Mkpughe 21:1-27

21  M wee hụ eluigwe ọhụrụ+ na ụwa ọhụrụ;+ n’ihi na eluigwe mbụ+ na ụwa mbụ+ agabigawo, oké osimiri+ adịkwaghị.  Ahụkwara m obodo nsọ ahụ,+ bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe,+ n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ nke a chọrọ mma maka di ya.+  M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: “Lee! Ụlọikwuu+ nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa,+ ha ga-abụkwa ndị nke ya.+ Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha.+  Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile+ n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ,+ iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.+ Ihe mbụ niile agabigawo.”+  Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ+ wee sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.”+ Ọ sịkwara: “Dee ha ede, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”  Ọ sịkwara m: “Ha emezuwo! Abụ m Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.+ M ga-enye onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si n’isi iyi nke mmiri nke ndụ n’efu.+  Onye ọ bụla nke meriri ga-eketa ihe ndị a, m ga-abụkwa Chineke ya,+ ọ ga-abụkwa nwa m.+  Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+  Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji efere asaa ahụ ndị jupụtara n’ihe otiti asaa+ ikpeazụ ahụ wee bịa, o wee gwa m okwu, sị: “Bịa ebe a, m ga-egosi gị nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”+ 10  Ya mere, o buru m pụọ site n’ike nke mmụọ nsọ gaa ná nnukwu ugwu dị oké elu,+ o gosikwara m obodo nsọ+ ahụ bụ́ Jeruselem ka o si n’eluigwe, n’ebe Chineke nọ, na-agbadata,+ 11  o nwekwara ebube Chineke.+ Ọ na-egbuke egbuke dị ka nkume dị nnọọ oké ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa nke na-egbuke nke ọma.+ 12  O nwere nnukwu mgbidi dị oké elu,+ nweekwa ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ, ndị mmụọ ozi iri na abụọ nọkwa n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ, e dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel+ na ha. 13  Ọnụ ụzọ ámá atọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọnụ ụzọ ámá atọ dịkwa n’ebe ugwu, ọnụ ụzọ ámá atọ dịkwa n’ebe ndịda, ọnụ ụzọ ámá atọ+ dịkwa n’ebe ọdịda anyanwụ. 14  Mgbidi nke obodo ahụ nwekwara nkume ntọala+ iri na abụọ, nweekwa aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ+ nke Nwa Atụrụ ahụ n’elu ha. 15  Onye ahụ nke na-agwa m okwu ji okporo ahịhịa amị ọlaedo+ dị ka ihe e ji atụ̀ ihe, ka o wee tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ámá ya na mgbidi ya.+ 16  Obodo ahụ nwekwara akụkụ anọ há nhata, ogologo ya hakwa ka obosara ya. O wee jiri okporo ahịhịa amị ahụ tụọ obodo ahụ,+ ya adịrị puku fọlọng iri na abụọ;* ogologo ya na obosara ya na ịdị elu ya hà nhata. 17  Ọ tụkwara mgbidi ya, ya adịrị otu narị kubit na iri anọ na anọ, dị ka ihe mmadụ ji atụ̀ ihe si dị, dịkwa ka nke ndị mmụọ ozi. 18  Ihe e ji wuo mgbidi ya bụ nkume jaspa,+ obodo ahụ bụkwa ezi ọlaedo yiri enyo na-egbuke egbuke. 19  E ji ụdị nkume ọ bụla dị oké ọnụ ahịa+ chọọ ntọala+ nke mgbidi obodo ahụ mma: ntọala mbụ ya bụ jaspa,+ nke abụọ bụ safaya,+ nke atọ bụ kalsedọni, nke anọ bụ emerad,+ 20  nke ise bụ sadọniks, nke isii bụ sadiọs, nke asaa bụ krisolaịt,+ nke asatọ bụ beril, nke itoolu bụ topaz,+ nke iri bụ krisopres, nke iri na otu bụ hayasịnt, nke iri na abụọ bụ ametist.+ 21  Ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ ahụ bụkwa nkume pel iri na abụọ; e ji otu nkume pel+ rụọ nke ọ bụla n’ime ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ. Okporo ámá nke obodo ahụ bụkwa ezi ọlaedo, dị ka enyo a na-ahụ ihe dị n’azụ ya. 22  Ahụghị m ụlọ nsọ n’ime ya,+ n’ihi na Jehova+ Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ na Nwa Atụrụ ahụ+ bụ ụlọ nsọ ya.+ 23  Anyanwụ adịghị obodo ahụ mkpa, ọ dịghịkwa mkpa ka ọnwa nye ya ìhè, n’ihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè,+ oriọna ya bụkwa Nwa Atụrụ ahụ.+ 24  Mba niile ga-eji ìhè ya na-eje ije,+ ndị eze nke ụwa ga-ewebatakwa ebube ha n’ime ya.+ 25  A gaghịkwa emechi ọnụ ụzọ ámá ya emechi n’ehihie,+ n’ihi na abalị agaghị adị n’ebe ahụ.+ 26  Ha ga-ewebatakwa ebube na nsọpụrụ nke mba niile n’ime ya.+ 27  Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe arụ,+ nke na-aghakwa ụgha,+ agaghị abanye n’ime ya ma ọlị;+ ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-abanye n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe dị ka puku kilomita abụọ, narị abụọ na iri abụọ.