Ọpụpụ 8:1-32

  • Ahụhụ nke abụọ: mbàrá (1-15)

  • Ahụhụ nke atọ: anwụnta (16-19)

  • Ahụhụ nke anọ: odudu (20-32)

    • A gaghị enwe odudu na Goshen (22, 23)

8  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gakwuru Fero, sị ya, ‘Jehova kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.*+  Ọ bụrụ na ị ka na-ajụ ịhapụ ha, m ga-eme ka mbàrá ju n’ala gị niile.+  Mbàrá ga-ejukwa n’Osimiri Naịl. Ha ga-apụtakwa banye n’ụlọ gị, n’ime ụlọ ị na-edina, n’elu àkwà* gị, n’ụlọ ndị na-ejere gị ozi nakwa n’ebe ndị obodo gị nọ, n’ime ekwú gị, nakwa n’ihe* i ji agwọ ntụ ọka.+  Mbàrá ndị ahụ ga-amagoro n’ahụ́ gị, n’ahụ́ ndị obodo gị, nakwa n’ahụ́ ndị niile na-ejere gị ozi.”’”  Jehova mechara sị Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Setịa mkpara i ji n’aka n’elu osimiri niile, n’elu ọwa mmiri niile si n’Osimiri Naịl, nakwa n’elu ọdọ mmiri niile, ka mbàrá wee ju n’Ijipt.’”  Erọn wee setịa aka ya n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt, mbàrá malitere ịpụta ma ju n’Ijipt.  Ma, ndị dibịa anwansi ji anwansi* ha mee otu ihe ahụ, ha mekwara ka mbàrá pụta n’Ijipt.+  Fero kpọziri Mosis na Erọn, sị ha: “Rịọrọnụ m Jehova arịrịọ ka o wepụrụ mụ na ndị obodo m mbàrá ndị a,+ n’ihi na m chọrọ ịhapụ ndị Izrel ka ha gaa chụọrọ Jehova àjà.”  Mosis wee sị Fero: “Jiri aka gị kwuo mgbe m ga-arịọrọ gị arịrịọ ka e wepụrụ gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị mbàrá ndị ahụ, wepụkwa ha n’ụlọ gị niile. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọ.” 10  Fero sịrị: “Echi.” Mosis wee sị: “Ka ọ dị otú i kwuru, ka i wee mara na e nweghị onye ọzọ dị ka Jehova bụ́ Chineke anyị.+ 11  Mbàrá ndị ahụ ga-apụ n’ahụ́ gị, n’ụlọ gị, n’ahụ́ ndị na-ejere gị ozi, nakwa n’ahụ́ ndị obodo gị. Naanị n’Osimiri Naịl ka ha ga-afọ.”+ 12  Mosis na Erọn wee hapụ Fero pụọ. Mosis rịọrọ Jehova arịrịọ maka mbàrá ndị ahụ o ji na-ata Fero ahụhụ.+ 13  Jehova wee mee ihe Mosis rịọrọ ya. Mbàrá ndị ahụ malitere ịnwụ n’ụlọ ha, n’ogige ụlọ ha, nakwa n’ala ha. 14  Ha nọ na-ekpokọta ha n’ikpo n’ikpo. Ala ahụ wee malite isi ísì. 15  Mgbe Fero hụrụ na ha enwerela onwe ha, ọ kpọchiri obi ya+ ma jụ ige ha ntị, otú Jehova kwuru. 16  Jehova wee sị Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Setịa mkpara gị kụọ n’ájá dị n’ala. Ọ ga-aghọ anwụnta* n’Ijipt niile.’” 17  Ha wee mee ya. Erọn setịrị mkpara o ji n’aka kụọ n’ájá dị n’ala, anwụnta wee ju n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa n’ahụ́ ụmụ anụmanụ. Ájá niile dị n’ala ghọrọ anwụnta n’Ijipt niile.+ 18  Ndị dibịa anwansi gbalịrị ka ha jiri anwansi* ha mee otu ihe ahụ, ka anwụnta pụta,+ ma ha emelighị ya. Anwụnta ndị ahụ wee ju n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa n’ahụ́ ụmụ anụmanụ. 19  Ndị dibịa anwansi ahụ wee sị Fero: “Aka Chineke dị n’ihe a!”*+ Ma obi Fero ka kpọchiri akpọchi, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru. 20  Jehova gwaziri Mosis, sị: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero. Lee, ọ ga-apụta ka ọ gaa na mmiri. Ị ga-asị ya, ‘Jehova kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.* 21  Ma, ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m, m ga-ezitere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị odudu,* zitekwa ya n’ụlọ gị niile. Odudu ga-eju n’ụlọ ndị Ijipt, kpuchiekwa ala niile ha* bi. 22  N’ụbọchị ahụ, m ga-eme ka Goshen, bụ́ ebe ndị m bi, dị iche. E nweghị odudu ga-adị na ya.+ Ị ga-ejikwa ya mata na mụnwa, bụ́ Jehova, nọ n’ala a.+ 23  M ga-emekwa ka ndị m dị iche ná ndị gị. Echi ka ihe àmà a ga-eme.”’” 24  Jehova wee mee ya. Odudu malitere ife n’ìgwè n’ìgwè na-efeba n’ụlọ Fero nakwa n’ụlọ ndị na-ejere ya ozi nakwa n’Ijipt niile.+ Odudu ndị ahụ bibiri ala ahụ.+ 25  N’ikpeazụ, Fero kpọrọ Mosis na Erọn, sị ha: “Gaanụ chụọrọ Chineke unu àjà n’ala a.” 26  Ma Mosis sịrị: “Ọ dịghị mma ime otú ahụ n’ihi na ihe anyị ga-eji achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà agaghị adị ndị Ijipt mma.+ Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe na-adịghị ndị Ijipt mma chụọ àjà n’ihu ha, ọ̀ bụ na ha agaghị atụ anyị nkume? 27  Anyị ga-aga n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru. Ọ bụ n’ebe ahụ ka anyị ga-achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà, otú ọ gwara anyị.”+ 28  Fero wee sị: “M ga-ahapụ unu ka unu gaa chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà n’ala ịkpa. Ma, unu agakwala ebe dị ezigbo anya. Rịọrọnụ m Chineke arịrịọ.”+ 29  Mosis wee sị: “Ahapụla m gị pụwa, m ga-arịọkwara gị Jehova arịrịọ. Echi, odudu ndị a ga-ahapụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị obodo ya. Ma, ka Fero ghara ịghọ anyị aghụghọ* ọzọ, ghara ikwe ka ndị anyị gaa chụọrọ Jehova àjà.”+ 30  Mosis hapụziri Fero gaa rịọ Jehova arịrịọ.+ 31  Jehova wee mee ihe Mosis rịọrọ ya. Odudu ndị ahụ hapụrụ Fero na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị obodo ya. Otu afọghị. 32  Ma Fero kpọchiri obi ya ọzọ. Ọ hapụghị ndị Izrel ka ha gawa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “jeere m ozi.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “n’efere.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ihe a bụ ụdị obere ahụhụ na-adị n’Ijipt nke yiri anwụnta.
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “Ọ bụ mkpịsị aka Chineke!”
Na Hibru, “jeere m ozi.”
Ọ bụ ụdị ijiji na-ata ata.
Ya bụ, ndị Ijipt.
Ma ọ bụ “iji anyị gwuo egwu.”