Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 17:1-27
17 Ozugbo Devid kwabachara n’ụlọ* ya, ọ gwara Netan+ onye amụma, sị: “Ugbu a, ebi m n’ụlọ e ji osisi sida+ rụọ, ma, a ka na-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ụlọikwuu.”+
2 Netan asị ya: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi ime, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.”
3 Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Chineke gwara Netan, sị:
4 “Gaa gwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ bụghị gị ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi.+
5 Ebitụbeghị m n’ụlọ malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel ruokwa taa. Kama, m na-esi n’otu ụlọ ndò aga n’ụlọ ndò ọzọ, na-esikwa n’otu ụlọikwuu aga n’ụlọikwuu ọzọ.+
6 M so ndị Izrel na-agagharị kemgbe. Ọ bụ m na-ahọpụtara Izrel ndị m ndị ikpe ka ha na-azụ ha ka atụrụ. È nwetụla mgbe ị nụrụ na m gwara otu n’ime ha ka o jiri osisi sida rụọrọ m ụlọ?”’
7 “Gwakwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ị nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ ka ha na-ata ahịhịa, mụ abịa kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+
8 M ga-anọnyere gị ebe ọ bụla ị na-aga.+ M ga-egbu ndị iro gị niile.+ M ga-emekwa ka aha gị na-ede ude ka aha ndị ukwu bi n’ụwa.+
9 M ga-enye Izrel ndị m otu ebe, ha ga-ebikwa ebe ahụ. A gaghị enwe onye ga-enye ha nsogbu. Ndị ọjọọ agaghịkwa emekpa ha ahụ́ ọzọ otú ha mere na mbụ,+
10 malite n’oge m na-ahọpụta ndị ikpe ka ha bụrụ ndị isi Izrel ndị m.+ M ga-emekwa ka i merie ndị iro gị niile.+ M na-asịkwa gị, ‘Jehova ga-arụrụ gị ụlọ.’*
11 “‘“Mgbe ị nwụrụ, e liekwa gị otú e liri nna nna gị hà, m ga-echi otu n’ime ụmụ* gị, onye ị mụtara, eze, ka ọ nọchie gị.+ M ga-emekwa ka alaeze ya sie ezigbo ike.+
12 Ọ bụ ya ga-arụrụ m ụlọ.+ M ga-emekwa ka ocheeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.+
13 M ga-abụ nna ya, yanwa ga-abụkwa nwa m.+ Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya+ otú m kwụsịrị ịhụ onye ị nọchiri.+
14 M ga-eme ka ọ nọrọ n’ocheeze m ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ ga na-achịkwa n’alaeze ya ruo mgbe ebighị ebi.”’”+
15 Netan gwara Devid ihe a niile a gwara ya n’ọhụụ.
16 Eze Devid wee nọdụ ala n’ihu Jehova, sị: “Jehova Chineke, ònye ka m bụ? Gịnịkwa ka ezinụlọ m bụ mere i ji meere m ihe a niile?+
17 Chineke, a ka na-ekwu ihe a niile i meere m, gị ana-agwakwa m ugbu a na ezinụlọ ohu gị ga-adịte aka.+ Jehova Chineke, ị na-elekwa m anya ka onye ukwu.
18 Olee ihe ọzọ mụnwa bụ́ ohu gị Devid ga-agwa gị gbasara ùgwù niile ị kwanyeere m maka na ị ma ohu gị nke ọma?+
19 Jehova, i mere ihe a niile dị egwu, nke gosiri na ị bụ onye ukwu, n’ihi ohu gị nakwa n’ihi na ọ bụ ihe ị chọrọ ime.+
20 Jehova, o nweghị onye dị ka gị.+ Ọ bụ eziokwu na anyị anụla gbasara ọtụtụ chi ndị ọzọ, naanị gị bụ Chineke.+
21 Oleekwa mba dị n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel?+ Ezi Chineke, ị gara gbapụta ha ka ha bụrụ ndị gị.+ I mere oké ihe na ihe ndị dị egwu iji mee ka aha gị na-ede ude.+ Ị chụpụrụ mba dị iche iche n’ihi ndị gị+ i si n’Ijipt gbapụta.
22 I meela ka ndị Izrel bụrụ ndị gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Jehova, ị bụrụkwala Chineke ha.+
23 Ugbu a, Jehova, ka nkwa i kwere gbasara mụnwa bụ́ ohu gị nakwa gbasara ezinụlọ m ghara ịgbanwe ruo mgbe ebighị ebi. Biko, meekwa ihe i kwere ná nkwa.+
24 Ka aha gị dịruo mgbe ebighị ebi. Ka a na-etokwa aha gị+ ruo mgbe ebighị ebi. Ka ndị mmadụ, sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, Chineke Izrel, ị bụ Chineke ndị Izrel n’eziokwu.’ Ka ezinụlọ Devid ohu gị siekwa ezigbo ike n’anya gị.+
25 N’ihi na gịnwa, bụ́ Chineke m, agwala ohu gị na i zubere ịrụrụ ya ụlọ.* Ọ bụ ya mere obi ji sie ohu gị ike ịgwa gị ihe ndị a n’ekpere.
26 Ugbu a, Jehova, ọ bụ gị bụ ezi Chineke. I kwekwala ohu gị nkwa imere ya ihe ọma ndị a.
27 Biko, gọzie ezinụlọ ohu gị ka ọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Jehova, ị gọziela ezinụlọ ohu gị. Ọ ga-abụkwa ezinụlọ a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

