Ọnụ Ọgụgụ 22:1-41

  • Belak kpọrọ Belam ka ọ bụọ ndị Izrel ọnụ (1-21)

  • Jakị Belam kwuru okwu (22-41)

22  Ndị Izrel wee pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ọzara Moab, n’ofe Osimiri Jọdan nke ya na Jeriko chere ihu.+ 2  Belak+ nwa Zipọ hụrụ ihe niile ndị Izrel mere ndị Amọraịt. 3  Ezigbo ụjọ tụwara ndị Moab maka na ndị Izrel dị ọtụtụ. N’eziokwu, oké ụjọ bara ndị Moab ahụ́ n’ihi ndị Izrel.+ 4  Ndị Moab wee gwa ndị okenye Midian,+ sị: “Ìgwè mmadụ a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu otú ehi si atachapụ ahịhịa dị n’ọhịa.” N’oge ahụ, ọ bụ Belak nwa Zipọ bụ eze Moab. 5  O zigaara Belam nwa Biọ, onye bi n’ebe a mụrụ ya na Pitọ,+ ndị ozi. Pitọ dị n’akụkụ Osimiri Yufretis.* Ọ gwara Belam ka ọ bịakwute ya, sị: “E nwere ndị si n’Ijipt pụta. Ha ejula ụwa.+ Ha nọkwa ezigbo nso n’ala m. 6  Biko, bịa bụọrọ m ha ọnụ+ n’ihi na ha ka m ike. Ikekwe, m ga-emerili ha ma chụpụ ha n’ala a, n’ihi na o doro m anya na onye ị gọziri bụ onye a gọziri agọzi, onye ị bụrụ ọnụ bụkwa onye a bụrụ ọnụ.” 7  Ndị okenye Moab na ndị okenye Midian wee jiri ego ha ga-akwụ ka a gbaara ha afa gakwuru Belam,+ gwa ya ihe Belak kwuru. 8  O wee sị ha: “Rahụnụ ebe a n’abalị a. M ga-agwa unu ihe ọ bụla Jehova gwara m.” Ndị isi Moab wee soro Belam nọrọ n’ebe ahụ. 9  Chineke wee bịakwute Belam, sị:+ “Ole ndị bụ ndị a gị na ha nọ?” 10  Belam sịrị ezi Chineke: “Belak nwa Zipọ, eze Moab, ziteere m ozi, sị, 11  ‘Ndị si n’Ijipt apụta ejula ụwa. Bịa bụọrọ m ha ọnụ.+ Ikekwe, m ga-alụsoli ha ọgụ ma chụpụ ha.’” 12  Ma Chineke sịrị Belam: “Esola ha gaa. Abụla ndị Izrel ọnụ n’ihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”+ 13  Belam biliri n’ụtụtụ gwa ndị Belak mere ndị isi, sị: “Laanụ n’ala unu n’ihi na Jehova ekweghị ka m soro unu gaa.” 14  Ndị isi Moab lawara ma gakwuru Belak, sị: “Belam ekweghị iso anyị bịa.” 15  Ma, Belak zigara ndị isi ọzọ. Ha dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ. A na-akwanyekwara ha ùgwù karịa ndị nke mbụ. 16  Ha bịakwutere Belam, sị ya: “Belak nwa Zipọ kwuru, sị, ‘Biko, ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịbịakwute m, 17  n’ihi na m ga-akwụ gị ezigbo ụgwọ, m ga-emekwa ihe ọ bụla ị gwara m mee. Biko, bịa bụọrọ m ndị a ọnụ.’” 18  Ma Belam gwara ndị na-ejere Belak ozi, sị: “Ọ bụrụgodị na Belak enye m ụlọ ya ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m eme ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke m na-agwaghị m mee, ma ọ̀ bụ obere ihe ma ọ̀ bụ nnukwu ihe.+ 19  Ma, biko, nọrọnụ ebe a n’abalị a, ka m mara ihe ọzọ Jehova ga-agwa m.”+ 20  Chineke wee bịakwute Belam n’abalị, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe ụmụ nwoke a bịara bụ ka ha kpọọ gị, soro ha gawa. Ma, ọ bụ naanị ihe m gwara gị ka ị ga-ekwu.”+ 21  Belam biliri n’ụtụtụ kwadebe jakị* ya ma soro ndị isi Moab gawa.+ 22  Ma Chineke were ezigbo iwe maka na ọ gawara. Mmụọ ozi Jehova wee gaa guzo n’ụzọ ka o gbochie ya ịga. Belam nọ n’elu jakị ya na-aga, mmadụ abụọ ná ndị na-ejere ya ozi sokwa ya. 23  Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka guzoro n’ụzọ, ọ gbalịrị ka ọ hapụ ụzọ banye n’ọhịa. Ma Belam malitere ịkụ jakị ahụ ihe ka ọ gaghachi n’ụzọ. 24  Mmụọ ozi Jehova gaziri guzo n’ebe ụzọ dị warara, n’agbata ubi vaịn abụọ, mgbidi e ji nkume rụọ dịkwa n’akụkụ ha abụọ. 25  Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, ọ dagidere ná mgbidi ahụ ma kpagide ụkwụ Belam ná mgbidi ahụ. Belam wee kụwa ya ihe ọzọ. 26  Mmụọ ozi Jehova gafeere ọzọ gaa kwụrụ n’ebe dị warara, n’ebe a na-enweghị otú a ga-esi tụgharịa gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. 27  Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, o bu Belam makpuru ala. N’ihi ya, Belam were ezigbo iwe, jirikwa mkpara ya na-akụ jakị ahụ. 28  N’ikpeazụ, Jehova mere ka jakị ahụ kwuo okwu.*+ O wee sị Belam: “Gịnị ka m mere gị i ji kụọ m ihe ugboro atọ a?”+ 29  Belam zara jakị ahụ, sị: “Ọ bụ maka na i ji m gwuo egwu. A sị na m ji mma agha n’aka, m gaara egbu gị.” 30  Jakị ahụ sịziri Belam: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị m bụ jakị gị na-ebu gị kemgbe ndụ gị ruo taa? M̀ metụla gị otú a mbụ?” Belam zara, sị: “Mba.” 31  Jehova megheziri anya Belam,+ ya ahụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka kwụrụ n’ụzọ. Belam hulatara ozugbo kpọọ isiala. 32  Mmụọ ozi Jehova wee sị ya: “Gịnị mere i ji kụọ jakị gị ihe ugboro atọ a? Apụtara m ka m gbochie gị ịga n’ihi na ihe a ị na-achọ ime abụghị uche m.+ 33  Jakị a hụrụ m gbalịa ka o si n’ebe m nọ pụọ ugboro atọ a.+ A sị na o sighị n’ebe m nọ pụọ, m gaarala egbu gị ma hapụ ya ndụ.” 34  Belam sịrị mmụọ ozi Jehova: “Emehiela m n’ihi na amaghị m na ọ bụ gị kwụ n’ụzọ ka i zute m. Ugbu a, ọ bụrụ na ihe a m na-aga adịghị gị mma, m ga-alaghachi.” 35  Ma mmụọ ozi Jehova sịrị Belam: “Soro ụmụ nwoke ndị ahụ gawa. Ma ọ bụ naanị ihe m ga-agwa gị ka ị ga-ekwu.” Belam wee soro ndị Belak mere ndị isi gawa. 36  Mgbe Belak nụrụ na Belam abịala, ọ gawara ozugbo ka o zute ya n’obodo Moab, nke dị n’akụkụ mmiri Anọn, n’ókè nke ala Moab. 37  Belak sịrị Belam: “Ọ̀ bụ na ezighị m ozi ka a kpọọ gị? Gịnị mere na ị bịaghị hụ m? Ì chere na enweghị m ike ịkwụ gị ezigbo ụgwọ?”+ 38  Belam zara Belak, sị: “M bịalanụ ịhụ gị. Ma, à ga-ekwenụ ka m kwuo ihe ọ bụla? Naanị ihe m ga-ekwuli bụ ihe Chineke gwara m ka m kwuo.”+ 39  Belam sooro Belak gawa. Ha wee bịarute Kiriat-huzọt. 40  Belak gburu ehi na atụrụ* ma zigara Belam na ndị isi ha na ya nọ ụfọdụ n’ime ha. 41  N’ụtụtụ, Belak kpọọrọ Belam wee kpọgote ya na Bemọt-bel. O si ebe ahụ na-ahụ ndị Izrel niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’akụkụ osimiri.”
Na Hibru, “nne jakị.”
Na Hibru, “meghere ọnụ nne jakị ahụ.”
Ma ọ bụ “chụrụ ehi na atụrụ n’àjà.”