Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 6:1-42

  • Solomọn gwara ndị Izrel okwu (1-11)

  • Ekpere Solomọn ji nyefee Chineke ụlọ nsọ (12-42)

6  Solomọn kwuru n’oge ahụ, sị: “Jehova, i kwuru na ị ga-ebi n’ígwé ojii.+  Ma ugbu a, m rụọlara gị nnukwu ụlọ ka ọ bụrụ ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.”+  Ka ndị Izrel niile guzo ọtọ,+ eze tụgharịrị, chee ha ihu ma gọzie ha.  O kwukwara, sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye ji ọnụ ya kwe Devid nna m nkwa, jirikwa aka ya mezuo ya ma sị,  ‘Malite n’ụbọchị m si n’ala Ijipt kpọpụta ndị m, ọ dịghị obodo m họọrọ n’ebo niile n’Izrel ka a rụọ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.+ Ọ dịghịkwa onye m họọrọ ka ọ bụrụ onye ndú ndị Izrel bụ́ ndị m.  Ma ahọrọla m Jeruselem+ ka a nọrọ na ya na-eto aha m. Ahọrọkwala m Devid ka ọ chịwa ndị Izrel bụ́ ndị m.’+  Ọ dị Devid nna m n’obi ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke Izrel.+  Ma Jehova gwara Devid nna m, sị, ‘Ị gbalịala, ebe ọ bụ na ọ dị gị n’obi ịrụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.  Ma, ọ bụghị gị ga-arụ ụlọ ahụ. Kama, ọ bụ nwa a ga-amụrụ gị* ga-arụ ụlọ ahụ a ga-anọ na-eto aha m.’+ 10  Jehova emezuokwala nkwa o kwere, n’ihi na anọchiela m Devid nna m, m nọkwa n’ocheeze Izrel,+ otú Jehova kwere ná nkwa.+ Arụọkwala m ụlọ a ga-anọ na-eto aha Jehova bụ́ Chineke Izrel. 11  Ọ bụkwa n’ime ya ka m dọsara Igbe e tinyere mbadamba nkume ndị e dere ọgbụgba ndụ Jehova na ndị Izrel gbara.”+ 12  Solomọn bịaziri guzoro n’ihu ebe ịchụàjà Jehova, n’ihu ndị Izrel niile, gbasaa aka ya abụọ.+ 13  (Solomọn adịla mbụ jiri ọla kọpa rụọ ihe dị elu a na-eguzo ekwu okwu ma dọsa ya n’etiti ogige ụlọ ahụ.+ Ogologo ya dị kubit* ise, obosara ya adị kubit ise, ma ogo ya dị kubit atọ. Solomọn guzokwa n’elu ihe ahụ.) O gburu ikpere n’ala n’ihu ndị Izrel niile, gbasaa aka ya abụọ chee ha n’eluigwe.+ 14  O kwuziri, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, ọ dịghị Chi dị ka gị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Gị na mmadụ gbaa ndụ, ị na-emezu ihe unu kwekọrịtara. Ị na-egosikwa ndị ohu gị na ị hụrụ ha n’anya, ya bụ, ndị ji obi ha niile na-eme ihe i kwuru.+ 15  I mezuola nkwa i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m.+ I ji ọnụ gị kwe ya nkwa a. I jirikwala aka gị mezuo ya taa.+ 16  Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke Izrel, mezuokwa nkwa a i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m. I kwere ya nkwa, sị: ‘Ọ bụrụhaala na ụmụ gị ejisie ike na-edebe iwu m+ otú gịnwa debere,+ ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’ 17  Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke Izrel, biko, mezuo nkwa i kwere Devid ohu gị. 18  “Ma Chineke ọ̀ ga-eso ụmụ mmadụ biri n’ụwa n’eziokwu?+ Eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, enweghị ike ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ a m rụrụ.+ 19  Jehova bụ́ Chineke m, biko, gee ntị n’ekpere ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara. Nụkwa ákwá ohu gị na-ebesara gị ka i nyere ya aka na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị. 20  Biko, ka anya gị dịrị n’ụlọ a ehihie na abalị, n’ebe a i kwuru na a ga-anọ na-eto aha gị.+ Geekwa ntị n’ekpere ohu gị chere ihu ebe a na-ekpe. 21  Biko, nụrụ arịrịọ ohu gị na-arịọ gị ka i nyere ya aka, nụrụkwa nke ndị Izrel bụ́ ndị gị ga-arịọ gị mgbe ha chere ihu ebe a+ kpee ekpere. Nọrọ n’eluigwe ebe i bi+ nụ ya. Biko, nụ ya ma gbaghara.+ 22  “Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ ibe ya, e meekwa ka ọ ṅụọ iyi,* ya abịakwa n’ihu ebe ịchụàjà gị dị n’ụlọ a+ ka ọ ṅụọ iyi, 23  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ, meekwa ihe gbasara ya. Kpeere ndị ohu gị ikpe. Mee ka onye ajọ omume buru ihe o metara,+ ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ ya. Kwuokwa na aka onye ezi omume dị ọcha,* kwụọkwa ya ụgwọ maka ezi omume ya.+ 24  “Ọ bụrụ na ndị iro emerie ndị Izrel bụ́ ndị gị n’ihi na ha na-emehie gị,+ ha emechaa lọghachikwute gị ma bịa n’ụlọ a+ nọrọ n’ihu gị too aha gị,+ kpee ekpere,+ rịọkwa gị arịrịọ ka i meere ha amara, 25  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha,+ gbaghara mmehie ndị Izrel bụ́ ndị gị, ma kpọghachi ha n’ala i nyere ha na ndị nna nna hà.+ 26  “Ọ bụrụ na eluigwe akpọchie, mmiri akwụsịkwa izo+ n’ihi na ndị Izrel nọ na-emehie gị,+ ha chee ihu ebe a kpee ekpere, too aha gị, hapụkwa mmehie ha maka na i menyela ha ihere,*+ 27  biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ arịrịọ ha, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, ndị Izrel bụ́ ndị gị. Zi ha ụzọ dị mma ha kwesịrị iso,+ meekwa ka mmiri zoo+ n’ala gị nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ nke ha. 28  “Ọ bụrụ na ụnwụ adaa n’ala a,+ ma ọ bụ e nwee ọrịa na-efe efe,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na ihe ndị gị kụrụ n’ubi akpọnwụọ, ma ọ bụ ihe ndị ha nwe amaa ebu,+ ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na igurube ma ọ bụ ụkpara+ ebibie ihe ndị ha kụrụ n’ubi, ma ọ bụ, ọ bụrụ na ndị iro ha anọchibido ha n’obodo ha ọ bụla,*+ ma ọ bụ, ha ana-ata ụdị ahụhụ ọ bụla ma ọ bụ na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla,+ 29  ọ bụrụ na otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha niile bụ́ ndị gị agbasaa aka chee ụlọ a ihu+ kpee ekpere+ ma ọ bụ rịọ gị ka i meere ha amara,+ (n’ihi na onye ọ bụla ma ihe bụ́ nsogbu ya na ahụhụ ọ na-ata),+ 30  biko, nọrọ n’eluigwe ebe i bi+ nụrụ, gbagharakwa ha.+ Kwụọkwa onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà, n’ihi na ị ma obi onye ọ bụla (n’eziokwu, ọ bụ naanị gị ma obi ndị mmadụ).+ 31  Ihe a ga-eme ka ha na-atụ egwu gị, na-eme ihe otú ị chọrọ ụbọchị niile ha dị ndụ n’ala i nyere nna nna anyị hà. 32  “Ọ bụrụkwa na onye mba ọzọ, onye na-abụghị onye Izrel, onye sikwa n’obodo dị anya bịa n’ihi aha gị dị ebube,+ n’ihi aka gị siri ike, nakwa n’ihi ike gị, abịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere,+ 33  biko, nọrọ n’eluigwe ebe i bi nụ ekpere ya, meekwara ya ihe niile ọ na-arịọ gị, ka ndị niile nọ n’ụwa wee mara aha gị,+ na-atụkwa egwu gị otú ndị Izrel bụ́ ndị gị na-eme, ka ha wee marakwa na m rụrụ ụlọ a ka a nọrọ na-eto aha gị. 34  “Ọ bụrụ na ndị gị agaa ịlụso ndị iro ha agha n’ebe ị sị ha gaa,+ ha echeekwa ihu n’obodo a ị họọrọ nakwa n’ụlọ a m rụrụ ka a nọrọ na-eto aha gị,+ rịọ gị ka i nyere ha aka,+ 35  nọrọ n’eluigwe nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara, mesookwa ha otú dị mma.+ 36  “Ọ bụrụ na ha emehie gị (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie),+ gị ewesa ha ezigbo iwe, nyefeekwa ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha adọrọkwa ha n’agha laa ebe dị nso ma ọ bụ ebe dị anya,+ 37  anya emechaakwa doo ha ebe ahụ a dọọrọ ha n’agha laa, ha alọghachikwute gị ma rịọ gị ka i meere ha amara n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha, ha asịkwa, ‘Anyị emehiela, anyị emejọọla, anyị akpaala àgwà ọjọọ,’+ 38  ha anọrọkwa n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha+ jiri obi ha niile na mkpụrụ obi* ha niile lọghachikwute gị,+ ha echeekwa ihu n’ụlọ a m rụrụ ka a nọrọ na-eto aha gị, nke dị n’ala i nyere ndị nna nna ha nakwa n’obodo ị họọrọ,+ kpee ekpere, 39  biko, nọrọ n’eluigwe, ebe i bi, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara, mesookwa ha otú dị mma+ ma gbaghara ndị gị mehiere gị. 40  “Biko, Chineke m, ka anya gị dịrị n’ebe ndị ga-ekpe ekpere ebe a nọ, ka ntị gị nụkwa ekpere niile ha ga-ekpe ebe a.*+ 41  Jehova Chineke, ka gị na igbe ọgbụgba ndụ, nke na-egosi na ị dị ike, nọrọ ebe a zuru ike.+ Jehova Chineke, ka ndị nchụàjà gị na-egosi na ọ bụ gị na-azọpụta mmadụ.* Ka ndị na-erubere gị isi ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi ihe ọma.+ 42  Jehova Chineke, ajụla onye i tere mmanụ.+ Cheta otú i si gosi Devid ohu gị na ị hụrụ ya n’anya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nwa gị, nke ga-esi n’úkwù gị pụta.”
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Ịṅụ iyi a na-ekwu okwu ya ebe a bụ nke a na-ata onye ṅụrụ ya ahụhụ ma ọ bụrụ na ihe o kwuru abụghị eziokwu ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na o meghị ihe ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-eme.
Na Hibru, “Kpọọkwa onye ezi omume onye ezi omume.”
Ma ọ bụ “ị taala ha ahụhụ.”
Ma ọ bụ “n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha.”
Ma ọ bụ “gbasara ebe a.”
Na Hibru, “ka e yiwe ndị nchụàjà gị nzọpụta dị ka uwe.”