwa ude ka nke mmadụ atọ ahụ bụ́ dike n’agha. 23  Ọ bụ eziokwu na a na-akwanyere ya ùgwù karịa ndị agha iri atọ ahụ bụ́ ndị isi, ọ harughị ka ndị dike atọ ahụ. Ma, Devid họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nche ya. 24  Asahel+ nwanne Joab bụ otu n’ime mmadụ iri atọ ahụ. Ndị ọzọ bụ: Elhenan nwa Dodo onye Betlehem,+ 25  Shama onye Herọd, Elaịka onye Herọd, 26  Hilez+ onye Paltaịt, Aịra+ nwa Ikesh onye Tekoa, 27  Abi-iza+ onye Anatọt,+ Mebọnaị onye Husha, 28  Zalmọn onye Ahohaị, Meharaị+ onye Netofa, 29  Hileb nwa Beana onye Netofa, Ịtaị nwa Raịbaị onye Gibia nke dị n’ebo Benjamin, 30  Benaya+ onye Piratọn, Hidaị onye si na ndagwurugwu* Geash,+ 31  Ebaị-albọn onye Bet-araba, Azmavet onye Bahurim, 32  Elayaba onye Shealbim, ụmụ Jeshen, Jonatan, 33  Shama onye Hararaịt, Ahayam nwa Shera onye Hararaịt, 34  Elifelet nwa Ahasbaị nwa onye Meakat, Elayam nwa Ahitofel+ onye Gaịlo. 35  Hezro onye Kamel, Pearaị onye Arab, 36  Aịgal nwa Netan onye Zoba, Benaị onye Gad, 37  Zilek onye Amọn, Neharaị onye Bierọt, bụ́ onye na-eburu Joab nwa Zeruya ngwá agha, 38  Aịra onye Itraịt, Gereb onye Itraịt,+ 39  na Yuraya+ onye Het. Ha niile dị iri atọ na asaa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “si zọpụta ha.”
Ma ọ bụ “si zọpụta ndị Izrel.”
Na Hibru, “nwa otu nwoke obi kara.”