Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 31:1-21

  • Hezekaya bibiri ihe ndị e ji efe arụsị (1)

  • A malitere ilekọta ndị nchụàjà na ndị Livaị nke ọma (2-21)

31  Ozugbo ha mechara ihe a niile, ndị Izrel niile ndị bịara ebe ahụ gara n’obodo ndị dị na Juda kụtuo ogidi arụsị dị iche iche,+ gbutuokwa ogwe osisi arụsị* dị iche iche+ ma kwatuo ebe ndị dị elu+ na ebe ịchụàjà+ ndị dị na Juda na Benjamin niile, nakwa n’Ifrem na Manase+ ruo mgbe ha bibichara ha niile. E mechaa, ndị Izrel niile laghachiri n’obodo ha. Onye nke ọ bụla laghachiri n’ụlọ ya.  Hezekaya bịara kee ndị nchụàjà na ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè.+ O kenyere onye nchụàjà nke ọ bụla na onye Livaị nke ọ bụla ọrụ ha ga na-arụ n’otu n’otu.+ Ọrụ ha ga-abụ ịchụ àjà a na-esu ọkụ, ịchụ àjà udo, ije ozi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ nakwa ịnọ ebe ahụ na-ekele Jehova ma na-eto ya.+  Eze sikwa n’akụ̀ ya nye ihe a ga-eji na-achụ àjà a na-esu ọkụ,+ ma àjà nke a na-esu ọkụ n’ụtụtụ ma nke mgbede,+ ma nke a na-achụ n’Ụbọchị Izu Ike,+ ma nke a na-achụ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ ma nke a na-achụ n’oge ememme dị iche iche,+ otú e dere n’Iwu Jehova.  Ọ gwakwara ndị bi na Jeruselem ka ha na-ewetara ndị nchụàjà na ndị Livaị ihe e kwesịrị ịna-enye ha,+ ka ha wee na-edebezu iwu Jehova.  Ozugbo ndị Izrel nụrụ ihe a, ha malitere iweta mkpụrụ mbụ si n’ọka ha wetara n’ubi, mmanya ọhụrụ, mmanụ,+ mmanụ aṅụ, na ihe ndị ọzọ niile ha wetara n’ubi.+ Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile. Ihe niile ha wetara hiri nne.+  Ndị Izrel na ndị Juda ndị bi n’obodo ndị dị na Juda wetara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ehi ha na atụrụ ha. Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị dị nsọ,+ ya bụ, ihe ndị e dooro Jehova bụ́ Chineke ha nsọ. Ha wetara ha, tụkọta ha n’ikpo n’ikpo.  Ha malitere ịtụkọta ha n’ikpo n’ikpo n’ọnwa nke atọ.+ Ha tụkọtachara ha n’ọnwa nke asaa.+  Mgbe Hezekaya na ndị isi hụrụ ikpo ndị ahụ, ha toro Jehova, gọziekwa ndị Izrel bụ́ ndị ya.  Hezekaya jụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị otú e si nweta ihe ndị ahụ niile. 10  Azaraya onyeisi nchụàjà, onye si n’ezinụlọ Zedọk, asị ya: “Kemgbe ndị mmadụ malitere iweta onyinye n’ụlọ Jehova,+ ha na-eri nri na-eriju afọ, na-erifọkwa ihe buru ibu, n’ihi na Jehova agọziela ndị ya. Nnukwu ihe a bụkwa ihe fọrọ afọ.”+ 11  Hezekaya wee gwa ha ka ha dozie ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe*+ n’ụlọ Jehova. Ha wee dozie ha. 12  Ha nọgidere na-eweta onyinye na otu ụzọ n’ụzọ iri+ nakwa ihe ndị dị nsọ. Konanaya onye Livaị na-elekọta ihe a niile. Shimiaị nwanne ya na-esote ya. 13  Jehayel, Azazaya, Nehat, Asahel, Jerimọt, Jozabad, Iliel, Ismakaya, Mehat, na Benaya bụ ndị nlekọta na-enyere Konanaya na Shimiaị nwanne ya aka, otú Eze Hezekaya kwuru ka ha na-eme. Azaraya bụkwa onye nlekọta n’ụlọ ezi Chineke. 14  Kore nwa Imna, onye Livaị nke na-eche ọnụ ụzọ ámá dị ebe ọwụwa anyanwụ nche,+ na-ahụ maka onyinye ndị mmadụ ji obi ha niile nye+ ezi Chineke. Ọ na-ekesakwa ma onyinye e nyere Jehova+ ma ihe ndị kacha nsọ.+ 15  Ndị nọ n’okpuru ya bụ Iden, Minayamin, Jeshụa, Shemaya, Amaraya, na Shekanaya. Ha nọ n’obodo dị iche iche ndị nchụàjà nwe.+ Ha na-arụ ọrụ ndị a tụkwasịrị obi na-arụ, ya bụ, ikesara ụmụnne ha ihe n’ìgwè ha dị iche iche,+ ma onye ukwu ma onye nta. 16  Ndị ọzọ ha na-ekesara ihe bụ ụmụ nwoke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, malite ná ndị dị afọ atọ gbagowe. Ndị a na-abịa eje ozi n’ụlọ Jehova kwa ụbọchị, na-arụkwa ọrụ e kenyere ìgwè ha dị iche iche. 17  E debara aha ndị nchụàjà n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche n’ọnụmara n’ọnụmara.+ Otú ahụkwa ka e si deba aha ndị Livaị n’akwụkwọ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe.+ E dekwara aha ha otú e si kenye ha ọrụ n’ìgwè n’ìgwè.+ 18  E debakwara aha ezinụlọ ndị Livaị niile n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, ma ụmụaka ha, ma ndị nwunye ha, ma ụmụ ha ndị nwoke, ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha na-edo onwe ha nsọ mgbe niile maka ọrụ dị nsọ ha na-arụ, ya bụ, ọrụ ndị a tụkwasịrị obi na-arụ. 19  E debakwara aha ndị si n’ezinụlọ Erọn n’akwụkwọ. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị bi n’ala anụmanụ na-ata ahịhịa ndị dị nso n’obodo ha dị iche iche.+ N’obodo ndị ahụ niile, a họpụtara ụfọdụ ụmụ nwoke ka ha na-ekesara ndị nchụàjà nri, na-ekesakwara ndị Livaị niile e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche. 20  Hezekaya mere ihe a n’ebe niile na Juda. Ọ nọkwa na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya. Ọ kwụsịghịkwa irubere ya isi. 21  O ji obi ya niile rụọ ọrụ niile gbasara ife Chineke ya, ma nke metụtara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke+ ma nke metụtara idebe iwu ya na iso ntụziaka ya. Ihe gazikwaara ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”