Matiu 17:1-27

17  Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jizọs kpọọrọ naanị Pita na Jems na Jọn nwanne ya ma kpọgote ha n’ugwu dị oké elu.+  O wee nwoghaa n’ihu ha, ihu ya na-achakwa ka anyanwụ,+ uwe elu ya na-enwu gbaa dị ka ìhè.+  Ma, lee! Mozis na Ịlaịja pụtara n’ihu ha, ha na ya na-akparịta ụka.+  Pita wee sị Jizọs: “Onyenwe anyị, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a. Ọ bụrụ na ị chọọ, m ga-ama ụlọikwuu atọ n’ebe a, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.”+  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, lee! otu olu si n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m;+ geenụ ya ntị.”+  Mgbe ha nụrụ ihe a, ndị na-eso ụzọ ya gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, oké egwu wee tụọ ha.+  Jizọs wee bịa, bitụ ha aka wee sị: “Bilienụ ọtọ, unu atụkwala egwu.”+  Mgbe ha leliri anya, ọ dịghị onye ha hụrụ ma e wezụga naanị Jizọs.+  Mgbe ha si n’ugwu ahụ na-arịdata, Jizọs nyere ha iwu, sị: “Unu akọrọla onye ọ bụla ọhụụ a ruo mgbe e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Nwa nke mmadụ.”+ 10  Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Gịnịzi mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?”+ 11  Ọ zara, sị: “N’ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+ 12  Otú ọ dị, ana m asị unu na Ịlaịja abịaworị ma ha amataghị ya, kama ha mere ya ihe masịrị ha. Otú a kwa ka a kara aka na Nwa nke mmadụ ga-ata ahụhụ n’aka ha.”+ 13  Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ gwara ha banyere Jọn Onye Na-eme Baptizim.+ 14  Mgbe ha bịara n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ,+ otu nwoke bịakwutere ya, gbuoro ya ikpere n’ala, sị: 15  “Onyenwe anyị, meere nwa m nwoke ebere, n’ihi na ọ bụ onye akwụkwụ, ọnọdụ ya dịkwa njọ, n’ihi na ọ na-adaba n’ọkụ mgbe mgbe, na-adabakwa n’ime mmiri mgbe mgbe;+ 16  m wee kpọtara ya ndị na-eso ụzọ gị, ma ha enweghị ike ịgwọ ya.”+ 17  Jizọs zara, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke gbagọkwara agbagọ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtara m ya ebe a.” 18  Jizọs wee baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, o wee si n’ime ya pụta;+ e wee gwọọ nwa okoro ahụ malite n’oge awa ahụ.+ 19  Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee bịakwute ya naanị ha wee sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?”+ 20  O wee sị ha: “Ọ bụ n’ihi okwukwe nta unu. N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si n’ebe a gafee n’ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.”+ 21 * —— 22  Ọ bụ mgbe ha zukọtara na Galili ka Jizọs sịrị ha: “A kawo ya aka na a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ,+ 23  ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.”+ N’ihi ya, ha nwere mwute dị nnọọ ukwuu.+ 24  Mgbe ha bịarutere Kapaniọm, ndị ikom na-anakọta ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ bịakwutere Pita wee sị: “Ọ̀ bụ na onye ozizi unu adịghị atụ ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ ahụ?”+ 25  O wee sị: “Ee.” Otú ọ dị, mgbe ọ banyere n’ime ụlọ, Jizọs bu ụzọ sị ya: “Saịmọn, gịnị ka i chere? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? Ọ̀ bụ n’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” 26  Mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ n’aka ndị bịara abịa,” Jizọs sịrị ya: “Ya mere, n’ezie, ụmụ ha anaghị atụ ụtụ. 27  Ma ka anyị wee ghara ime ka ha sụọ ngọngọ,+ gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ̀, werekwa azụ̀ mbụ i gbutere. Mgbe i meghere ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego steta. Were ya nye ha maka mụ na gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Amaokwu a dị n’ụfọdụ nsụgharị Baịbụl, ma ọ dịghị n’ihe odide Grik ndị kasị mee ochie.