Ọnụ Ọgụgụ 23:1-30

  • Ihe mbụ Belam kwuru (1-12)

  • Ihe nke abụọ Belam kwuru (13-30)

23  Belam wee gwa Belak, sị: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a,+ kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.”  Belak mere ihe Belam kwuru ozugbo. Belak na Belam wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+  Belam gwaziri Belak, sị: “Guzo n’akụkụ àjà a i suru ọkụ, ka m gawa. Ikekwe, Jehova ga-abịakwute m. M ga-agwa gị ihe ọ bụla o gosiri m.” O wee gbagoo n’ugwu.  Chineke bịakwutere Belam,+ Belam asị ya: “M kwadebere ebe ịchụàjà asaa ndị dị n’ahịrị, m chụkwara otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.”  Jehova mere ka Belam mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị ya: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.”  O wee gaghachikwuru Belak ma hụ na ya na ndị isi Moab niile kwụ n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ.  O wee kwuo, sị:+ “Belak eze Moab si n’Eram kpọta m.+ O si n’ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ sịrị: ‘Bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ. Bịa kọchaa Izrel.’+   Olee otú m ga-esi bụọ ndị Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? Oleekwa otú m ga-esi kọchaa ndị Jehova na-akọchaghị?+   M si n’elu oké nkume hụ ha,M sikwa n’ugwu hụ ha. Ha bi naanị ha n’ebe ahụ ka otu ndị.+ Ha ewereghị onwe ha na ha so ná mba ndị ọzọ.+ 10  Ònye ga-agụtali ụmụ Jekọb ọnụ bụ́ ndị dị ọtụtụ ka ájá+Ma ọ bụdị gụtalie otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Izrel ọnụ? Ka m* nwụọ ọnwụ ndị ezi omume,Ka m nwụọkwa ka ha.” 11  Belak wee sị Belam: “Gịnị bụ ihe a i mere m? M kpọtara gị ebe a ka ị bụọ ndị iro m ọnụ, ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha.”+ 12  Ọ zara, sị: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ọ bụla Jehova mere ka m kwuo ka m ga-ekwu?”+ 13  Belak sịrị ya: “Biko, soro m gaa ebe ọzọ ị ga-anọ hụ ha. Ị ga-ahụ naanị ụfọdụ n’ime ha. Ị gaghị ahụ ha niile. Si n’ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 14  O wee kpọrọ ya gaa n’ala Zofim, n’elu Pisga,+ ma rụọ ebe ịchụàjà asaa, chụọkwa otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+ 15  Belam gwaziri Belak, sị: “Nọrọ n’ebe a n’akụkụ àjà a i suru ọkụ ka m gaa gwa Chineke okwu n’ebe ahụ.” 16  Jehova bịakwutere Belam ma mee ka ọ mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.” 17  Belam wee bịakwute Belak ma hụ na ọ nọ na-eche ya n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ. Ndị isi Moab sokwa ya nọrọ n’ebe ahụ. Belak jụrụ ya, sị: “Gịnị ka Jehova kwuru?” 18  O wee kwuo, sị:+ “Belak, bilie gee ntị. Nwa Zipọ, ṅaa m ntị. 19  Chineke abụghị mmadụ nkịtị nke na-agha ụgha.+ Ọ bụghịkwa nwa nke mmadụ nke na-agbanwe obi ya.*+ Ọ bụrụ na o kwuo ihe, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ya? Ọ bụrụ na o kwuo okwu, ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu ya?+ 20  Lee, a kpọtara m ka m gọzie ha. Ọ gọziela ha,+ agaghịkwa m agbanweli ya.+ 21  Ọ naghị ekwe ka e nwee onye ga-eji ike anwansi* mee Jekọb ihe ọ bụla. Ọ naghịkwa ekwe ka nsogbu ọ bụla bịara Izrel. Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ha.+ Ha na-ekwusikwa ike na ọ bụ eze. 22  Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ha.+ Ọ bụụrụ ha mpi atụ́.+ 23  N’ihi na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla a jụtara n’ase nke ga-ere n’isi Jekọb.+ E nweghị afa a ga-agba ga-eme Izrel ihe ọ bụla.+ E nwere ike ikwu ugbu a banyere Jekọb na Izrel, sị,‘Lee nnukwu ihe Chineke mere!’ 24  Ha bụ otu ndị nke ga-ebili ka ọdụm,Ọ ga-amalikwa ka ọdụm.+ Ọ gaghị amakpuru ma ọ bụrụ na o ribeghị anụ o gbutere,Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu.” 25  Belak sịziri Belam: “Ọ bụrụ na i nweghị ike ịbụ ha ọnụ, i kwesịghịnụ ịgọzi ha.” 26  Belam gwara Belak, sị: “Ọ̀ bụ na m gwaghị gị, sị, ‘M ga-eme ihe niile Jehova kwuru’?”+ 27  Belak sịrị Belam: “Biko, bịa ka m kpọrọ gị gaa ebe ọzọ. Ikekwe, ọ ga-adị ezi Chineke mma ka ị nọrọ ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 28  Belak wee kpọrọ Belam gaa n’elu Piọ, nke chere Jeshaịmọn* ihu.+ 29  Belam sịziri Belak: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a, kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.”+ 30  Belak mere ihe Belam kwuru. O wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-akwa ụta.”
Ma ọ bụ “majik.”
O nwere ike ịbụ, “ọzara; ala ịkpa.”