Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 9:1-31
9 Mgbe eze nwaanyị Shiba+ nụrụ akụkọ Solomọn, ọ bịara Jeruselem ka ọ jụọ ya ajụjụ ndị tara akpụ ka ọ mara ma ọ̀ ga-azata ha. Ọtụtụ mmadụ so ya. Ha jikwa kamel dị iche iche buru mmanụ balsam, ọtụtụ ọlaedo,+ na nkume ndị dị oké ọnụ.* Ọ gakwuuru Solomọn jụọ ya ihe niile ọ chọrọ ịjụ ya.+
2 Solomọn zakwara ya ajụjụ niile ọ jụrụ ya. O nweghị ihe ọ bụla nwaanyị ahụ jụrụ ya siiri ya ike ịza.
3 Mgbe eze nwaanyị Shiba hụrụ otú Solomọn si mara ihe,+ hụkwa ụlọ ọ rụrụ,+
4 o riri ya ọnụ. Ihe ndị ọzọ ọ hụrụ riri ya ọnụ bụ nri a na-adọsara Solomọn na tebụl,+ otú e si hazie ndị na-ejere ya ozi, otú ndị na-ebutere ya nri si ebute ya na otú ha si eji ejiji, otú ndị na-ebutere ya mmanya si ebute ya na otú ha si eji ejiji, nakwa àjà a na-esu ọkụ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova.+
5 O wee sị eze: “Ihe m nụrụ n’obodo m gbasara ike ị na-akpa* nakwa otú i si mara ihe bụ eziokwu.
6 Ma, ekwetaghị m ihe ndị mmadụ nọ na-akọ ruo ugbu a m bịara jiri anya m hụ ya.+ A gwarughịdị m ọkara otú ị maruru ihe.+ Ihe m na-ahụ gbasara gị karịrị ihe m nụrụ.+
7 Ndị gị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-ejere gị ozi, ndị gị na ha na-anọ mgbe niile, ha ana-ege ntị n’okwu onye amamihe ị na-ekwu, ga na-enwekwa obi ụtọ.
8 Ka e too Jehova Chineke gị, onye mere ka ị nọrọ n’ocheeze ya, meekwa ka ị bụrụ eze na-anọchite anya Jehova Chineke gị, maka na ihe gị masịrị ya. Chineke gị hụrụ ndị Izrel n’anya,+ ọ chọkwara ka ha dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere o ji họrọ gị ka ị bụrụ eze ha, ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume.”
9 O bunyeziri eze otu narị talent* ọlaedo na iri abụọ (120),+ mmanụ balsam karịrị akarị, na nkume ndị dị oké ọnụ.* O nweghị mgbe ọzọ e buteere Eze Solomọn mmanụ balsam há ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere ya.+
10 Ndị na-ejere Haịram ozi na ndị na-ejere Solomọn ozi si Ofa+ bute ọlaedo, mechaakwa bute osisi algọm na nkume ndị dị oké ọnụ.*+
11 Eze ji osisi algọm ndị ahụ rụọ steepụ ụlọ Jehova+ nakwa steepụ ụlọ* eze,+ jirikwa ha rụọrọ ndị na-abụ abụ une na ụbọ akwara.+ O nwetụbeghị mgbe a hụrụ ụdị osisi dị ka osisi ndị ahụ na Juda.
12 Eze Solomọn nyekwara eze nwaanyị Shiba ihe ọ bụla masịrị ya ọ rịọrọ ya. Ihe ndị eze nyere nwaanyị ahụ karịkwara nke o wetaara eze. Nwaanyị ahụ na ndị na-ejere ya ozi mechara laghachi n’obodo ha.+
13 N’afọ ọ bụla, ọlaedo a na-ebutere Solomọn na-adị narị talent isii na iri isii na isii (666),+
14 n’agụnyeghị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahịa dị iche iche, ndị eze ndị Arab niile, na ndị gọvanọ mpaghara dị iche iche na-ebutere Solomọn.+
15 Eze Solomọn jikwa ọlaedo a gwara agwa+ rụọ narị nnukwu ọta abụọ (200) (o ji narị shekel* ọlaedo isii (600) a gwara agwa rụọ ọta nke ọ bụla).+
16 O jikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị obere ọta atọ (300) (o ji maịna* ọlaedo atọ rụọ obere ọta nke ọ bụla). Eze dowekwara ha n’ụlọ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+
17 Eze jikwa ọdụ́ rụọ otu nnukwu ocheeze ma were ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+
18 Steepụ e si arịgo n’ocheeze ahụ nwere ụzọ ebe isii a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe ya. A rụnyere ihe e ji agbakwasị ụkwụ e ji ọlaedo rụọ n’ocheeze ahụ, rụnyekwa ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ. A kpụnyekwara otu ọdụm+ n’akụkụ ebe nke ọ bụla a na-atụkwasị aka.
19 A kpụnyere ọdụm iri na abụọ+ n’elu ebe isii ahụ a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe steepụ ahụ. Ọdụm abụọ dị na nke ọ bụla n’ime ha, otu n’aka nri, otu n’aka ekpe. O nweghị alaeze ọzọ rụrụ ụdị ihe a.
20 E ji ọlaedo mee iko niile Eze Solomọn nwere, jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa niile dị n’ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn. E nweghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee, n’ihi na e nweghị ihe e ji ọlaọcha kpọrọ n’oge Solomọn na-achị.+
21 Ndị na-ejere Haịram+ ozi na-eji ụgbọ mmiri eze aga Tashish.+ Otu ugboro n’afọ atọ, ụgbọ mmiri ndị a na-aga Tashish ebute ọlaedo, ọlaọcha, ọdụ́,+ adaka, na ekwuru.
22 Eze Solomọn nwere akụnụba karịa ndị eze ndị ọzọ niile nọ n’ụwa, kakwa ha mara ihe.+
23 Ndị eze niile n’ụwa na-achọtakwa* Solomọn ka ha gere okwu onye amamihe ezi Chineke tinyere n’obi ya.+
24 Kwa afọ, onye ọ bụla n’ime ha na-ewetara ya onyinye. Ha na-eweta ihe ndị e ji ọlaọcha mee, ihe ndị e ji ọlaedo mee, uwe,+ ngwá agha, mmanụ balsam, ịnyịnya, na jakị.
25 Solomọn nwekwara puku ụlọ ịnyịnya anọ (4,000), ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya, na puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+
26 Ọ nọkwa na-achị ndị eze niile nọ malite n’Osimiri Yufretis ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt.+
27 Ọlaọcha eze webatara na Jeruselem dị ọtụtụ ka nkume. Osisi sida o butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila.*+
28 Ndị mmadụ na-esikwa n’Ijipt na n’obodo ndị ọzọ atụbatara Solomọn ịnyịnya.+
29 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Solomọn,+ malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. Ọ bụ Netan+ onye amụma, Ahaịja+ onye Shaịlo, na Ido onye ọhụụ dere ya. Ido+ dere ya n’ebe o dere ọhụụ ọ hụrụ gbasara Jeroboam+ nwa Nibat.
30 Solomọn nọ na Jeruselem chịa ndị Izrel niile afọ iri anọ.
31 N’ikpeazụ, Solomọn nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya n’Obodo Devid nna ya.+ Rehoboam nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “okwu ndị ị na-ekwu.”
^ Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “obí.”
^ Na Hibru, “na-achọkwa ihu.”
^ Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
^ Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”