Mak 1:1-45
1 Nke a bụ malite ozi ọma banyere Jizọs Kraịst:
2 Dị nnọọ ka e dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “(Lee! M na-ezite onye ozi m n’ihu gị, onye ga-akwadebe ụzọ gị;)+
3 geenụ ntị! e nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova, meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ,’”+
4 Jọn onye na-eme baptizim pụtara n’ala ịkpa, na-ekwusa baptizim dị ka ihe na-egosi nchegharị bụ́ nke na-eme ka a gbaghara mmehie.+
5 Ókèala dum nke Judia na ndị niile bi na Jeruselem wee na-agakwuru ya. O wee na-eme ha baptizim n’Osimiri Jọdan, ha na-ekwupụtakwa mmehie ha n’ihu ọha.+
6 Jọn yi uwe e ji ajị kamel mee, keekwa ájị̀ akpụkpọ anụ n’úkwù,+ ọ bụkwa igurube+ na mmanụ aṅụ ọhịa+ ka ọ na-eri.
7 Ọ na-ekwusakwa, sị: “Onye ka m ike na-abịa n’azụ m; erughị m eru ihulata tọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+
8 Eji m mmiri mee unu baptizim, ma ọ ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.”+
9 Ka ụbọchị ndị ahụ na-aga, Jizọs si Nazaret nke Galili bịa, Jọn wee mee ya baptizim na Jọdan.+
10 Ozugbo o si na mmiri na-ebili, Jọn hụrụ ka eluigwe na-ekewa, hụkwa ka mmụọ nsọ na-ebekwasị ya dị ka nduru;+
11 otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”+
12 Ozugbo ahụ, mmụọ nsọ kpaliri ya ịbanye n’ala ịkpa.+
13 Ya mere, ọ nọgidere n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ,+ Setan wee na-anwa ya ọnwụnwa,+ ya na anụ ọhịa dị iche iche nọkwa, ma ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi.+
14 Mgbe a kpọchisịrị Jọn, Jizọs banyere Galili,+ na-ekwusa ozi ọma Chineke,+
15 sị: “Oge ahụ a kara aka eruwo,+ alaeze Chineke eruwokwa nso. Chegharịanụ,+ kwerekwanụ n’ozi ọma ahụ.”
16 Ka ọ na-aga n’akụkụ oké osimiri Galili,* ọ hụrụ Saịmọn+ na Andru nwanne Saịmọn ka ha na-awụnye ụgbụ ha n’oké osimiri, n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀.+
17 Ya mere, Jizọs sịrị ha: “Soronụ m, m ga-eme ka unu ghọọ ndị na-akụta mmadụ.”+
18 Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo wee soro ya.+
19 Mgbe ọ gatụkwuru ihu, ọ hụrụ Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ka ha nọ n’ụgbọ mmiri ha na-edozi ụgbụ ha;+
20 ọ kpọkwara ha n’egbughị oge. Ha wee hapụ nna ha Zebedi n’ụgbọ mmiri ahụ, ya na ndị o goro ọrụ, soro ya gawa.
21 Ha wee banye Kapaniọm.+
Ozugbo ụbọchị izu ike ruru, ọ banyere n’ụlọ nzukọ wee malite izi ihe.
22 Otú o si ezi ihe wee ju ha anya,+ n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe n’ebe ahụ dị ka onye nwere ikike, ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ.+
23 N’oge ahụ kpọmkwem, e nwere otu nwoke nọ n’ụlọ nzukọ ha, bụ́ onye mmụọ na-adịghị ọcha ji, o wee tie mkpu,+
24 sị: “Gịnị jikọrọ anyị na gị, Jizọs onye Nazaret?+ Ị̀ bịara ibibi anyị? Amaara m+ kpọmkwem onye ị bụ, Onye Nsọ+ nke Chineke.”+
25 Ma Jizọs baara ya mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta!”+
26 Mgbe mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mesịrị ka ihe ọdịdọ dọọ ya, mgbe o tisịkwara mkpu n’oké olu, o si n’ime ya pụta.+
27 O juru mmadụ niile anya nke ukwuu nke na ha malitere ikwu n’etiti onwe ha, sị: “Gịnị bụ ihe nke a? Ọ bụ ozizi ọhụrụ! O ji ikike na-enye ọbụna ndị mmụọ na-adịghị ọcha iwu, ha na-erubekwara ya isi.”+
28 Akụkọ banyere ya wee gbasaa ozugbo ahụ n’akụkụ niile n’ime ógbè dum gbara Galili gburugburu.+
29 Ha wee si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ ozugbo banye n’ụlọ Saịmọn+ na Andru, ha na Jems na Jọn.
30 Ma nne nwunye Saịmọn+ dina ala, ahụ́ ọkụ jikwa ya,+ ha wee kọọrọ Jizọs banyere nwaanyị ahụ ozugbo.
31 Mgbe ọ gakwuuru ya, o jidere ya n’aka wee selite ya; ahụ́ ọkụ ahụ hapụkwara ya,+ o wee malite ijere ha ozi.+
32 Mgbe o ruru ná mgbede, mgbe anyanwụ dara, ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa+ na ndị mmụọ ọjọọ ji;+
33 obodo ahụ dum gbakọkwara kpọmkwem n’ọnụ ụzọ.
34 O wee gwọọ ọtụtụ ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche,+ ọ chụpụkwara ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ dịghị ekwe ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ kwuo okwu, n’ihi na ha maara na ọ bụ Kraịst.+
35 N’isi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbara, o biliri pụọ n’èzí ma gaa n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị,+ ọ malitekwara ikpe ekpere n’ebe ahụ.+
36 Otú ọ dị, Saịmọn na ndị ya na ha so chọsiwere ya ike
37 wee chọta ya, ha wee sị ya: “Mmadụ niile na-achọgharị gị.”
38 Ma ọ sịrị ha: “Ka anyị gaa ebe ọzọ, n’obodo nta ndị dị nso, ka m wee kwusaakwa ozi ọma+ n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.”+
39 Ọ gakwara, na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ ha n’ime Galili dum ma na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+
40 Otu onye ekpenta bịakwutekwara ya, ọbụna gbuo ikpere n’ala na-arịọsi ya arịrịọ ike, sị ya: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”+
41 N’ihi nke ahụ, o nwere ọmịiko,+ o wee matịa aka ya bitụ ya aka, sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+
42 Ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya ozugbo, o wee dị ọcha.+
43 O nyesikwara ya iwu ike ma sị ya lawa ozugbo,
44 ọ gwakwara ya, sị: “Hụ na ọ dịghị onye ị kọọrọ ihe ọ bụla, kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa ihe ndị ahụ Mozis kwuru ka e nye iji gosi na ị dịla ọcha,+ ka o wee bụrụ ihe àmà nye ha.”+
45 Ma mgbe ọ pụrụ, nwoke ahụ malitere ịkọsasị ya na ịgbasa akụkọ ahụ n’ebe niile, nke mere na Jizọs enwekwaghị ike ịbanye n’ime obodo n’ihu ọha, kama ọ nọgidere n’azụ obodo n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị. Ma ha si ebe niile na-abịakwute ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ N’ezie, ọ bụ ọdọ mmiri; Baịbụl kpọkwara ya ọdọ mmiri Genesaret, Osimiri Galili, nakwa Osimiri Taịbirias.”