Ọnụ Ọgụgụ 26:1-65
-
Nke ugboro abụọ a gụrụ ndị Izrel ọnụ n’ebo n’ebo (1-65)
26 Mgbe ọrịa ọjọọ ahụ kwụsịrị ịrịa ha,+ Jehova gwara Mosis na Elieza nwa Erọn onye nchụàjà, sị:
2 “Gụọnụ nzukọ Izrel niile ọnụ n’ọnụmara n’ọnụmara, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe. Gụọnụ ndị niile nwere ike ịga agha n’Izrel ọnụ.”+
3 Mosis na Elieza+ onye nchụàjà wee gwa ha okwu n’ọzara Moab,+ n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko,+ sị:
4 “Gụọnụ ha ọnụ malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.”+
Ndị a bụ ndị Izrel ndị si n’Ijipt pụta:
5 Ruben,+ ọkpara Izrel; ndị a bụ ụmụ Ruben ndị nwoke:+ Henọk mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Henọk; Palu mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Palu;
6 Hezrọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; Kamaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Kamaị.
7 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ruben. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na atọ, narị asaa na iri atọ (43,730).+
8 Nwa Palu bụ Elayab.
9 Ụmụ Elayab ndị nwoke bụ Nemuel, Detan, na Abaịram. Detan na Abaịram a bụ ndị e si ná nzukọ Izrel họrọ, ndị ha na ndị òtù Kora+ mara Mosis+ na Erọn aka, mgbe ha mara Jehova aka.+
10 Ala wee meghee* loo ha. Ma Kora na ndị na-akwado ya nwụrụ mgbe ọkụ regburu narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250).+ Ha wee bụrụ ihe atụ e ji adọ ndị ọzọ aka ná ntị.+
11 Ma ụmụ Kora anwụghị.+
12 Ndị a bụ ụmụ Simiọn ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Nemuel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Nemuel; Jemin mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jemin; Jekin mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jekin;
13 Zira mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zira; Sheọl mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Sheọl.
14 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Simiọn: puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị abụọ (22,200).+
15 Ndị a bụ ụmụ Gad ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Zifọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zifọn; Hagaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hagaị; Shunaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shunaị;
16 Ọznaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ọznaị; Iraị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Iraị;
17 Arọd mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Arọd; Arilaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Arilaị.
18 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Gad. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na narị ise (40,500).+
19 Ụmụ Juda ndị nwoke+ bụ Ea na Onan.+ Ma, Ea na Onan nwụrụ na Kenan.+
20 Ndị a bụ ụmụ Juda ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shila+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shila; Pirez+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Pirez; Zira+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zira.
21 Ndị a bụ ụmụ Pirez ndị nwoke: Hezrọn+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; Hemọl+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hemọl.
22 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Juda. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri asaa na isii na narị ise (76,500).+
23 Ndị a bụ ụmụ Ịsaka ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Tola+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Tola; Puva mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Puna;
24 Jeshọb mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jeshọb; Shimrọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shimrọn.
25 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ịsaka. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri isii na anọ na narị atọ (64,300).+
26 Ndị a bụ ụmụ Zebulọn ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Sired mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Sired; Ilọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ịlọn; Jaliel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jaliel.
27 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Zebulọn. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri isii na narị ise (60,500).+
28 Ndị a bụ ụmụ Josef ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Manase na Ifrem.+
29 Ndị a bụ ụmụ Manase ndị nwoke:+ Mekia+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Mekia. Mekia wee mụọ Gilied.+ Ọ bụ Gilied mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Gilied.
30 Ndị a bụ ụmụ Gilied ndị nwoke: lza mụtara ndị ezinụlọ ụmụ lza; Hilek mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hilek;
31 Asriel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Asriel; Shikem mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shikem;
32 Shemaịda mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shemaịda; Hifa mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hifa.
33 Zelofehad nwa Hifa amụtaghị ụmụ nwoke. Ọ mụrụ naanị ụmụ nwaanyị.+ Aha ụmụ Zelofehad+ bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza.
34 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Manase. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri ise na abụọ na narị asaa (52,700).+
35 Ndị a bụ ụmụ Ifrem ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shutela+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shutela; Bika mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Bika; Tehan mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Tehan.
36 Ndị a bụ ụmụ Shutela ndị nwoke: Iran mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Iran.
37 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ifrem. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri atọ na abụọ na narị ise (32,500).+ Ọ bụ ha bụ ụmụ Josef ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
38 Ndị a bụ ụmụ Benjamin ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Bila+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Bila; Ashbel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ashbel; Ahaịram mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ahaịram;
39 Shefufam mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shufam; Hufam mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hufam.
40 Ụmụ nwoke ndị Bila mụrụ bụ Ad na Neeman:+ Ad mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ad; Neeman mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Neeman.
41 Ọ bụ ha bụ ụmụ Benjamin ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na ise na narị isii (45,600).+
42 Ndị a bụ ụmụ Dan ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shuham mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shuham. Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Dan, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
43 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ ụmụ Shuham niile dị puku iri isii na anọ na narị anọ (64,400).+
44 Ndị a bụ ụmụ Asha ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Imna mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Imna; Ishvaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ishvaị; Beraya mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Beraya;
45 ndị a bụ ụmụ Beraya ndị nwoke: Hiba mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hiba; Malkiel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Malkiel.
46 Aha nwa nwaanyị Asha mụrụ bụ Sira.
47 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Asha. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400).+
48 Ndị a bụ ụmụ Naftalaị ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Jaziel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jaziel; Gunaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Gunaị;
49 Jiza mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jiza; Shilem mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shilem.
50 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Naftalaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na ise na narị anọ (45,400).+
51 Ndị Izrel niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku mmadụ isii na otu, narị mmadụ asaa na iri atọ (601,730).+
52 Jehova gwaziri Mosis, sị:
53 “Ị ga-ekere ndị a ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha. Ị ga-esoro otú e si dee aha ha* keere ha ya.+
54 Ị ga-ekenye ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu.+ Ọ bụ mmadụ ole e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị nke ọ bụla ka a ga-eji ama ala a ga-ekenye ha.
55 Ma a ga-efe nza mgbe a na-eke ala ahụ.+ A ga-ekenye ha ala n’ebe e kenyere ndị nna ha ala n’ebo n’ebo.
56 A ga-efe nza ka a mata ala a ga-ekenye ndị nke ọ bụla, ma ndị nke dị ọtụtụ ma ndị nke na-adịghị ọtụtụ.”
57 Ndị a bụ ndị Livaị e debara aha ha n’akwụkwọ,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Geshọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn; Kohat+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Kohat; Meraraị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Meraraị.
58 Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Livaị: ezinụlọ ụmụ Libnaị,+ ezinụlọ ụmụ Hebrọn,+ ezinụlọ ụmụ Malaị,+ ezinụlọ ụmụ Mushaị,+ ezinụlọ ụmụ Kora.+
Kohat wee mụọ Amram.+
59 Aha nwunye Amram bụ Jokebed,+ nwa Livaị, onye nwunye Livaị mụụrụ Livaị n’Ijipt. Jokebed mụụrụ Amram Erọn na Mosis nakwa Miriam+ nwanne ha nwaanyị.
60 E wee mụọrọ Erọn Nedab, Abaịhu, Elieza, na Ịtama.+
61 Ma Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihi na ha chụrụ àjà* iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova.+
62 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ malite n’ụmụ nwoke niile ndị dị otu ọnwa gbagowe dị puku iri abụọ na puku atọ (23,000).+ E debaghị aha ha n’akwụkwọ mgbe e debara aha ndị Izrel ndị ọzọ+ maka na a gaghị ekenye ha ala otú a ga-ekenye ndị Izrel ndị ọzọ.+
63 Ọ bụ ndị a ka Mosis na Elieza onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ mgbe ha na-edeba aha ndị Izrel n’akwụkwọ n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.
64 Ma n’ime ndị a Mosis na Erọn onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ, e nweghị onye n’ime ha so ná ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị.+
65 N’ihi na Jehova kwuru banyere ndị ahụ, sị: “Ha ga-anwụrịrị n’ala ịkpa.”+ N’ihi ya, e nweghị nwoke ọ bụla fọrọ n’ime ha ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
^ Ma ọ bụ “ga-esoro aha mmadụ ole e depụtara.”
^ Na Hibru, “chere ọkụ.”