Zekaraya 14:1-21

14  “Lee! Ụbọchị na-abịa, bụ́ ụbọchị Jehova,+ a ga-anọkwa n’ime gị kesaa ihe gị a kwaara n’agha.  M ga-akpọkọta mba niile ibuso Jeruselem agha;+ a ga-ewegharakwa obodo ahụ+ ma kwakọrọ ihe dị n’ụlọ ndị dị n’ime ya, a ga-edina ndị inyom bi n’ime ya n’ike.+ A ga-adọrọ ọkara ndị bi n’obodo ahụ n’agha;+ ma ndị fọdụrụ n’ime ha,+ a gaghị ebipụ ha n’obodo a.+  “Jehova ga-aga buso mba ndị ahụ agha+ dị ka ọ na-eme n’ụbọchị ọ na-ebu agha, n’ụbọchị ọgụ.+  N’ụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo n’elu ugwu osisi oliv nke dị n’ihu Jeruselem, n’ebe ọwụwa anyanwụ;+ ugwu osisi oliv+ ahụ ga-agbawakwa n’etiti,+ malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ. A ga-enwe nnukwu ndagwurugwu; otu ọkara ugwu ahụ ga-aga n’ebe ugwu, otu ọkara agaa n’ebe ndịda.  Unu ga-agbaga na ndagwurugwu nke ugwu m;+ n’ihi na ndagwurugwu nke ugwu ahụ ga-eru n’Ezel. Unu ga-agba ọsọ, dị ka unu gbara n’ihi ala ọma jijiji ahụ mere n’ụbọchị Ọzaya eze Juda.+ Jehova bụ́ Chineke m ga-abịa,+ ya na ndị nsọ niile.+  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ìhè nke dị oké ọnụ ahịa agaghị adị+—ihe dị iche iche ga-akpụkọ akpụkọ.+  Ọ ga-aghọkwa otu ụbọchị nke a maara dị ka ụbọchị Jehova.+ Ọ gaghị abụ ehihie, ọ gaghịkwa abụ abalị;+ ọ ga-erukwa na ezigbo ìhè ga-adị n’uhuruchi.+  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmiri na-enye ndụ+ ga-esi na Jeruselem na-asọpụta,+ otu ọkara mmiri ahụ ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ otu ọkara ga na-asọba n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+ Ọ ga-eme n’oge okpomọkụ nakwa n’oge oyi.+  Jehova ga-abụkwa eze na-achị ụwa dum.+ N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-abụ otu,+ otu aha ka ọ ga-enwekwa.+ 10  “A ga-agbanwe ala a dum ka ọ dị ka Araba,+ malite na Giba+ ruo Rimọn+ nke dị na ndịda Jeruselem; ọ ga-ebilitekwa dịrị n’ebe ọ dịbu, ndị mmadụ ga-ebikwa n’ime ya,+ malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin+ ruo n’ebe Ọnụ Ụzọ Ámá Mbụ dị, ruokwa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Nkuku, malitekwa n’Ụlọ Elu Hananel+ ruo n’olulu nzọchapụta mmanya nke eze. 11  Ndị mmadụ ga-ebikwa n’ime ya; a gakwaghị edo ya iche maka mbibi,+ a ga-ebikwa n’ime Jeruselem n’obi iru ala.+ 12  “Nke a bụ ihe otiti Jehova ga-eti ndị niile ga-ebuso Jeruselem agha:+ Anụ ahụ́ mmadụ ga na-erekapụsị ka onye ahụ guzo ọtọ;+ anya mmadụ ga na-erekasị n’oghere ya, ire ya ga na-erekasịkwa n’ime ọnụ ya. 13  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọgba aghara nke si n’aka Jehova ga-adị ebe niile n’etiti ha;+ ha ga-ejidekwa ibe ha, onye ọ bụla ga-ejide aka ibe ya, ha ga-emegidekwa ibe ha. 14  Juda ga-ebu agha na Jeruselem; a ga-achịkọta akụ̀ nke mba niile gbara ha gburugburu, chịkọta ọlaedo na ọlaọcha na uwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ gabigara ókè.+ 15  “Ihe otiti nke ga-abịakwasị ịnyịnya, jakị, kamel, oké ịnyịnya ibu, na ụdị anụ ụlọ ọ bụla nke dị n’ebe ndị ahụ a mara ụlọikwuu ga-adị ka ihe otiti a. 16  “Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke fọdụrụ n’ime mba niile ndị na-ebuso Jeruselem agha+ ga na-agbago site n’afọ ruo n’afọ+ ịga kpọọrọ Eze,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ isiala, na ime ememme ụlọ ndò.+ 17  Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla n’ime ezinụlọ niile+ nke ụwa nke na-agbagoteghị+ Jeruselem iji kpọọrọ Eze, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, isiala, mmiri agaghị ezoro ya.+ 18  Ọ bụrụ na ezinụlọ Ijipt agbagoteghị, ọ bụrụkwa na ha abataghị, otu mkpụrụ agaghị atasa ha. A ga-eti ha ihe otiti ahụ, bụ́ ihe otiti Jehova ga-eti mba ndị na-agbagoteghị mee ememme ụlọ ndò. 19  Nke a ga-abụ ntaramahụhụ a ga-enye maka mmehie nke Ijipt nakwa maka mmehie nke mba niile ndị na-agbagoteghị mee ememme ụlọ ndò.+ 20  “N’ụbọchị ahụ, a ga-ede+ n’elu mgbịrịgba nke ịnyịnya nya n’olu, sị, ‘Ịdị Nsọ bụ nke Jehova!’+ Ite e ji esi nri ndị nwere ọnụ obosara,+ bụ́ ndị dị n’ụlọ Jehova, ga-adị ka ọkwá+ n’ihu ebe ịchụàjà.+ 21  Ite ọ bụla e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara, bụ́ nke dị na Jeruselem na Juda, ga-aghọ ihe dị nsọ nke Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị niile na-achụ àjà ga-abata were ha sie ihe.+ A gakwaghị enwe onye Kenan+ n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha n’ụbọchị ahụ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji