Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 17:1-19
17 Jehoshafat nwa Esa+ nọchiri ya, malite ịchị. O mekwara ka ọchịchị ya sie ike n’Izrel.
2 O dowekwara ndị agha n’obodo niile a rụsiri ike na Juda, meekwa ka e nwee ebe ndị agha na-anọ eche nche n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’Ifrem, ndị Esa nna ya weghaara.+
3 Jehova nọnyeere Jehoshafat n’ihi na ọ kpara àgwà ka Devid nna nna ya,+ ọ chọghịkwa Bel.
4 Kama, ọ bụ Chineke nke nna ya ka ọ chọrọ.+ O mekwara ihe iwu ya kwuru. Ọ kpaghị àgwà ka ndị Izrel.+
5 Jehova mere ka alaeze ya sie ezigbo ike.+ Ndị Juda niile nọkwa na-enye Jehoshafat onyinye, ya enwee akụnụba, a na-akwanyere ya ezigbo ùgwù.+
6 Obi bịakwara sie ya ike ịna-eso ụzọ Jehova. O wepụdịrị ebe ndị dị elu+ na ogwe osisi arụsị*+ na Juda.
7 N’afọ nke atọ n’ọchịchị ya, ọ kpọkọrọ ndị o mere ndị isi. Ha bụ Ben-hel, Obedaya, Zekaraya, Netanel, na Mịkaya. O ziri ha ka ha gaa kụziere ndị nọ n’obodo ndị dị na Juda ihe.
8 Ndị Livaị sokwa ha. Ha bụ Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramọt, Jehonatan, Adọnaịja, Tobaịja, na Tob-adonaịja. Elishama na Jehoram, bụ́ ndị nchụàjà, sokwa ha.+
9 Ha jikwa akwụkwọ e dere Iwu Jehova+ malite ịkụziri ndị mmadụ ihe na Juda. Ha gazuru ebe niile na Juda na-akụziri ndị mmadụ ihe.
10 Ụjọ Jehova nọkwa na-atụ alaeze niile gbara Juda gburugburu. Ha alụsoghịkwa Jehoshafat agha.
11 Ndị Filistia na-ewetara Jehoshafat onyinye, na-atụrụ ya ụtụ. Ndị Arab kpụtakwaara ya puku ebule asaa na narị asaa (7,700) nakwa puku mkpi asaa na narị asaa (7,700).
12 Jehoshafat nọ na-esikwu ike n’ọchịchị,+ na-arụkwa obodo ndị siri ike+ na obodo ndị a na-akwasa ihe+ na Juda.
13 Ọ rụrụ ọtụtụ ihe n’obodo ndị dị na Juda. O nwekwara ndị agha, ndị bụ́ dike n’agha, na Jeruselem.
14 E kere ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ndị si n’otu ọnụmara nọrọ n’otu ìgwè. A bịa ná ndị si na Juda, Adna bụ onyeisi ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha. O nwere narị puku mmadụ atọ (300,000) bụ́ ndị dike n’agha.+
15 Jehohenan nọ n’okpuru ya. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ na puku iri asatọ (280,000).
16 Amasaya nwa Zikraị nọkwa n’okpuru ya. O wepụtara onwe ya ịna-arụ ọrụ Jehova. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ (200,000) bụ́ ndị dike n’agha.
17 N’ebo Benjamin,+ e nwere Elayada bụ́ dike n’agha. Ọ bụkwa onyeisi narị puku mmadụ abụọ (200,000) ndị na-eji ụta na ọta.+
18 Jehozabad nọ n’okpuru ya, bụrụkwa onyeisi otu narị puku ndị agha na puku iri asatọ (180,000).
19 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-ejere eze ozi ma e wezụga ndị eze dowere n’obodo niile a rụsiri ike na Juda.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.