Zefanaya 1:1-18
1 Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Zefanaya nwa Kọshaị nwa Gedalaya nwa Amaraya nwa Hezekaya ntị n’ụbọchị Josaya+ nwa Emọn+ eze Juda:
2 “Aghaghị m ikpochapụ ihe niile dị n’elu ala,” ka Jehova kwuru.+
3 “M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ.+ M ga-ekpochapụ anụ ufe nke eluigwe na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri,+ na ihe ịsụ ngọngọ, tinyere ndị ajọ omume;+ m ga-egbuchapụkwa mmadụ n’elu ala,”+ ka Jehova kwuru.
4 “M ga-esetịkwa aka m mee Juda na ndị niile bi na Jeruselem ihe,+ m ga-ebipụkwa ndị fọdụrụ n’ime ndị na-efe Bel n’ebe a,+ bipụkwa aha ndị nchụàjà nke chi ala ọzọ, tinyere ndị ọzọ bụ́ ndị nchụàjà,+
5 bipụkwa ndị na-anọ n’elu ụlọ akpọrọ ìgwè ihe ndị dị n’eluigwe isiala,+ nakwa ndị na-akpọ isiala,+ bụ́ ndị na-aṅụrụ Jehova iyi+ ma jiri Malkam na-aṅụ iyi;+
6 bipụkwa ndị na-ala azụ iso Jehova+ nakwa ndị na-achọghị Jehova, bụ́ ndị na-ajụghị ase ya.”+
7 Derenụ duu n’ihu Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova;+ n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso,+ n’ihi na Jehova akwadebewo àjà;+ o dowo ndị ọ kpọrọ òkù nsọ.+
8 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị àjà Jehova na m ga-elebara ndị isi na ụmụ eze+ na ndị niile na-eyi uwe ndị mba ọzọ anya.+
9 N’ụbọchị ahụ, m ga-elebara ndị niile na-arịgo n’ebe a kpụliri elu anya, bụ́ ndị na-eme ka ụlọ nna ha ukwu jupụta n’ime ihe ike na aghụghọ.+
10 A ga-anụkwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova kwuru, “ụda mkpu ákwá nke sitere n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+ nụkwa iti mkpu ákwá nke sitere n’ógbè nke abụọ nke obodo a,+ nụkwa oké ụda nke ihe ndị a na-akụpịasị n’ugwu.+
11 Tienụ mkpu ákwá,+ unu ndị bi na Maktesh, n’ihi na a lawo ndị ahịa niile n’iyi;+ e gbuchapụwo ndị niile na-atụ̀ ọlaọcha.
12 “Ọ ga-erukwa n’oge ahụ na m ga-eji oriọna nyochaa Jeruselem nke ọma,+ m ga-elebara ndị dị ka ikè mmanya anya,+ bụ́ ndị na-asị n’obi ha, ‘Jehova agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ.’+
13 A ga-akwakọrọ akụ̀ ha, meekwa ka ụlọ ha tọgbọrọ n’efu.+ Ha ga-ewu ụlọ ma ha agaghị ebi n’ime ha;+ ha ga-akọkwa ubi vaịn ma ha agaghị aṅụ mmanya ya.+
14 “Oké ụbọchị+ Jehova dị nso.+ Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.+ Ụda nke ụbọchị Jehova dị ilu.+ N’ebe ahụ ka dike na-eti mkpu ákwá.+
15 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị oké iwe, ụbọchị ahụhụ na nke nhụjuanya,+ ụbọchị oké ifufe na nke ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na nke itiri,+ ụbọchị ígwé ojii na nke oké ọchịchịrị,
16 ụbọchị ụda opi na nke iti mkpu agha,+ megide obodo ndị e wusiri ike, megidekwa ụlọ nche ndị dị na nkuku mgbidi.+
17 M ga-ewetara ụmụ mmadụ oké nsogbu, ha ga-ejegharịkwa dị ka ndị ìsì;+ n’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehieworo.+ A ga-awụpụkwa ọbara ha dị ka ájá,+ wụpụkwa eriri afọ ha dị ka nsị.+
18 Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị oké iwe Jehova;+ ma ọkụ nke ekworo ya ga-eripịa ụwa dum,+ n’ihi na ọ ga-ekpochapụ ndị niile bi n’ụwa, mkpochapụ ahụ ga-adịkwa nnọọ ukwuu.”+