Samuel nke Abụọ 21:1-22

  • Ndị Gibiọn gburu ndị ezinụlọ Sọl maka ndị ha o gburu (1-14)

  • Agha dị iche iche ndị Izrel na ndị Filistia lụrụ (15-22)

21  N’oge Devid na-achị, ụnwụ dara n’Izrel.+ Ọ kwụsịghịkwa ruo afọ atọ. Devid wee jụọ Jehova ase, Jehova asị: “Ikpe ọbara mara Sọl na ezinụlọ ya, n’ihi na o gburu ndị Gibiọn.”+  Eze wee kpọọ ndị Gibiọn+ gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị Amọraịt+ fọrọ ndụ. Ndị Izrel ṅụụrụ ha iyi na ha agaghị egbu ha.+ Ma, Sọl chọrọ igbuchapụ ha n’ihi na obi adịghị ya mma na ha na ndị Izrel na ndị Juda bi.)  Devid jụrụ ndị Gibiọn, sị: “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnịkwa ka m ga-eji kpuchie mmehie anyị, ka unu gọzie ndị Jehova?”  Ndị Gibiọn asị ya: “Ọlaọcha na ọlaedo agaghị eme ka obi jụrụ anyị+ n’ihe Sọl na ezinụlọ ya mere anyị. O nweghịkwanụ onye anyị ga-egbu n’Izrel.” Devid asị ha: “M ga-emere unu ihe ọ bụla unu kwuru.”  Ha asị eze: “Nwoke ahụ nke gburu ọtụtụ n’ime anyị, chọọkwa igbuchapụ anyị, ka anyị ghara ịdị ndụ n’ebe ọ bụla n’Izrel,+  ka a kpọnye anyị mmadụ asaa n’ime ụmụ ya ndị nwoke. Anyị ga-egbu ha, kwụwakwa ozu ha n’osisi*+ n’ihu Jehova na Gibia+ bụ́ obodo Sọl, onye Jehova họọrọ.”+ Eze asị ha: “M ga-akpọnye unu ha.”  Ma, Eze Devid meteere Mefiboshet+ nwa Jonatan+ nwa Sọl ebere, n’ihi iyi ya na Jonatan nwa Sọl ji aha Jehova ṅụọrọ ibe ha.  Eze kpọọrọ Amonaị na Mefiboshet, ụmụ nwoke abụọ Rizpa+ nwa Eya mụụrụ Sọl, kpọrọkwa ụmụ ndị nwoke ise Maịkal*+ nwa Sọl mụụrụ Edriel+ nwa Bazilaị, onye Ebel-mehola.  Ọ kpọọrọ ha kpọnye ndị Gibiọn, ha egbuo ha, kwụwa ozu ha n’ihu Jehova n’otu ugwu dị ebe ahụ.+ Ha asaa nwụrụ otu mgbe. E gburu ha n’oge a malitere iwe ihe ubi, ya bụ, mgbe a malitere iwe ọka bali n’ubi. 10  Rizpa+ nwa Eya chịịrị ákwà iru uju gbasaa n’elu oké nkume, nọrọkwa ebe ahụ malite mgbe e bidoro iwe ihe ubi ruo mgbe mmiri si n’eluigwe zoo maa ozu ha. O kweghịkwa ka ụmụ nnụnụ bekwasị ha n’ehihie ma ọ bụ ka anụ ọhịa bịa ha nso n’abalị. 11  A kọọrọ Devid ihe Rizpa, nwa Eya, bụ́ iko Sọl, mere. 12  Devid wee gakwuru ndị isi* Jebesh-gilied,+ ha achịnye ya ọkpụkpụ Sọl na ọkpụkpụ Jonatan nwa ya. Mgbe ndị Filistia gburu Sọl n’ugwu Gilboa, ọ bụ ndị Jebesh-gilied gara na nzuzo ebe ha kwụwara ha n’ámá obodo na Bet-shan, chịrị ọkpụkpụ ha.+ 13  Devid si ebe ahụ chịrị ọkpụkpụ Sọl na ọkpụkpụ Jonatan nwa ya. Ha chịkọtakwara ọkpụkpụ mmadụ asaa ahụ a kwụwara n’osisi.*+ 14  Ha liri ọkpụkpụ Sọl na ọkpụkpụ Jonatan nwa ya na Zila, bụ́ ala Benjamin,+ ebe e liri Kish+ nna ya. Mgbe ha mechara ihe niile eze gwara ha mee, Chineke nabatara arịrịọ ha na-arịọ maka ndị Izrel.+ 15  Ndị Filistia na ndị Izrel lụwakwara agha ọzọ.+ Devid na ndị na-ejere ya ozi gakwara lụso ndị Filistia agha, ma ike mechara gwụ Devid. 16  Otu n’ime ụmụ ndị Refeyim+ chọrọ igbu Devid. Aha ya bụ Ishbaị-binọb. Ube ya e ji ọla kọpa kpụọ dị narị shekel* atọ (300).+ O jikwa mma agha ọhụrụ. 17  Ozugbo ahụ, Abishaị+ nwa Zeruya bịara nyere ya aka,+ gbuo onye Filistia ahụ. N’oge ahụ, ndị Izrel gwara Devid,* sị: “Ị gaghịzi na-eso anyị aga agha.+ Anyị achọghị ka i menyụọ ọkụ Izrel.”*+ 18  Mgbe ihe a mechara, ndị Izrel na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ+ na Gọb.* Ọ bụ mgbe ahụ ka Sibekaị+ onye Husha gburu Saf, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ 19  Ndị Izrel na ndị Filistia lụkwara agha ọzọ+ na Gọb, Elhenan nwa Jeare-ọregim, onye Betlehem, egbuo Golayat onye Gat, onye okporo ube ya dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà.+ 20  Ha lụkwara agha ọzọ na Gat. N’ebe ahụ, e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa, nke nwere mkpịsị aka isii n’aka ya nke ọ bụla, nweekwa mkpịsị ụkwụ isii n’ụkwụ ya nke ọ bụla. Ha niile dị iri abụọ na anọ. Ọ bụkwa otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ 21  Ọ nọkwa na-echere ndị Izrel aka mgba.+ N’ihi ya, Jonatan nwa Shimiaị,+ bụ́ nwanne Devid, gburu ya. 22  Mmadụ anọ a bụ ụmụ ndị Refeyim bi na Gat. Devid na ndị na-ejere ya ozi gbukwara ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “gbaakwa ha n’anwụ,” ma, ha ga-ebu ụzọ gbajisịa ha ụkwụ na aka.
O nwere ike ịbụ, “Mirab.”
O nwere ike ịbụ, “ndị nwe ala.”
Na Hibru, “a gbara n’anwụ.”
Shekel 300 bụ kilogram 3. Gụọ B14.
Na Hibru, “ṅụụrụ Devid iyi.”
Ya bụ, anyị achọghị ka a chọọ onye ndú Izrel achọọ.”
1 Ihe E Mere 20:4, a kpọrọ ya Giza.