Ọnụ Ọgụgụ 35:1-34
35 Jehova wee gwa Mosis okwu n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan,+ n’ebe dị nso na Jeriko, sị:
2 “Gwa ndị Izrel ka ha si n’ala ha ga-eketa nye ndị Livaị obodo ndị ha ga-ebi.+ Ha ga-enyekwa ndị Livaị ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa bụ́ ndị ga-agba obodo ndị ahụ gburugburu.+
3 Ha ga-ebi n’obodo ndị ahụ. Ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa ga-abụ maka anụ ụlọ ha, maka ihe ndị ha ji elekọta ha, nakwa maka anụmanụ ha ndị ọzọ niile.
4 Ala unu ga-enye ndị Livaị ka anụmanụ ha na-ata ahịhịa ga-adị otu puku (1,000) kubit* malite ná mgbidi obodo nke ọ bụla gazuo ya gburugburu.
5 Obodo nke ọ bụla ga-adị n’etiti, unu atụọ ala dị puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ndịda ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọdịda anyanwụ ya, nakwa puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ugwu ya. Ala ndị ahụ ga-abụ ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa n’obodo ha dị iche iche.
6 “Obodo ndị unu ga-enye ndị Livaị ga-abụ obodo mgbaba isii,+ ndị unu ga-enye ha ka onye gburu mmadụ gbaga na ha.+ Unu ga-enyekwa ha obodo iri anọ na abụọ ọzọ.
7 Obodo niile unu ga-enye ndị Livaị ga-adị iri anọ na asatọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+
8 Unu ga-esi n’ala ndị Izrel ga-eketa nye ha obodo ndị ahụ.+ Unu ga-anara ndị dị ọtụtụ ọtụtụ obodo, narakwa ndị dị ole na ole obodo ole na ole.+ Otú ala ebo nke ọ bụla ga-eketa ga-aha ka ha ga-eji mara obodo ole ha ga-enye ndị Livaị.”
9 Jehova gwakwara Mosis, sị:
10 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Unu ga-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye n’ala Kenan.+
11 Họrọnụ obodo ndị ga-adịrị unu mfe iru ka ha bụrụ obodo mgbaba, ebe onye gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+
12 Obodo ndị ahụ ga-abụrụ unu ebe onye gburu mmadụ ga-agbaga, ka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ ghara igbu onye ahụ ruo mgbe nzukọ unu ga-ekpe ya ikpe.+
13 Ọ bụ uru obodo mgbaba isii ahụ unu ga-ahọrọ ga-abara unu.
14 Unu ga-ahọrọ obodo atọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan,+ họrọkwa obodo atọ n’ala Kenan+ ka ha bụrụ obodo mgbaba.
15 Obodo isii ndị a ga-abụrụ ndị Izrel, onye mbịarambịa,+ na onye binyeere ha ebe mgbaba, ebe onye ọ bụla gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+
16 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kụrụ ya ígwè, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.+
17 Ọ bụrụ na ọ tụrụ ya nkume nke nwere ike igbu mmadụ, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.
18 Ọ bụrụ osisi nke nwere ike igbu mmadụ ka ọ kụrụ ya, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.
19 “‘Ọ bụ onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ.* Ọ bụ yanwa ga-egbu ya ma o zute ya.
20 Ọ bụrụ na ọ kwara ya aka maka na ọ kpọrọ ya asị ma ọ bụkwanụ tụọ ya ihe maka na o buuru ya iwe n’obi, ya anwụọ,+
21 ma ọ bụ, ọ bụrụ na o ji aka tigbuo ya maka na ọ kpọrọ ya asị, a ga-egburịrị onye ahụ tigburu ya. O gburu mmadụ.* Onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ ma o zute ya.
22 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kwara ya aka na mberede, ọ bụghịkwa maka na ọ kpọrọ ya asị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ tụrụ ya ihe n’eburughị ya iwe n’obi,+
23 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ hụghị ya mgbe ọ tụrụ nkume, nkume ahụ atụgbuo onye ahụ, ma ọ bụghị na ọ bụ onye iro ya ma ọ bụ na ọ chọrọ imerụ ya ahụ́,
24 nzukọ unu ga-esoro ntụziaka ndị a kpeere onye ahụ gburu mmadụ na onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ikpe.+
25 Nzukọ unu ga-anapụta onye ahụ gburu mmadụ n’aka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ma kpọghachi ya n’obodo mgbaba ọ gbagara. Ọ ga-ebi ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà e tere mmanụ nsọ nwụrụ.+
26 “‘Ma ọ bụrụ na onye ahụ gburu mmadụ agafee ókè obodo mgbaba ọ gbagara,
27 onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ewee hụ onye ahụ gburu mmadụ n’ebe na-esoghị n’obodo ahụ ọ gbagara wee gbuo ya, ikpe ọbara amaghị ya.
28 N’ihi na onye ahụ gburu mmadụ ga-ebirịrị n’obodo ọ gbagara ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. Ma nnukwu onye nchụàjà nwụọ, o nwere ike ịlaghachi n’ala ya.+
29 Ọ bụ iwu ndị a ka unu ga-eji na-ekpe ikpe n’ọgbọ unu niile n’ebe niile unu ga-ebi.
30 “‘A ga-egbu onye ọ bụla gburu mmadụ*+ ma ndị akaebe gbaa akaebe na o gburu mmadụ.+ Ma, a gaghị egbu mmadụ* ma ọ bụrụ naanị otu onye gbara akaebe.
31 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gburu mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ kwesịrị ịnwụ, n’ihi na a ga-egburịrị ya.+
32 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gbagara n’obodo mgbaba, ka e wee hapụ ya ka ọ gaa biri n’ala ya tupu nnukwu onye nchụàjà anwụọ.
33 “‘Unu emerụla ala unu bi na ya n’ihi na igbu mmadụ* na-emerụ ala.+ E wepụ igbu onye gburu mmadụ,* e nweghị otú ọzọ e nwere ike isi mee ka ala e merụrụ dị ọcha.+
34 Unu emerụla ala unu bi na ya, bụ́ ebe m bi; n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, binyeere ndị Izrel.’”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Na Hibru, “n’ihi na ọbara.”
^ Na Hibru, “ịwụfu ọbara onye wụfuru ọbara.”