Joel 1:1-20
1 Nke a bụ okwu Jehova nke ruru+ Joel nwa Petuel ntị:
2 “Nụrụnụ ihe a, unu ndị okenye, ṅaakwanụ ntị, unu niile ndị bi n’ala a.+ Nke a ò meela n’ụbọchị unu, ma ọ bụ ọbụna n’ụbọchị nna nna unu hà?+
3 Kọọrọnụ ya ụmụ unu, ụmụ unu akọọrọ ya ụmụ ha, ụmụ ha akọọkwara ya ọgbọ na-eso nke ha.+
4 Igurube eriwo ihe egú rifọrọ;+ igurube na-arị arị, bụ́ ndị na-enweghị nku, eriwokwa ihe igurube rifọrọ; ọchịcha eriwokwa ihe igurube na-arị arị, bụ́ ndị na-enweghị nku, rifọrọ.+
5 “Tetanụ, unu ndị aṅụrụma,+ kwaanụ ákwá; tiekwanụ mkpu ákwá,+ unu niile ndị na-aṅụ mmanya, n’ihi mmanya dị ụtọ,+ n’ihi na a napụwo ya unu n’ọnụ.+
6 N’ihi na ọ dị mba dị ike, nke a na-apụghịkwa ịgụta ndị ya ọnụ,+ nke gbagotere wee bata n’ala m. Ezé ya bụ ezé ọdụm,+ o nwekwara ọkpụkpụ agba ọdụm.
7 O mewo ka osisi vaịn mụ bụrụ ihe ijuanya,+ meekwa ka ihe fọdụrụ n’osisi fig mụ bụrụ naanị úkwù ya.+ Ọ tachasịwo ya ma tụfuo ya.+ Alaka ya na-achazi ọcha.
8 Kwaanụ ákwá arịrị, dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke kere ákwà iru uju n’úkwù+ na-akwara di nke chọrọ ịlụ ya n’oge ọ bụ nwa agbọghọ ákwá arịrị.
9 “A dịghị ewetakwa àjà ọka*+ na àjà ihe ọṅụṅụ+ n’ụlọ Jehova; ndị nchụàjà, bụ́ ndị ozi+ Jehova, eruwo uju.+
10 E bibiwo ihe ndị dị n’ubi,+ ala na-eru uju;+ n’ihi na e bibiwo ọka, mmanya ọhụrụ atakọwo,+ mmanụ adịkwaghị agbapụta.+
11 Ihere emewo ndị ọrụ ubi;+ ndị ọrụ ubi vaịn etiwo mkpu ákwá, n’ihi ọka wit nakwa n’ihi ọka bali; n’ihi na ihe ubi alawo n’iyi.+
12 Osisi vaịn akpọwo nkụ, ọbụna osisi fig akpọnwụwo. Osisi pọmigranet nakwa nkwụ* nakwa osisi apụl, osisi niile dị n’ubi, akpọnwụwo;+ n’ihi na aṅụrị ejiriwo ihere pụọ n’ebe ụmụ mmadụ nọ.+
13 “Keenụ ákwà iru uju n’úkwù, tiekwanụ aka n’obi,+ unu ndị nchụàjà. Tienụ mkpu ákwá, unu ndị na-eje ozi n’ebe ịchụàjà.+ Batanụ, yirinụ ákwà iru uju nọrọ ruo mgbe chi bọrọ, unu ndị na-ejere Chineke m ozi; n’ihi na a dịghị ewetakwa àjà ọka+ na àjà ihe ọṅụṅụ+ n’ụlọ Chineke unu.
14 Kwuonụ ka e nwee obubu ọnụ+ dị nsọ. Kpọọnụ òkù ka e nwee nzukọ ukwu.+ Kpọkọtanụ ndị okenye, ndị niile bi n’ala a, n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu,+ tikuonụ Jehova maka enyemaka.+
15 “Ewoo, ụbọchị ahụ na-abịa!+ Ụbọchị Jehova dị nso,+ ọ ga-abịakwa dị ka mbibi nke si n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile!
16 Ọ̀ bụ na anyị ejibeghị anya anyị hụ ka a kwụsịrị iweta ihe oriri; a kwụsị inwe obi ụtọ na ọṅụ n’ụlọ Chineke anyị?+
17 Mkpụrụ fig a mịrị amị nke ha manyere shọvel emebiwo. E mewo ka ụlọ nkwakọba ihe tọgbọrọ n’efu. A kwatuwo ọba, n’ihi na ọka akpọnwụwo.
18 Lee, anụ ụlọ asụwo ude! Lee, ìgwè ehi awagharịwo ná mgbagwoju anya! N’ihi na ha enweghị ebe ịta nri.+ E mewokwa ka ọ bụrụ ìgwè atụrụ ga-eburu ikpe ọmụma.
19 “Jehova, ọ bụ gị ka m ga-akpọku;+ n’ihi na ọkụ erepịawo ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa, ire ọkụ erepịawokwa osisi niile dị n’ọhịa.+
20 Anụ ọhịa na-elekwa anya n’ebe ị nọ,+ n’ihi na ọwa mmiri atawo,+ ọkụ erepịawokwa ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
^ Nkwụ a bụ ụdị nke na-adị n’ala Palestaịn.