Ọpụpụ 28:1-43
28 “Ị ga-esi ná ndị Izrel kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị nwoke, ka ha bụrụ ndị nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ ya na Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.+
2 Ị ga-akpara Erọn nwanne gị uwe nsọ ndị ga-achọ ya mma ma mee ka o nwee ùgwù.+
3 Ị ga-agwa ndị niile nwere nkà,* ya bụ, ndị m nyere amamihe,*+ okwu. Ha ga-akpara Erọn uwe ndị ga-egosi na e doola ya nsọ, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m.
4 “Ọ bụ uwe ndị a ka ha ga-akpa: akpa a na-anya n’obi,+ efọd,+ uwe na-enweghị aka,+ uwe mwụda a kpara n’ụdị pụrụ iche,* ákwà isi,+ na ákwà a na-eke n’úkwù.+ Ha ga-akpara Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe nsọ ndị a, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.
5 Ndị ọrụ nwere nkà ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin kpaa ha.
6 “Ha ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa efọd ahụ, a ga-akpakwa ihe ịchọ mma na ya.+
7 Ọ ga-enwe ubu ihu na azụ bụ́ ndị a ga-ejikọta n’ebe elu ya abụọ.
8 A ga-eji ihe ndị e ji kpaa efọd ahụ kpaa eriri*+ ga-adị na ya, nke a ga-eji na-ekegide ya, ya bụ, ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa.
9 “Ị ga-ewere nkume ọnịks+ abụọ ma denye aha ụmụ Izrel* na ha,+
10 aha isii n’otu nkume nakwa aha isii fọrọ afọ na nkume nke ọzọ. Ị ga-edenye aha ha n’usoro e si mụọ ha.
11 Omenkà nke na-atụ́ ihe na nkume ga-edenye aha ụmụ Izrel* na nkume abụọ ahụ otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+ Ị ga-akwụnyezi ha n’ihe mbadamba abụọ e ji ọlaedo kpụọ.
12 Ị ga-etinye nkume abụọ ahụ n’ubu efọd ahụ ka ha bụrụ nkume ncheta maka ndị Izrel.+ Erọn ga-ebu aha ha n’ihu Jehova n’ubu ya abụọ ka ọ bụrụ ihe ncheta.
13 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe mbadamba abụọ,
14 jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè abụọ a hịkọrọ ahịkọ ka eriri.+ Ị ga-ekegide ụdọ ígwè ndị ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ.+
15 “Hụ na onye na-akpa ihe n’ákwà kpara akpa a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe.+ A ga-eme ya ka ọ dị ka efọd ahụ. A ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+
16 Ọ ga-enwe akụkụ anọ há nhata ma a pịajie ya abụọ. Ọ ga-adịkwa otu ntụ ọbụ aka* n’ogologo na otu ntụ ọbụ aka n’obosara.
17 Ị ga-akwụnye nkume dị iche iche na ya. Ha ga-adị ahịrị nkume anọ. Ahịrị nke mbụ ga-abụ rubi, topaz, na emerad.
18 Ahịrị nke abụọ ga-abụ tọkwọiz, safaya, na jaspa.
19 Ahịrị nke atọ ga-abụ nkume leshem,* aget, na ametist.
20 Ahịrị nke anọ ga-abụ krisolaịt, ọnịks, na jed. A ga-akwụnye ha n’ihe mbadamba ndị a ga-eji ọlaedo rụọ.
21 Nkume ndị ahụ ga-adị ole aha ụmụ Izrel* dị, ya bụ, iri na abụọ. A ga-edenye aha nke ọ bụla otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara. Aha nke ọ bụla ga-anọchi anya otu ebo n’ime ebo iri na abụọ ahụ.
22 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè a hịkọrọ ahịkọ ka eriri n’elu akpa ahụ a na-anya n’obi.+
23 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri n’akpa ahụ a na-anya n’obi ma tinye ihe abụọ ahụ dị okirikiri n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ.
24 Ị ga-aganye ụdọ ígwè abụọ ahụ e ji ọlaedo mee n’ihe abụọ ahụ dị okirikiri ga-adị n’akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ.
25 Ị ga-aganye isi abụọ nke ụdọ ígwè abụọ ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ, ị ga-ekegidekwa ha n’ubu efọd ahụ, n’ebe ihu ya.
26 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ dị okirikiri ma kwụnye ha n’ime akpa ahụ a na-anya n’obi, n’isi isi ya abụọ, ka ha chee efọd ahụ ihu.+
27 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe abụọ ọzọ dị okirikiri n’ihu efọd ahụ. Ọ ga-adị n’ebe mgbada efọd ahụ, n’akụkụ ebe a ga-ejikọta ya, n’elu ebe eriri* efọd ahụ ga-adị.+
28 A ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kekọta ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị n’akpa ahụ a na-anya n’obi na ihe ndị ahụ dị okirikiri ga-adị n’efọd ahụ. Ọ ga-eme ka akpa ahụ a na-anya n’obi dịrị n’elu efọd ahụ, n’elu ebe eriri* efọd ahụ ga-adị.
29 “Mgbe Erọn na-abata n’Ebe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ Izrel* n’obi ya n’akpa ahụ a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe, ka ọ bụrụ ihe ncheta mgbe niile n’ihu Jehova.
30 Ị ga-etinye Yurim na Tọmịm*+ n’akpa ahụ a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe. Ha ga na-adị n’elu obi Erọn mgbe ọ na-abata n’ihu Jehova. Erọn ga-ebukwa ihe e ji ekpe ikpe gbasara ndị Izrel n’obi ya n’ihu Jehova mgbe niile.
31 “Ị ga-eji naanị eri na-acha anụnụ anụnụ kpaa uwe na-enweghị aka nke efọd ahụ ga-adị n’elu ya.+
32 Ọ ga-enwe oghere n’etiti ebe elu ya.* Onye na-akpa ákwà ga-akpa ọnụ ọnụ oghere ya ahụ akpa gburugburu. Ọ ga-adị ka oghere na-adị n’uwe agha, ka ọ ghara ịdọka adọka.
33 Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, na eri na-acha uhie uhie kpaa ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet gburugburu ọnụ ọnụ ala ya, tinyekwa mgbịrịgba ọlaedo n’agbata ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ osisi pomigranet gbaa gburugburu.
34 I tinye otu mgbịrịgba ọlaedo, gị etinye otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet. I tinye otu mgbịrịgba ọlaedo ọzọ, gị etinyekwa otu ihe yiri mkpụrụ osisi pomigranet. Ị ga-eme ya otú ahụ gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka.
35 Erọn ga-eyi ya mgbe ọ na-eje ozi. A ga na-anụkwa ụda mgbịrịgba ndị ahụ mgbe ọ na-abanye n’ụlọikwuu n’ihu Jehova nakwa mgbe ọ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.+
36 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke ma dee ‘Jehova bụ Onye dị nsọ’ na ya. A ga-edenye ya otú e si akanye akara na mgbaaka e ji aka ihe akara.+
37 Ị ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ kegide ya n’ákwà isi ahụ.+ Ọ ga-adị n’ihu ákwà isi ahụ.
38 Ọ ga-adị n’egedege ihu Erọn. Mgbe mmadụ mehiere n’ihe gbasara ihe ndị dị nsọ,+ ya bụ, ihe ndị Izrel mere ka ọ dị nsọ mgbe ha wetara ha ka ha bụrụ onyinye dị nsọ, mmehie ahụ ga-adị n’isi Erọn. Ihe mbadamba ahụ ga-adị n’egedege ihu ya mgbe niile, ka Jehova wee nabata ndị ya.
39 “Ị ga-eji ezigbo eri linin kpaa uwe mwụda ahụ pụrụ iche,* jiri ezigbo eri linin kpaa ákwà isi, kpaakwa ákwà a na-eke n’úkwù.+
40 “Ị ga-emere ụmụ Erọn ndị nwoke uwe mwụda, ákwà a na-eke n’úkwù, na ákwà isi,+ bụ́ ndị ga-achọ ha mma ma mee ka ha nwee ùgwù.+
41 Ị ga-eyiwe Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe ndị ahụ. Ị ga-ete ha mmanụ,+ mee ha ndị nchụàjà*+ ma doo ha nsọ, ha ga-abụkwa ndị nchụàjà m.
42 Ị ga-eji ákwà linin kpaara ha uwe úkwù* iji kpuchie ọtọ ha.+ Ọ ga-esi n’úkwù ruo n’apata ụkwụ.
43 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi ha mgbe ha na-abata n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha na-abịa n’ebe ịchụàjà ka ha jee ozi n’ebe nsọ, ka ikpe ghara ịma ha, ha ewee nwụọ. Ọ bụ iwu ya na ụmụ* ya ndị ga-anọchi ya ga na-edebe mgbe niile.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ndị niile obi ha ma ihe.”
^ Na Hibru, “mmụọ amamihe.”
^ Ma ọ bụ “ájị̀.”
^ Ya bụ, ụmụ Jekọb.
^ Ya bụ, ụmụ Jekọb.
^ Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka, ihe dị ka sentimita 22.2 (inch 8.75). Gụọ B14.
^ Ọ bụ nkume dị oké ọnụ. A maghị nkume nke ọ bụ abụ. O nwere ike ịbụ amba, hayasịnt, opal, ma ọ bụ tọmalin.
^ Ya bụ, ụmụ Jekọb.
^ Ma ọ bụ “ájị̀.”
^ Ma ọ bụ “ájị̀.”
^ Ya bụ, ụmụ Jekọb.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ebe a ga-esi na-etife isi.”
^ Ma ọ bụ “nye ha ikike.”
^ Ma ọ bụ “uwe ime.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”

