Ọnụ Ọgụgụ 29:1-40
29 “‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ Ọ bụ ụbọchị unu ga-afụ opi.+
2 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.
3 Unu ga-achụkọta ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ,
4 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ.
5 Unu ga-achụkwa otu nwa mkpi n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie.
6 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka ya na ya na-agakọ,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ.+ Unu ga-achụkọta ha na àjà mmanya ha+ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha, ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.
7 “‘N’abalị iri n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu arụla ọrụ ọ bụla.+
8 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
9 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ,
10 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ.
11 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.
12 “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+
13 Unu ga-eji oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
14 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi nke ọ bụla n’ime oké ehi iri na atọ ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka nke ọ bụla n’ime ebule abụọ ahụ,
15 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule iri na anọ ahụ.
16 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
17 “‘N’ụbọchị nke abụọ, unu ga-eji oké ehi iri na abụọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
18 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
19 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.+
20 “‘N’ụbọchị nke atọ, unu ga-eji oké ehi iri na otu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
21 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
22 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
23 “‘N’ụbọchị nke anọ, unu ga-eji oké ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
24 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
25 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
26 “‘N’ụbọchị nke ise, unu ga-eji oké ehi itoolu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
27 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
28 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
29 “‘N’ụbọchị nke isii, unu ga-eji oké ehi asatọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
30 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
31 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ya na-agakọ.+
32 “‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-eji oké ehi asaa, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
33 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
34 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
35 “‘N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe nzukọ pụrụ iche. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+
36 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
37 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha.
38 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
39 “‘Unu ga na-achụrụ Jehova ihe ndị a n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu na-eme n’oge dị iche iche,+ ha na onyinye ndị unu kwere ná nkwa+ na onyinye ndị si unu n’obi,+ ka ha bụrụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà ọka unu+ na àjà mmanya unu+ na àjà udo unu.’”+
40 Mosis gwara ndị Izrel ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ “Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

