Rut 1:1-22
1 O wee ruo n’oge ọ bụ ndị ikpe+ na-ekpe ikpe na ụnwụ+ dara n’ala Izrel, otu nwoke wee si na Betlehem+ nke dị na Juda gawa n’ala Moab+ ka ha biri dị ka ọbịa, ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ.
2 Aha nwoke ahụ bụ Elimelek, aha nwunye ya bụ Neomi, aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Malọn na Kilịọn, ha bụ ndị Efrata+ si Betlehem nke dị na Juda. E mesịa, ha rutere n’ala Moab wee biri n’ebe ahụ.
3 Ka oge na-aga, Elimelek bụ́ di Neomi nwụrụ, o wee fọdụzie ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ.
4 E mesịa, ndị ikom ahụ lụrụ nwaanyị, bụ́ ndị inyom Moab.+ Aha otu bụ Ọpa, aha nke ọzọ abụrụ Rut.+ Ha wee biri n’ebe ahụ ruo ihe dị ka afọ iri.
5 Ka oge na-aga, ha abụọ, Malọn na Kilịọn, nwụkwara, nwaanyị ahụ wee gbara aka ụmụ ya abụọ, gbarakwa aka di.
6 O wee bilie, ya na ndị nwunye ụmụ ya, wee si n’ala Moab lawa, n’ihi na ọ nọwo n’ala Moab nụ na Jehova echewo ihu ya n’ebe ndị ya nọ+ site n’inye ha nri.+
7 O wee si n’ebe ahụ o biri lawa,+ ya na ndị nwunye ụmụ ya abụọ, ha nọ na-aga n’ụzọ ka ha laghachi n’ala Juda.
8 N’ikpeazụ, Neomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ, sị: “Lawanụ, laghachinụ, onye nke ọ bụla n’ụlọ nne ya. Ka Jehova gosi unu obiọma,*+ dị nnọọ ka unu gosiri ya ndị ikom ahụ nwụrụ anwụ nakwa mụ onwe m.+
9 Ka Jehova nye unu onyinye,+ ka onye ọ bụla n’ime unu nwetakwa ebe izu ike+ n’ụlọ di ya.” O wee susuo ha ọnụ,+ ha wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda.
10 Ha wee na-asị ya: “Ee e, anyị ga-eso gị laghachikwuru ndị gị.”+
11 Ma Neomi sịrị: “Laghachinụ, ụmụ m. Gịnị mere unu ga-eji soro m? M̀ ka nwere ụmụ nwoke n’afọ m, hà ga-aghọ di unu?+
12 Laghachinụ, ụmụ m, lawanụ, n’ihi na emewo m agadi nke ukwuu ịlụ di. M sịgodị na m nwere olileanya na m ga-alụ di n’abalị a nakwa na m ga-amụrịrị ụmụ ndị ikom,+
13 ùnu ga-anọ na-eche ha ruo mgbe ha tolitere? Ùnu ga-anọrọ n’alụghị di n’ihi ha? Ee e, ụmụ m, n’ihi na ọ na-ewute m nke ukwuu n’ihi unu, na Jehova esetịpụwo aka ya megide m.”+
14 Ha wee bewe ákwá ọzọ n’olu dara ụda, e mesịa, Ọpa susuru nne di ya ọnụ. Ma Rut rapaara ya n’ahụ́.+
15 O wee sị: “Lee! Nwunye nwanne di gị nke di ya nwụrụ alakwuruwo ndị ya na chi ya.+ Soro nwunye nwanne di gị lawa.”+
16 Rut wee sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị; n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga, ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ.+ Ndị gị ga-abụ ndị m,+ Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.+
17 Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe+ na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.”
18 Mgbe ọ chọpụtara na o kpebisiri ike iso ya,+ ọ kwụsịrị ịsị ya lawa.
19 Ha abụọ wee na-aga ruo mgbe ha rutere Betlehem.+ O wee ruo na ngwa ngwa ha batara Betlehem, obodo ahụ dum malitere ịgba ghara ghara n’ihi ha,+ ndị inyom nọkwa na-asị: “Onye a ọ̀ bụ Neomi?”+
20 Ọ na-agwakwa ndị inyom ahụ, sị: “Unu akpọla m Neomi. Kpọwanụ m Mera, n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile+ emewo m ihe obi ilu dị ukwuu.+
21 Aka m juru eju mgbe m pụrụ,+ ma Jehova emewo ka m gbara aka lọta.+ Gịnị mere unu ji akpọ m Neomi, ebe ọ bụ na Jehova ewedawo m ala,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile akpatawokwara m ọdachi?”+
22 Otú a ka Neomi si lọta, Rut, nwaanyị Moab, bụ́ nwunye nwa ya, so ya mgbe o si n’ala Moab na-alọta;+ ha wee rute Betlehem+ n’oge a malitere iwe ọka bali n’ubi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”