Ọnụ Ọgụgụ 36:1-13
-
Iwu e nyere gbasara ndị ga-alụ ụmụ nwaanyị e kenyere ala nna ha (1-13)
36 Ndị isi ezinụlọ ụmụ Gilied nwa Mekia,+ nwa nwa Manase, bụ́ ndị si n’ezinụlọ ụmụ Josef, bịara gwa Mosis na ndị isi, ya bụ, ndị isi ọnụmara dị iche iche e nwere n’Izrel okwu.
2 Ha sịrị: “Onyenwe anyị, Jehova nyere gị iwu ka i fee nza nye ndị Izrel ala+ ha ga-eketa. Jehova nyekwara gịnwa bụ́ onyenwe anyị iwu ka o nye ụmụ nwaanyị Zelofehad mụrụ ala nwanne anyị nwoke, bụ́ Zelofehad, kwesịrị iketa.+
3 Ọ bụrụ na ụmụ nwoke ndị si n’ebo ọzọ alụọ ụmụ nwaanyị a, ala ụmụ nwaanyị a ga-eketa n’ala nna anyị hà ga-abụzi nke ebo ụmụ nwoke lụrụ ha si. Ala ụmụ nwaanyị a agaghịzi eso n’ala e fere nza kenye anyị.
4 Mgbe afọ Nnwere Onwe*+ ndị Izrel ga-eru, ala ụmụ nwaanyị a ga-eketa ga-abụzi nke ebo ebe ha lụrụ di. Ihe a ga-eme ka ala ebo nna anyị hà ga-eketa bụrụzie nke ndị ọzọ.”
5 Mosis wee gwa ndị Izrel ihe Jehova nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Ihe ebo ụmụ Josef kwuru bụ eziokwu.
6 Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu ka ụmụ Zelofehad mee: ‘Ha nwere ike ịlụ onye ọ bụla ha chọrọ ịlụ. Ma, ọ ga-abụ ndị si n’ezinụlọ e nwere n’ebo nna ha ka ha ga-alụ.
7 E nweghị ala ndị Izrel nke ga-esi n’otu ebo gafeere ebo ọzọ n’ihi na ndị Izrel ekwesịghị ịhapụ ala ebo ndị nna nna ha ketara.
8 Nwaanyị ọ bụla ketara ala n’ebo ndị e nwere n’Izrel kwesịrị ịlụ onye si n’ezinụlọ ebo nna ya,+ ka ndị Izrel ghara ịhapụ ala ndị nna nna ha ketara.
9 E nweghị ala ga-esi n’otu ebo gafeere ebo ọzọ, n’ihi na ebo nke ọ bụla e nwere n’Izrel ekwesịghị ịhapụ ala o ketara.’”
10 Ụmụ nwaanyị Zelofehad mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+
11 Mala, Teza, Họgla, Milka, na Noa, bụ́ ụmụ Zelofehad,+ lụrụ ụmụ ụmụnne nna ha.
12 Ha lụrụ ụmụ nwoke ndị si n’ezinụlọ ụmụ Manase nwa Josef ka ala ha ketara wee dịgide n’ebo ezinụlọ nna ha.
13 Ihe ndị a bụ ihe ndị Jehova kpebiri na iwu ndị o si n’ọnụ Mosis nye ndị Izrel n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “afọ Jubili.”