Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 23:1-21

  • Jehoyada nyere aka e chie Jehoash eze (1-11)

  • E gburu Atalaya (12-15)

  • Ihe ọma dị iche iche Jehoyada mere (16-21)

23  N’afọ nke asaa, Jehoyada katara obi kpọọ ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ ha na ya agbaa ndụ. Ndị isi ahụ bụ Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohenan, Azaraya nwa Obed, Measaya nwa Adaya, na Elishefat nwa Zikraị. 2  Ha gaziri n’obodo niile dị na Juda kpọkọta ndị Livaị+ na ndị isi ọnụmara ndị dị n’Izrel. Mgbe ha gbakọrọ na Jeruselem, 3  ha na eze gbara ndụ+ n’ụlọ ezi Chineke. Mgbe ha gbachara ndụ, Jehoyada sịrị ha: “Ihe Jehova kwere Devid ná nkwa gbasara ụmụ ya ga-eme. Ọ bụ nwa eze ga-achị.+ 4  Ihe a ka unu ga-eme: Ndị nchụàjà na ndị Livaị ga-eke onwe ha ụzọ atọ. Otu ụzọ ga-abịa ọrụ+ n’Ụbọchị Izu Ike. Ha ga na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 5  Otu ụzọ ọzọ ga-anọ n’ụlọ* eze,+ otu ụzọ ọzọ anọrọ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọzi n’ogige ndị dị n’ụlọ Jehova.+ 6  Unu ekwela ka onye ọ bụla bata n’ụlọ Jehova ma e wezụga ndị nchụàjà na ndị Livaị na-eje ozi.+ Ọ bụ ha ga-abata n’ihi na ha dị nsọ. Ndị ọzọ niile ga-anọ n’èzí na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ Jehova. 7  Ndị Livaị ga-agba eze gburugburu, onye nke ọ bụla ga-ejikwa ngwá agha ya n’aka. Gbuonụ onye ọ bụla batara n’ụlọ ahụ. Sorokwanụ eze ebe ọ bụla ọ na-aga.”* 8  Ndị Livaị na ndị Juda niile mekwara nnọọ ihe Jehoyada onye nchụàjà gwara ha. Onyeisi nke ọ bụla kpọọrọ ndị nọ n’ìgwè ya, ma ndị nke nọ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ahụ ma ndị nke na-anọghị ọrụ,+ n’ihi na Jehoyada onye nchụàjà agwabeghị ìgwè dị iche iche+ ka ha kwụsị ọrụ. 9  Jehoyada onye nchụàjà nyekwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ+ ube na ọta Eze Devid,+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke.+ 10  Ọ gwakwara mmadụ niile ebe ha ga-anọ, ha anọrọ ebe ahụ gbaa eze gburugburu, malite n’ebe aka nri ụlọ ahụ ruo n’ebe aka ekpe ya. Ha nọkwa ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ ahụ nso, onye nke ọ bụla n’ime ha jikwa ngwá agha ya n’aka. 11  Ha kpọpụtakwara nwa eze,+ kpuwe ya okpueze, dokwasịkwa Ihe Àmà*+ n’isi ya ma chie ya eze. Jehoyada na ụmụ ya tekwara ya mmanụ. Ha asị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”+ 12  Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ, na-eto eze, ọ bịakwutere ha ozugbo n’ụlọ Jehova.+ 13  Ọ hụkwara ka eze guzo n’akụkụ otu ogidi* nke dị ebe e si abata n’ụlọ ahụ. Ndị isi+ na ndị na-afụ opi nọkwa n’akụkụ eze. Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ+ ma na-afụ opi. Ndị ji ngwá egwú na-abụ abụ nọkwa na-edu ndị niile ahụ na-aṅụrị ọṅụ. Ihe a mere ka Atalaya dọwaa uwe ya, tie mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” 14  Ma Jehoyada onye nchụàjà kpọrọ ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ, ya bụ, ndị isi ndị agha, sị ha: “Kpọpụnụ ya ebe a unu nọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla esoro ya, jirinụ mma agha gbuo onye ahụ.” Jehoyada onye nchụàjà kwukwara, sị: “Unu egbula ya n’ụlọ Jehova.” 15  Ndị agha ahụ wee kpụrụ ya. Mgbe ha kpụ ya rute ebe a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya, nke dị n’ụlọ* eze, ha gburu ya ozugbo. 16  Jehoyada mekwara ka ya na mmadụ niile na eze gbaa ndụ na ha agaghị akwụsị ịbụ ndị Jehova.+ 17  Mgbe e mechara, mmadụ niile gara n’ụlọ Bel, kwatuo ya,+ kụriekwa ebe ndị a na-achụrụ ya àjà na arụsị ndị dị ebe ahụ.+ Ha gbukwara Matan bụ́ onye nchụàjà Bel+ n’ihu ebe ịchụàjà ndị ahụ. 18  Jehoyada nyefeziri ndị nchụàjà na ndị Livaị ọrụ ndị dị n’ụlọ Jehova. Devid adịla mbụ kee ha n’ìgwè n’ìgwè ka ha na-elekọta ụlọ Jehova, na-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ+ otú e dere n’Iwu Mosis ka a na-eme.+ Ka ha na-eme ihe ndị a, ha ga na-aṅụrị ọṅụ, na-abụkwa abụ otú Devid kwuru ka a na-eme. 19  O dowekwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova, ka onye ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụzọ ọ bụla ghara ịbanye. 20  Ọ kpọkwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ndị agha,+ ndị ukwu, ndị ọchịchị, nakwa ndị obodo ahụ niile, ha esi n’ụlọ Jehova kpọrọ eze pụwa. Ha sizi n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago bata n’ụlọ* eze, meekwa ka eze nọrọ n’ocheeze+ alaeze ahụ.+ 21  Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ. Obodo ahụ dakwara jii n’ihi na ha ejirila mma agha gbuo Atalaya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “mgbe ọ na-apụ apụ na mgbe ọ na-abata abata.”
O nwere ike ịbụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Chineke.
Na Hibru, “ogidi ya.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”