Matiu 1:1-25

1  Akwụkwọ nke kọrọ akụkọ+ banyere Jizọs Kraịst, nwa Devid,+ nwa Ebreham:+   Ebreham mụrụ Aịzik;+Aịzik amụọ Jekọb;+Jekọb amụọ Juda+ na ụmụnne ya ndị ikom;   Juda amụọ Pirez+ na Zira, bụ́ ndị Tema mụụrụ ya;Pirez amụọ Hezrọn;+Hezrọn amụọ Ram;+   Ram amụọ Aminadab;Aminadab amụọ Nashọn;+Nashọn amụọ Salmọn;+   Salmọn amụọ Boaz, bụ́ onye Rehab+ mụụrụ ya;Boaz amụọ Obed, bụ́ onye Rut+ mụụrụ ya;Obed amụọ Jesi;+   Jesi amụọ Devid+ bụ́ eze.+  Devid mụrụ Sọlọmọn,+ bụ́ onye nwunye Yuraya mụụrụ ya;   Sọlọmọn amụọ Rehoboam;+Rehoboam amụọ Abaịja;Abaịja+ amụọ Esa;+   Esa amụọ Jehọshafat;+Jehọshafat amụọ Jehoram+Jehoram amụọ Ọzaya;   Ọzaya amụọ Jotam;Jotam+ amụọ Ehaz;+Ehaz amụọ Hezekaya;+ 10  Hezekaya amụọ Manase;+Manase+ amụọ Emọn;+Emọn+ amụọ Josaya; 11  Josaya+ amụọ Jekonaya+ na ụmụnne ya ndị ikom mgbe a dọọrọ han’agha laa Babịlọn.+ 12  Mgbe a dọsịịrị ha n’agha laa Babịlọn, Jekonaya mụrụ Shieltiel;+Shieltiel amụọ Zerọbabel;+ 13  Zerọbabel amụọ Abayọd;Abayọd amụọ Elayakim;Elayakim amụọ Ezọ; 14  Ezọ amụọ Zedọk;Zedọk amụọ Ekim;Ekim amụọ Ịlayọd; 15  Ịlayọd amụọ Elieza;Elieza amụọ Matan;Matan amụọ Jekọb; 16  Jekọb amụọ Josef di Meri, bụ́ onye mụrụ Jizọs,+ onye a na-akpọ Kraịst.+ 17  Ya mere, ọgbọ ahụ niile, malite n’Ebreham ruo na Devid, dị ọgbọ iri na anọ, malitekwa na Devid ruo mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn dị ọgbọ iri na anọ, malitekwa mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn ruo na Kraịst dị ọgbọ iri na anọ. 18  Ma, otú a ka e si mụọ Jizọs Kraịst. N’oge e kwere nne ya bụ́ Meri nkwa+ na Josef ga-alụ ya, a hụrụ na ọ dị ime site n’ike mmụọ nsọ+ tupu e jikọọ ha. 19  Otú ọ dị, Josef bụ́ di ya bu n’uche ịgba ya alụkwaghịm*+ na nzuzo n’ihi na ọ bụ onye ezi omume, ọ chọghịkwa ibupụta ya n’ihu ọha.+ 20  Ma mgbe o chebasịịrị ihe ndị a echiche, lee! mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ, sị: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka ọ dị ime ahụ ọ dị.+ 21  Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jizọs,+ n’ihi na ọ ga-azọpụta+ ndị ya+ ná mmehie ha.”+ 22  Ihe a niile mere ka ihe Jehova kwuru+ site n’ọnụ onye amụma ya+ wee mezuo, nke sịrị: 23  “Lee! Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke+ ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke, a ga-agụ ya Ịmanuel,”+ nke pụtara, ma a sụgharịa ya, “Chineke Nọnyeere Anyị.”+ 24  Josef wee teta n’ụra ya ma mee ihe mmụọ ozi Jehova gwara ya, o wee kpọrọ nwunye ya laa. 25  Ma ya na ya enweghị mmekọahụ+ ọ bụla ruo mgbe ọ mụrụ nwa nwoke;+ o wee gụọ ya Jizọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Dị ka omenala ndị Juu si dị, ọ dị mkpa ịgba mmadụ alụkwaghịm iji gbubie nkwa ọlụlụ.