Jọn Nke Abụọ 1:1-13

  • Ekele (1-3)

  • Na-eje ije n’eziokwu (4-6)

  • Lezienụ anya maka ndị nduhie (7-11)

  • Jọn kwuru na ya ga-abịa ịhụ ha; ekele mmechi (12, 13)

 Nwaanyị a họọrọ, mụnwa bụ́ okenye* na-edetara gị akwụkwọ ozi, gị na ụmụ gị, ndị m hụrụ n’anya n’eziokwu. Ọ bụghị naanị m, kama ndị niile matarala eziokwu hụkwara unu n’anya,  n’ihi eziokwu nke na-adịgide n’obi anyị, nke ga-adịgidekwa n’obi anyị ruo mgbe ebighị ebi.  Chineke Nna na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-akụziri anyị eziokwu ma hụ anyị n’anya. Ha ga-emere anyị amara, meere anyị ebere, meekwa ka udo dịrị anyị.  M na-aṅụrị nnukwu ọṅụ n’ihi na achọpụtala m na ụfọdụ ụmụ gị na-eje ije n’eziokwu ahụ,+ otú Nna anyị nyere anyị n’iwu.  N’ihi ya, m na-arịọ gị, nwaanyị, ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. (Ihe a m na-edetara gị abụghị iwu ọhụrụ, kama ọ bụ iwu e nyere anyị ná mmalite.)+  Ịhụnanya pụtara anyị ịna-ebi ndụ otú o nyere n’iwu.+ Ihe a bụ ihe o nyere n’iwu, otú unu nụrụ ya ná mmalite, na unu kwesịrị ịna-ahụ ibe unu n’anya.  N’ihi na ọtụtụ ndị nduhie abanyela n’ụwa,+ ndị na-anaghị ekweta na Jizọs Kraịst bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa.*+ Ọ bụ onye a bụ onye nduhie na onye na-emegide Kraịst.+  Lezienụ anya ka unu ghara imebi ihe ndị anyị gbara mbọ rụọ, kama ka unu nweta ụgwọ ọrụ zuru ezu.+  Onye ọ bụla nke na-ahapụ ihe Kraịst kụziri ma na-akụzi ihe dị iche, onye ahụ na Chineke adịghị n’otu.+ Ma, ọ bụ onye nọgidere n’ihe Kraịst kụziri ka ya na Nna anyị na Ọkpara ya na-adị n’otu.+ 10  Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu, ma ọ naghị akụzi ihe Kraịst kụziri, unu anabatala ya n’ụlọ unu,+ unu ekelekwala ya. 11  N’ihi na onye kelere ya na-akwado ajọ ọrụ ya. 12  Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịgwa unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na ịnk dee ha, kama m nwere olileanya na m ga-abịa ịhụ unu ka mụ na unu kwuo okwu ihu na ihu, ka ọṅụ unu wee zuo ezuo. 13  Ụmụ nwanne gị nwaanyị, bụ́ onye a họọrọ, na-ekele gị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “agadi nwoke.”
Na Grik, “Kraịst bịara n’anụ ahụ́.”