Samuel nke Mbụ 22:1-23

  • Devid gara Adọlam, gaakwa Mizpe (1-5)

  • Sọl nyere iwu ka e gbuo ndị nchụàjà nọ na Nọb (6-19)

  • Abayata gbara ọsọ (20-23)

22  Devid wee si ebe ahụ gbaga+ n’ọgba dị n’Adọlam.+ Mgbe ụmụnne ya na ezinụlọ nna ya niile nụrụ ya, ha gakwuuru ya ebe ahụ. 2  Ndị niile nọ ná nsogbu, ndị niile nwere onye ha ji ụgwọ nakwa ndị niile nwere ihe na-ewute ha gakwukwaara ya, ya abụrụ onyeisi ha. Ụmụ nwoke ya na ha nọ dị ihe dị ka narị anọ (400). 3  E mechaa, Devid si ebe ahụ gaa Mizpe dị na Moab wee sị eze Moab:+ “Biko, ka nne m na nna m biri na nke gị ruo mgbe m matara ihe Chineke ga-emere m.” 4  Devid wee hapụ ha na nke eze Moab, ha na ya ebiri n’oge niile Devid nọ ebe o zoro.+ 5  Ka oge na-aga, Gad+ onye amụma sịrị Devid: “Ezozila ebe a ị na-ezo. Gaa n’ala Juda.”+ Devid wee si ebe ahụ gaa n’oké ọhịa dị na Hiret. 6  Sọl wee nụ na a hụla Devid na ụmụ nwoke ya na ha nọ. Mgbe Sọl nụrụ ihe a, ọ nọ ọdụ n’okpuru osisi tamarisk dị n’elu ugwu na Gibia.+ O ji ube ya n’aka, ndị niile na-ejere ya ozi guzokwa ya gburugburu. 7  Ọ gwaziri ndị ahụ na-ejere ya ozi, sị: “Unu ndị Benjamin, biko, geenụ ntị. Nwa Jesi+ ọ̀ ga-enye unu niile ala na ubi vaịn? Ọ̀ ga-ahọpụta unu niile ka unu bụrụ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha?+ 8  Unu niile agbaalara m izu. O nweghị onye gwara m mgbe nwa m na nwa Jesi gbara ndụ.+ O nweghịkwa onye n’ime unu na-emetere m ebere, gwakwa m na nwa m emeela ka onye na-ejere m ozi lụsowa m agha otú ọ na-eme taa.” 9  Doeg+ onye Ịdọm, onyeisi ndị na-ejere Sọl ozi, wee sị:+ “Ahụrụ m nwa Jesi mgbe ọ bịara Nọb, gakwuru Ahimelek nwa Ahaịtọb.+ 10  Ahimelek jụụrụ ya Jehova ase, nyekwa ya ihe oriri. O nyedịrị ya mma agha Golayat onye Filistia.”+ 11  Eze ziri ozi ozugbo ahụ ka a kpọọ Ahimelek nwa Ahaịtọb onye nchụàjà na ndị nchụàjà niile bụ́ ndị ezinụlọ nna ya nọ na Nọb. Ha niile wee bịakwute eze. 12  Sọl asị: “Biko, nwa Ahaịtọb, gee ntị!” Ya asị: “Onyenwe m ana m ege ntị.” 13  Sọl asị ya: “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaara m izu? Gịnị mere i ji nye ya achịcha na mma agha, jụọkwara ya Chineke ase? Ọ na-emegide m, na-akpakwa nkata ihe ọ ga-eme m, otú ọ na-eme ugbu a.” 14  Ahimelek asị eze: “Ònye n’ime ndị niile na-ejere gị ozi ka e kwesịrị ịtụkwasị obi ka Devid?+ Ọ bụ ọgọ eze,+ bụrụ onyeisi ndị nche gị, bụrụkwa onye a na-akwanyere ùgwù n’ụlọ gị.+ 15  Nke a ọ̀ bụ nke mbụ m na-ajụrụ ya Chineke ase?+ O nweghị ihe ga-eme ka m gbaara gị izu. Ka eze ghara ịsị na o nwere ihe mụnwa bụ́ ohu ya nakwa ezinụlọ nna m niile mere, n’ihi na ohu gị amaghị ihe ọ bụla gbasara okwu a.”+ 16  Ma eze sịrị: “Ahimelek, ị ga-anwụrịrị,+ gị na ezinụlọ nna gị niile.”+ 17  Eze gwaziri ndị nche* nọ ya nso, sị: “Gaanụ gbuo ndị nchụàjà Jehova, n’ihi na ha dụnyeere Devid úkwù. Ha ma na ọ gbara ọsọ ma ha agwaghị m.” Ma, ndị nche ahụ achọghị ịkpa ndị nchụàjà Jehova aka. 18  Eze sịziri Doeg:+ “Gaa gbuo ndị nchụàjà a.” Ozugbo ahụ, Doeg onye Ịdọm+ gara gbuo ndị nchụàjà ahụ. N’ụbọchị ahụ, o gburu mmadụ iri asatọ na ise yi efọd e ji ákwà linin kwaa.+ 19  O jikwa mma agha gbuo ndị Nọb,+ bụ́ obodo ndị nchụàjà bi. O gburu ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa ọhụrụ, ma ehi ma jakị ma atụrụ. 20  Ma, otu nwa Ahimelek, nwa Ahaịtọb, gbapụrụ soro Devid. Aha ya bụ Abayata.+ 21  Abayata kọọrọ Devid, sị: “Sọl egbuola ndị nchụàjà Jehova.” 22  Devid wee sị Abayata: “N’ụbọchị ahụ, ama m+ na ebe ọ bụ na Doeg onye Ịdọm hụrụ m ebe ahụ, ọ ga-agwarịrị Sọl. Ọ bụ m mere e ji gbuo onye* ọ bụla nọ n’ezinụlọ nna gị. 23  Ka mụ na gị nọrọ. Atụla egwu, n’ihi na onye ọ bụla nke na-achọ igbu gị* ga-ebugodị ụzọ gbuo m.* M ga-echebe gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”