Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 29:1-36

  • Hezekaya malitere ịchị Juda (1, 2)

  • Ihe ọma ndị Hezekaya mere (3-11)

  • E mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (12-19)

  • A maliteghachiri ịrụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ nsọ (20-36)

29  Hezekaya+ malitere ịchị mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise. Ọ chịrị afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Abaịja, nwa Zekaraya.+  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova+ otú Devid nna nna ya mere.+  N’ọnwa nke mbụ n’afọ nke mbụ n’ọchịchị ya, o meghere ọnụ ụzọ ndị dị n’ụlọ Jehova, rụziekwa ha.+  Ọ kpọkwara ndị nchụàjà na ndị Livaị, ha ezukọọ na mbara èzí dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ụlọ nsọ.  Ya asị ha: “Ndị Livaị, geenụ m ntị. Doonụ onwe unu nsọ,+ dookwanụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nsọ. Wepụnụ arụsị dị iche iche n’ebe dị nsọ.+  N’ihi na ndị nna anyị hà nọ na-enupụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị isi, na-emekwa ihe dị njọ n’anya ya.+ Ha hapụrụ Jehova, gbakụta ya azụ, wepụkwa anya* ha n’ebe ụlọikwuu ya dị.+  Ha mechikwara ọnụ ụzọ dị n’ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ,+ menyụọkwa ọkụ* ndị dị ebe ahụ.+ Ha kwụsịkwara ịmụnye insens* ọkụ+ nakwa ịchụrụ Chineke Izrel àjà a na-esu ọkụ+ n’ebe nsọ.  N’ihi ya, Jehova wesara ndị Juda na ndị bi na Jeruselem iwe+ ma mee ka ọdachi dakwasị ha. Ndị hụrụ ihe e mere ha na ndị nụrụ gbasara ya nọ na-ama jijiji, ya eju ha anya, ha ana-afụkwa mkpọrọhịhị,* otú unu ji anya unu na-ahụ.+  Ọ bụkwa maka ihe a ka e ji jiri mma agha gbuo nna nna anyị hà,+ dọrọkwa ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nakwa ndị nwunye anyị n’agha.+ 10  Ọ dị m n’obi ugbu a ka mụ na Jehova bụ́ Chineke Izrel gbaa ndụ,+ n’ihi na ọ ga-eme ka obi ya jụrụ n’iwe ọ na-ewesa anyị. 11  Ndị nke m, ugbu a abụghị oge unu kwesịrị ileghara ọrụ unu anya,* n’ihi na Jehova họọrọ unu ka unu na-ejere ya ozi+ nakwa ka unu na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ.”+ 12  Ndị Livaị bidoziri ọrụ. Ndị nke si n’agbụrụ Kohat+ bụ Mehat nwa Amesaị na Joel nwa Azaraya. Ndị nke si n’agbụrụ Meraraị+ bụ Kish nwa Abdaị na Azaraya nwa Jehalelel. Ndị nke si n’agbụrụ Geshọn+ bụ Joa nwa Zima na Iden nwa Joa. 13  Ndị si n’agbụrụ Elizefan bụ Shimraị na Jeyuel. Ndị si n’agbụrụ Esaf+ bụ Zekaraya na Matanaya. 14  Ndị si n’agbụrụ Himan+ bụ Jehayel na Shimiaị. Ndị si n’agbụrụ Jedutọn+ bụ Shemaya na Ọziel. 15  Eze gwara ha, ha akpọkọta ụmụnne ha, doo onwe ha nsọ, bịakwa ime ka ụlọ Jehova dị ọcha otú Jehova kwuru ka e mee.+ 16  Ndị nchụàjà banyeziri n’ụlọ Jehova iji mee ka ọ dị ọcha. Ha kpooro ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ n’ụlọ nsọ Jehova kpopụta n’ogige ụlọ Jehova.+ Ndị Livaị ekporo ha kpoga na Ndagwurugwu Kidrọn nke dị n’azụ obodo.+ 17  Otú a ka ha si malite ido ụlọ nsọ ahụ nsọ n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ. N’abalị asatọ n’ọnwa ahụkwa, ha ruru n’ebe a rụnyere ihe n’ụzọ e si abata n’ụlọ Jehova.+ Ha jikwa ụbọchị asatọ ọzọ doo ụlọ Jehova nsọ. Ha mechara ihe a n’abalị iri na isii n’ọnwa mbụ. 18  Mgbe ha mechara, ha bịakwutere Eze Hezekaya, sị ya: “Anyị emeela ka ebe niile n’ụlọ Jehova dị ọcha, ma ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ na arịa niile dị na ya,+ ma tebụl a na-eji edosa achịcha a na-enye Chineke+ na arịa niile ya na ya so. 19  Anyị ahaziekwala arịa niile Eze Ehaz wepụrụ n’ụlọ nsọ mgbe o nupụụrụ Chineke isi n’oge ọ na-achị.+ Anyị edookwala ha nsọ. Ha dị n’ihu ebe ịchụàjà Jehova.”+ 20  Eze Hezekaya wee bilie n’isi ụtụtụ kpọkọọ ndị isi obodo, ha agaa n’ụlọ Jehova. 21  Ha kpụtara oké ehi asaa, ebule asaa, ụmụ ebule asaa, na mkpi asaa ka ha bụrụ àjà mmehie maka alaeze ahụ na maka ụlọ nsọ ahụ nakwa maka ndị Juda.+ Hezekaya gwaziri ụmụ ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ka ha jiri anụ ndị ahụ chụọ àjà n’ebe ịchụàjà Jehova. 22  Ndị nchụàjà gbuziri oké ehi ndị ahụ,+ fesa ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà ahụ.+ Ha gbukwara ebule ndị ahụ, fesakwa ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà ahụ. Ha gbukwara ụmụ ebule ndị ahụ ma fesa ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà. 23  Ma, ha kpụtara mkpi ndị ahụ a ga-eji chụọ àjà mmehie n’ihu eze nakwa n’ihu ndị gbakọrọ ebe ahụ ma bikwasị ha aka. 24  Ndị nchụàjà gburu ha ka ha bụrụ àjà mmehie. Ha fesara ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà iji kpuchie mmehie ndị Izrel niile, n’ihi na eze kwuru ka a chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà mmehie maka ndị Izrel niile. 25  Hezekaya gwakwara ndị Livaị ka ha jiri ájà, ụbọ akwara, na une+ guzoro n’ụlọ Jehova, otú Devid na Gad onye na-ahụrụ eze ọhụụ nakwa Netan onye amụma kwuru ka a na-eme.+ Ọ bụ Jehova si n’ọnụ ndị amụma ya kwuo ka a na-eme ya otú ahụ. 26  N’ihi ya, ndị Livaị ji ngwá egwú Devid guzoro, ndị nchụàjà ejirikwa opi guzoro.+ 27  Hezekaya gwaziri ha ka ha chụọ àjà a na-esu ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.+ Mgbe ha malitere ịchụ ya, ndị na-abụ abụ malitere ịbụrụ Jehova abụ, ndị na-afụ opi amalitekwa ịfụ opi. Ha nọ na-afụ ya ka ya na abụ e ji ngwá egwú Devid eze Izrel na-abụ na-adakọ. 28  Ndị niile gbakọrọ ebe ahụ nọkwa na-akpọ isiala ka a nọ na-abụ abụ ma na-afụ opi. A nọ na-eme ihe a niile ruo mgbe a chụchara àjà ahụ a na-esu ọkụ. 29  Ozugbo ha chụchara àjà ahụ, eze na ndị niile ya na ha nọ hulatara kpọọ isiala. 30  Eze Hezekaya na ndị isi gwaziri ndị Livaị ka ha jiri abụ Devid+ na nke Esaf+ onye ọhụụ too Jehova. Ha wee jiri ọṅụ na-abụ abụ otuto, hulatakwa kpọọ isiala. 31  Hezekaya kwuziri, sị: “Ugbu a e dorola unu iche ka unu na-ejere Jehova ozi, jirinụ ihe unu ga-eji chụọ àjà ekele na àjà ndị ọzọ bịa n’ụlọ Jehova.” Ha niile maliteziri iweta ihe ha ga-eji chụọ àjà ekele na àjà ndị ọzọ. Onye ọ bụla n’ime ha o metụrụ n’obi wetakwara ihe a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ 32  Ha wetara ehi iri asaa, otu narị ebule (100), nakwa narị ụmụ ebule abụọ (200) ka e jiri chụọ àjà a na-esu ọkụ. Ihe a niile ka ha wetara ka e jiri chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ.+ 33  Ha wetakwara narị ehi isii (600) na puku atụrụ atọ (3,000) ka e jiri chụọ àjà ndị ọzọ dị nsọ. 34  Ma ndị nchụàjà ndị nọ ebe ahụ ezughị ịgba anụ niile ahụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ akpụkpọ. N’ihi ya, ụmụnne ha ndị Livaị bịara na-enyere ha aka+ ruo mgbe a rụchara ọrụ ahụ, ruokwa mgbe ndị nchụàjà ndị ọzọ dochara onwe ha nsọ,+ n’ihi na ndị Livaị ka ndị nchụàjà gbaa mbọ ido onwe ha nsọ. 35  Ihe ndị ha wetara ka e jiri chụọ àjà a na-esu ọkụ karịkwara akarị,+ ma abụba anụ a ga-eji chụọ àjà udo,+ ma mmanya a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ Otú a ka e si maliteghachi* ịrụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova. 36  Hezekaya na mmadụ niile nọkwa na-enwe aṅụrị na ezi Chineke nyeere ndị ya aka,+ n’ihi na ihe a niile mere n’otu ntabi anya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ihu.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ha ana-akwakwa ha emo.”
Ma ọ bụ “izu ike.”
Ma ọ bụ “kwadebe.”