Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 5:1-13

  • Otu nwanna kwara iko (1-5)

  • Ntakịrị ihe na-eko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara koo (6-8)

  • A ga-achụpụ nwoke ọjọọ ahụ n’ọgbakọ (9-13)

5  Anụrụ m na e nwere otu nwoke n’ime unu kpọọrọ nwunye nna ya, ya na ya ebiri.+ Ụdị ịkwa iko* a jọgburu onwe ya. Ọ kadị nke ndị mba ọzọ na-akwa njọ.  Ùnu ji ụdị mmehie a na-anya isi? Ó kwesịghị ịna-ewute unu?+ Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịchụpụ nwoke mere ihe a n’ọgbakọ?+  N’agbanyeghị na mụ na unu anọghị, obi m dị ebe unu nọ.* Ekpeekwala m nwoke mere ihe a ikpe dị ka à ga-asị na mụ na unu nọ.  Mgbe unu zukọtara n’aha Onyenwe anyị Jizọs, marakwa na Onyenwe anyị Jizọs nyere m ike, nakwa na obi m dị ebe unu nọ,*  nyefeenụ nwoke ahụ n’aka Setan+ ka e bibie ihe nwere ike ime ka ọgbakọ na-eme mmehie,* ka a gharakwa inwe ihe ga-emebi adịm ná mma ọgbakọ na Chineke n’ụbọchị Onyenwe anyị.+  Isi unu na-anya adịghị mma. Ọ̀ bụ na unu amaghị na ntakịrị ihe na-eko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara agwakọta koo?+  Wepụnụ ihe ahụ na-eko achịcha, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, n’ihi na unu dị ka ntụ ọka a na-etinyeghị ihe na-eko achịcha. N’eziokwu, Kraịst ejirila ndụ ya chụọ àjà,+ si otú ahụ bụrụ nwa atụrụ anyị ji mee Ememme Ngabiga.+  N’ihi ya, anyị mewe ememme ọzọ,+ ka anyị ghara iji achịcha ochie koro eko, gharakwa iji ihe na-eko achịcha nke nọchiri anya ime mmehie na ime ihe ọjọọ. Kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko, nke nọchiri anya ịkwụwa aka ọtọ na ikwu eziokwu.  N’akwụkwọ ozi m detaara unu, m gwara unu ka unu na ndị na-akwa iko* kwụsị ịna-emekọrịta ihe.* 10  Anaghị m ekwu gbasara ndị niile na-akwa iko* n’ụwa a+ ma ọ bụ ndị anyaukwu ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị. N’ihi na ọ bụrụ ihe m na-ekwu, ọ pụtara na unu ga-esi n’ụwa pụọ.+ 11  Ma, akwụkwọ m na-edetara unu ugbu a bụ ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna, bụ́ onye na-akwa iko,* ma ọ bụ onye anyaukwu,+ ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ,* ma ọ bụ onye aṅụrụma,+ ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe,+ kwụsị ịna-emekọrịta ihe.*+ Unu na onye dị otú a erikọkwala ihe. 12  Gịnị jikọrọ mụ na ndị na-anọghị n’ọgbakọ, nke m ga-eji kpewe ha ikpe? Ọ bụ ndị nọ n’ọgbakọ ka unu kwesịrị ikpe ikpe, 13  ebe Chineke ga-ekpe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ikpe.+ “Chụpụnụ onye ọjọọ ahụ n’ọgbakọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “m nọnyeere unu n’ime mmụọ.”
Ma ọ bụ “m nọnyeere unu n’ime mmụọ.”
Na Grik, “ka e bibie anụ ahụ́.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ịna-akpakọrịta.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “onye na-akparị mmadụ.”
Ma ọ bụ “ịna-akpakọrịta.”