Matiu 6:1-34

6  “Lezienụ anya nke ọma ka unu ghara ịdị na-eme ezi omume+ unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu; ma ọ́ bụghị otú ahụ, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ n’aka Nna unu nke nọ n’eluigwe.  Ya mere, mgbe ị na-enye onyinye ebere,+ afụla opi+ na-aga, dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee nye ha otuto. N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.  Ma gị onwe gị, mgbe ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka aka ekpe gị mara ihe aka nri gị na-eme,  ka onyinye ebere gị wee bụrụ na nzuzo; Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.+  “Mgbe unu na-ekpekwa ekpere, unu adịla ka ndị ihu abụọ; n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo+ n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ nwere ngalaba na-ekpe ekpere ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.+ N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.  Ma, gị onwe gị, mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị,+ mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere;+ Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.  Ma mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro,+ dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.  Ya mere, unu emela ka ha, n’ihi na Chineke bụ́ Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu+ tupu unu arịọ ya.  “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a:+ “‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha+ gị nsọ.+ 10  Ka alaeze+ gị bịa. Ka uche+ gị meekwa n’ụwa,+ dị ka ọ na-eme n’eluigwe. 11  Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa;+ 12  gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.+ 13  Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa,*+ kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’+ 14  “N’ihi na ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu;+ 15  ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.+ 16  “Mgbe unu na-ebu ọnụ,+ kwụsịnụ ịgbarụ ihu dị ka ndị ihu abụọ, n’ihi na ha na-emebi ihu ha ka ndị mmadụ wee hụ na ha na-ebu ọnụ.+ N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha. 17  Ma gị onwe gị, mgbe ị na-ebu ọnụ, tee mmanụ n’isi gị, saakwa ihu gị,+ 18  ka i wee bụrụ onye na-ebu ọnụ, ọ bụghị n’anya mmadụ, kama n’anya Nna gị nke nọ na nzuzo;+ Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụkwa gị ụgwọ. 19  “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀+ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi. 20  Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe,+ ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi. 21  N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa. 22  “Oriọna nke ahụ́ bụ anya.+ Ya mere, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum ga-ejupụta n’ìhè; 23  ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ,+ ahụ́ gị dum ga-agba ọchịchịrị. Ọ bụrụ n’ezie na ìhè nke dị n’ime gị bụ ọchịchịrị, lee ka ọchịchịrị ahụ si dị ukwuu!+ 24  “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya,+ ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.+ 25  “N’ihi nke a, ana m asị unu: Kwụsịnụ ichegbu onwe unu+ banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.+ Ọ̀ bụ na mkpụrụ obi adịghị mkpa karịa ihe oriri, ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?+ 26  Leruonụ anụ ufe+ nke eluigwe anya, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghị aghọrọ mkpụrụ, ha adịghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa ha? 27  Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?+ 28  Ọzọ, n’ihe banyere uwe, gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu? Mụtanụ ihe site n’okooko lili+ dị n’ọhịa, otú ha si eto; ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa akpa ogho; 29  ma ana m asị unu na ọbụna Sọlọmọn,+ n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha. 30  Ma ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta?+ 31  Ya mere, unu echegbula+ onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ 32  N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.+ 33  “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke,+ a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.+ 34  N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi,+ n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa.”