Samuel nke Mbụ 11:1-15
11 Nehash onye Amọn+ wee kpọrọ ndị agha ya gaa maa ụlọikwuu ka ọ lụso obodo Jebesh+ nke dị na Gilied agha. Ndị Jebesh niile asị Nehash: “Ka anyị na gị gbaa ndụ ka anyị jewere gị ozi.”
2 Nehash onye Amọn asị ha: “Mụ na unu ga-agba ndụ naanị ma m ghụpụ anya aka nri unu. M ga-eme ya iji menye ndị Izrel niile ihere.”
3 Ndị okenye Jebesh asị ya: “Nye anyị ụbọchị asaa ka anyị zigara ndị Izrel niile ozi. Ọ bụrụzie na o nweghị onye ga-anapụta anyị n’aka gị, anyị ga-achịliri gị aka elu.”
4 Mgbe ndị gara izi ozi ahụ rutere Gibia,+ bụ́ obodo Sọl, kọọrọ ndị Izrel ihe ahụ, mmadụ niile bewere ákwá, na-ebesi ya ike.
5 Ma, Sọl si n’ubi chịrị ìgwè ehi ya na-alọta, jụwa, sị: “Gịnị na-eme ndị a? Gịnị mere ha ji na-ebe ákwá?” Ha wee kọọrọ ya ihe niile ndị Jebesh kwuru.
6 Mgbe Sọl nụrụ ihe a, mmụọ Chineke nyere ya ike,+ ezigbo iwe jidekwara ya,
7 ya akpụrụ oké ehi abụọ, bọkasịa ha ma dunye ndị ozi, ha ejiri ha gaa ebe niile n’Izrel, sị: “Otú a ka a ga-eme ehi onye ọ bụla na-abịaghị soro Sọl na Samuel.” Ndị Izrel wee tụọ egwu Jehova, jiri otu obi pụta.
8 Sọl gụrụ ndị Izrel ọnụ na Bizek, gụta ndị Juda puku iri atọ (30,000), na ndị Izrel ndị ọzọ narị puku mmadụ atọ (300,000).
9 Ha wee gwa ndị ozi ahụ bịaranụ, sị: “Gwanụ ndị Jebesh nke dị na Gilied, sị, ‘A ga-azọpụta unu echi mgbe anwụ chasiwere ike.’” Ndị ozi ahụ agaa gwa ndị Jebesh ihe a. Obi wee bụrụ ha sọ aṅụrị.
10 Ndị Jebesh wee sị Nehash: “Anyị ga-achịliri unu aka elu echi ka unu mee anyị ihe ọ bụla masịrị unu.”+
11 N’echi ya, tupu chi abọọ,* Sọl kere ndị Izrel ụzọ atọ, ha abanye n’etiti ebe ndị Amọn mara ụlọikwuu na-egbu ha+ ruo mgbe anwụ chasiwere ike. Ndị ha na-egbughị gbasasịrị ebe dị iche iche, nke na o nweghị mmadụ abụọ nọ otu ebe.
12 Ndị Izrel wee sị Samuel: “Olee ndị niile sị, ‘Ọ̀ bụ Sọl ga-abụ eze anyị?’+ Kpọpụta ha, ka anyị gbuo ha.”
13 Ma, Sọl gwara ha, sị: “O nweghị onye a ga-egbu taa,+ n’ihi na Jehova zọpụtara ndị Izrel taa.”
14 E mechaa, Samuel gwara ndị Izrel, sị: “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal+ mee ka o doo anya na Sọl abụrụla eze.”+
15 Ndị Izrel niile wee gaa Gilgal, nọrọkwa ebe ahụ chie Sọl eze n’ihu Jehova. Ha chụkwaara Jehova àjà udo ebe ahụ.+ Sọl na ndị Izrel niile ṅụrịkwara ezigbo ọṅụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’oge nche ụtụtụ,” ya bụ, malite n’ihe dị ka n’elekere abụọ nke ime abalị ruo elekere isii nke isi ụtụtụ.