Joel 3:1-21
3 “N’ihi na lee, n’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,+ mgbe m ga-akpọghachite ndị Juda na ndị Jeruselem a dọọrọ n’agha,+
2 m ga-achịkọtakwa mba niile+ ma mee ka ha gbadata na ndagwurugwu Jehọshafat;+ m ga-ekpe ha ikpe n’ebe ahụ n’ihi ndị m nakwa n’ihi ihe nketa m bụ́ Izrel,+ bụ́ ndị ha chụsasịrị ná mba dị iche iche; ha kesakwara ala m.+
3 Ha nọ na-efe nza+ iji kee ndị m n’etiti onwe ha; ha na-eji nwa nwoke agbanweta akwụna,+ ha na-erekwa nwa nwaanyị iji zụrụ mmanya ka ha ṅụọ.
4 “Oleekwa ihe jikọrọ mụ na unu, Taya na Saịdọn+ na unu ógbè niile nke Filistia?+ Ọ̀ bụ mmeso a ka unu ji na-akwụ m ụgwọ? Ọ bụrụkwa otú a ka unu na-emeso m, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+
5 N’ihi na unu eburuwo ọlaọcha m na ọlaedo m,+ unu ebubawo ihe ọma m a na-achọsi ike n’ụlọ nsọ unu;+
6 unu eresịwokwa+ ndị Gris+ ụmụ Juda na ụmụ Jeruselem, iji kpọpụ ha n’ókèala ha kpọga ha n’ebe dị anya;+
7 lee, aga m akpali ha ka ha si n’ebe unu refuru+ ha bịa, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu mesoro ha.+
8 M ga-eresịkwa ụmụ Juda+ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, ha ga-eresịkwa ha ndị Shiba,+ refuo ha ná mba dị anya;+ n’ihi na Jehova ekwuwo ya.
9 “Kpọsaanụ n’etiti mba dị iche iche,+ sị, ‘Jikerenụ agha!* Kpalienụ ndị dị ike!+ Ka ha bịa nso! Ka ha gbagote, ya bụ, ndị ikom niile na-aga agha!+
10 Kpụgharịanụ mma ogè+ unu ka ha bụrụ mma agha, kpụgharịakwanụ mma unu ji akwa osisi ka ha bụrụ ube. Ka onye na-adịghị ike sị: “Abụ m nwoke dị ike.”+
11 Bịanụ nyere ibe unu aka, unu mba niile ndị bi gburugburu,+ zukọtanụ.’”+
Jehova, biko, mee ka ndị gị bụ́ ndị dị ike gbadata n’ebe ahụ.+
12 “Ka a kpalie mba dị iche iche, ka ha bịakwa na ndagwurugwu Jehọshafat;+ n’ihi na m ga-anọdụ ala n’ebe ahụ ikpe mba niile ndị bi gburugburu ikpe.+
13 “Tinyenụ mma owuwe ihe ubi,+ n’ihi na ihe ubi achawo.+ Bịanụ, gbadatanụ, n’ihi na ebe nzọchapụta mmanya ejuwo.+ Olulu ịzọchapụta mmanya ejubigawo ókè; n’ihi na ihe ọjọọ ha adịwo ukwuu.+
14 Ìgwè mmadụ, ìgwè mmadụ jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe,+ n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso na ndagwurugwu mkpebi ikpe.+
15 Anyanwụ na ọnwa ga-agba ọchịchịrị, kpakpando ga-akwụsị inye ìhè ha.+
16 Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ, ọ ga-emekwa ka olu ya+ si na Jeruselem kwuo okwu. Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ;+ ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+ ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe e wusiri ike.+
17 Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu,+ onye bi na Zayọn bụ́ ugwu nsọ m.+ Jeruselem ga-aghọ ebe dị nsọ;+ ndị ala ọzọ agaghịkwa esi n’ime ya gafere ọzọ.+
18 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmanya dị ụtọ+ ga-esi n’ugwu na-atapụsị, mmiri ara ehi ga na-eru n’ugwu nta, mmiri ga na-asọ n’ọwa mmiri niile nke Juda. Isi iyi ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta,+ ọ ga na-edekwa Ndagwurugwu Osisi Akeshịa+ mmiri.
19 Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu;+ Idọm ga-aghọkwa ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi ihe ike ha mesoro ụmụ Juda, bụ́ ndị ha nọ n’ala ha wụfuo ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+
20 Ma mmadụ ga-ebi na Juda ruo mgbe a na-akaghị aka.+ A ga-ebikwa na Jeruselem site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
21 Ọbara ha nke m gụrụ dị ka nke mere ihe ọjọọ ka m ga-agụ dị ka nke na-emeghị ihe ọjọọ;+ Jehova ga-ebikwa na Zayọn.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, “doonụ agha nsọ.”