Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 19:1-11
19 Jehoshafat eze Juda wee laa n’ụlọ* ya dị na Jeruselem n’udo.+
2 Jihu+ nwa Hanenaị+ onye ọhụụ gakwuuru Eze Jehoshafat, sị ya: “Ì kwesịrị ịna-enyere ndị ajọ omume aka,+ hụkwa ndị kpọrọ Jehova asị n’anya?+ Jehova na-ewere gị iwe maka ihe a i mere.
3 Ma, e nwere ihe ndị dị mma Chineke hụrụ i mere.+ I wepụchaala ogwe osisi arụsị* n’obodo a. I kpebiekwala* ife ezi Chineke.”+
4 Jehoshafat bikwa na Jeruselem. Ọ gakwara ọzọ na nke ndị mmadụ ka o mee ka ha lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.+ O si Bia-shiba ruo n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+
5 Ọ họpụtakwara ndị ikpe n’obodo niile dị na Juda, ma n’obodo niile a rụsiri ike.+
6 Ọ gwara ndị ikpe ahụ, sị: “Lezienụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova. Ọ ga-anọnyekwara unu mgbe unu na-ekpe ikpe.+
7 Na-atụnụ egwu Jehova.+ Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+ Ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu,+ ọ naghịkwa ana aka azụ.”*+
8 Jehoshafat họpụtakwara ụfọdụ ndị Livaị, ụfọdụ ndị nchụàjà, na ụfọdụ ndị isi ọnụmara dị iche iche n’Izrel ka ha nọrọ na Jeruselem na-ekpere Jehova ikpe, na-edozikwara ndị bi na Jeruselem okwu.+
9 Ọ gwakwara ha, sị: “Na-atụnụ egwu Jehova n’ọrụ unu. Jirinụ obi unu niile na-arụ ya, na-akwụwakwanụ aka ọtọ.
10 Ọ bụrụ na ụmụnne unu esi n’obodo ha dị iche iche bịa ka e leba anya n’okwu ha nke gbasara igbu mmadụ*+ ma ọ bụ nke gbasara iwu Chineke, ntụziaka ya, ma ọ bụ ihe o kpebiri ka e mee, dọọnụ ha aka ná ntị ka ha ghara imehie Jehova. Ọ bụrụ na unu adọghị ha aka ná ntị, Chineke ga-ewesa unu na ụmụnne unu iwe. Ihe a ka unu ga na-eme ka aka unu dị ọcha.
11 Amaraya onyeisi nchụàjà ga na-elekọta ihe niile gbasara ozi unu na-ejere Jehova.+ Zebadaya nwa Ishmel ga-abụ onye ndú ndị ebo Juda n’ọrụ niile unu na-arụrụ eze. Ndị Livaị ga na-enyekwara ndị ikpe aka. Dịnụ ike, meekwanụ ihe ndị a, ka Jehova nọnyekwara ndị na-eme ihe dị mma.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “n’obí.”
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ị kwadebekwala obi gị.”
^ Ma ọ bụ “eri ngarị.”
^ Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”