Ọnụ Ọgụgụ 25:1-18
25 Mgbe ndị Izrel bi na Shitim,+ ha na ụmụ nwaanyị Moab malitere ịkwa iko.+
2 Ụmụ nwaanyị ahụ kpọrọ ndị Izrel ka ha soro ha gaa chụọrọ chi ha àjà.+ Ndị Izrel wee malite iri ihe ha ji chụọ àjà ma na-akpọrọ chi ha isiala.+
3 Ndị Izrel sooro ha fee Bel nke Piọ.+ Jehova wee wesa ndị Izrel ezigbo iwe.
4 Jehova gwara Mosis, sị: “Jide ndị niile bụ́ ndị isi ndị ọjọọ a, gbuo ha ma kwụwa ozu ha n’ihu Jehova ka mmadụ niile hụ ha,* ka nnukwu iwe Jehova na-ewesa ndị Izrel dajụọ.”
5 Mosis wee sị ndị ikpe Izrel:+ “Onye ọ bụla n’ime unu gbuo ụmụ nwoke si n’ebo ya bụ́ ndị so fee Bel nke Piọ.”+
6 Ma n’oge ahụ, otu nwoke Izrel kpọọrọ otu nwaanyị Midian na-abata n’ebe ụmụnne ya nọ,+ n’ihu Mosis nakwa n’ihu nzukọ Izrel niile, mgbe ndị Izrel nọ na-ebe ákwá n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
7 Mgbe Finihas+ nwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà hụrụ ya, o si n’ebe ahụ ndị Izrel zụkọrọ bilie ozugbo ma were ube.
8 O sochiri nwoke Izrel ahụ azụ ma banye n’ụlọikwuu ha banyere, magbuo ha abụọ. Ọ mabara nwoke Izrel ahụ na nwaanyị ahụ ube n’ahụ́, ube ahụ amaba n’ihe nke nwaanyị ahụ ji bụrụ nwaanyị. Ọrịa ọjọọ nọ na-egbu ndị Izrel wee kwụsị.+
9 Ndị ọrịa ọjọọ ahụ gburu dị puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000).+
10 Jehova gwaziri Mosis, sị:
11 “Finihas+ nwa Elieza, nwa nwa Erọn onye nchụàjà, emeela ka iwe m na-ewesa ndị Izrel dajụọ n’ihi na o kweghị ka ha hapụ m fewe chi ọzọ.+ Ọ bụ ya mere na ebibighị m ndị Izrel n’agbanyeghị na m chọrọ ka ha na-efe naanị m.+
12 N’ihi ya, kwuo, sị, ‘Mụ na ya ga-agba ọgbụgba ndụ udo.
13 Ọ ga-abụrụ ya na ụmụ ya ndị ga-anọchi ya ọgbụgba ndụ ga-adịte aka nke ga-eme ka ha na-abụ ndị nchụàjà mgbe niile+ maka na o kweghị ka ndị Izrel hapụ Chineke ya fewe chi ọzọ.+ O kpuchikwaara ha mmehie ha.’”
14 Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwaanyị Midian bụ Zimraị nwa Selu. Ọ bụ onyeisi n’ọnụmara ụmụ Simiọn.
15 Aha nwaanyị Midian ahụ e gburu bụ Kọzbaị nwa Zọọ.+ Zọọ bụ onyeisi ọnụmara ndị si n’ụlọ nna ya n’obodo Midian.+
16 Jehova mechara gwa Mosis, sị:
17 “Mesienụ ndị Midian ike, gbuokwanụ ha,+
18 n’ihi na ha ji aghụghọ na-emesi unu ike, mee ka unu fee Bel nke Piọ,+ nakwa n’ihi ihe Kọzbaị nwanne ha nwaanyị, nwa otu onyeisi ndị Midian, mere. E gburu ya+ n’ụbọchị ahụ unu rịara ọrịa ọjọọ maka na unu fere Bel nke Piọ.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’ihu anyanwu.”