Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 14:1-15

  • Mgbe Abaịja nwụrụ (1)

  • Esa malitere ịchị Juda (2-8)

  • Esa meriri ndị Etiopia dị otu nde (9-15)

14  Mgbe e mechara, Abaịja nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ, ha elie ya n’Obodo Devid.+ Esa nwa ya nọchiri ya, malite ịchị. N’oge Esa na-achị, a lụghị agha n’obodo ahụ ruo afọ iri.  Esa mere ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.  O wepụchara ebe ịchụàjà chi ndị mba ọzọ+ na ebe ndị dị elu, kụtuchaa ogidi arụsị dị iche iche,+ gbutuchaakwa ogwe osisi arụsị* dị iche iche.+  Ọ gwakwara ndị Juda ka ha na-achọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, na-edebe Iwu ya, na-esokwa ntụziaka ya.  Otú a ka o si si n’obodo niile dị na Juda wepụ ebe ndị dị elu na ihe ndị e ji adọsa insens.+ Alaeze ahụ enweghịkwa nsogbu ọ bụla mgbe ọ na-achị.  Ọ rụrụ obodo dị iche iche na Juda, rụsiekwa ha ike,+ ebe ọ bụ na ala ahụ enweghị nsogbu ọ bụla, o nweghịkwa ndị lụsoro ya agha n’afọ ndị ahụ niile, n’ihi na Jehova mere ka o zuru ike.+  Ọ sịrị ndị Juda: “Ugbu a ala a ka bụ nke anyị n’ihi na anyị chọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị, ka anyị rụsie obodo ndị a ike, rụọ mgbidi gburugburu ha, rụọkwa ụlọ nche,+ ọnụ ụzọ ámá nakwa ihe e ji atụchi ha. Anyị achọọla Chineke, ya emeekwa ka anyị zuru ike ebe ọ bụla anyị nọ.” Ha rụchara ihe ndị ahụ ha nọ na-arụ.+  Ndị agha Esa, ndị si n’ebo Juda, dị narị puku atọ (300,000). Ha na-ejikwa ọta ukwu na ube. Ndị dike n’agha, ndị si n’ebo Benjamin, dị narị puku abụọ na puku iri asatọ (280,000). Ha na-ejikwa obere ọta na ụta.*+  Ka oge na-aga, Zira onye Etiopia chị otu nde ndị agha (1,000,000) bịawa ịlụso Esa hà agha. Ha ji narị ụgbọ ịnyịnya atọ (300) na-abịa.+ Mgbe ha ruru Marisha,+ 10  Esa gara ka ha lụwa agha. Ya na Zira hazikwara ndị agha ha n’usoro maka ịlụ agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị na Marisha. 11  Esa rịọziri Jehova bụ́ Chineke ya,+ sị: “Jehova, ị chọọ inyere ndị mmadụ aka, ị ga-enyere ha aka, ma hà dị ọtụtụ ma hà dị ole na ole, ma hà siri ike ma ọ bụ na ha esighị.+ Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị tụkwasịrị gị obi.+ Anyị jikwa aha gị na-alụso ìgwè mmadụ a agha.+ Jehova, ị bụ Chineke anyị. Ekwela ka mmadụ efu merie gị.”+ 12  Jehova wee merie ndị Etiopia n’ihu Esa na n’ihu ndị Juda, ha agbaa ọsọ.+ 13  Esa na ndị agha ya chụgidere ha ruo Gira.+ Ndị Etiopia nọkwa na-anwụ ruo mgbe ọ na-enweghị onye ọ bụla n’ime ha fọrọ ndụ, n’ihi na Jehova na ndị agha ya lara ha n’iyi. Mgbe a lachara ha n’iyi, ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe ha nwere laa. 14  Ha bibikwara obodo niile gbara Gira gburugburu, n’ihi na ụjọ Jehova nọ na-atụ ndị bi n’obodo ndị ahụ. Ha bukọkwaara ihe ndị dị n’obodo ndị ahụ niile. Ihe ndị obodo ahụ nwere karịkwara akarị. 15  Ha bibikwara ụlọikwuu ndị na-akpa anụ, kpụrụ ọtụtụ atụrụ na kamel, mechazie lọghachi Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-ekwekwa ụta.”