Job 9:1-35

9  Job wee zaa, sị:   “N’ezie, a maara m na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị.Ma olee otú mmadụ efu ga-esi bụrụ onye ziri ezi ma ya na Chineke nwee okwu ikpe?+   Ọ bụrụ na ọ dị ya ụtọ isesa mmadụ okwu,+Mmadụ apụghị ịzaghachi ya otu ugboro n’ime otu puku.   O nwere obi amamihe, bụrụkwa onye dị ike.+Ònye pụrụ imere ya isi ike, ihe agaziere ya?+   Ọ na-ebupụ ugwu,+ ndị mmadụ adịghịkwa ama,Ọ bụ ya bụ onye kwatuworo ha n’iwe ya.+   Ọ na-eme ka ala maa jijiji pụọ n’ọnọdụ ya,Ogidi+ ya ewee maa jijiji.   Ọ na-agwa anyanwụ ka ọ ghara ịcha,Ọ na-ekpuchikwa kpakpando ka a ghara ịhụ ha,+   O ji aka ya setịa eluigwe,+Na-ejekwa ije n’elu oké ebili mmiri nke oké osimiri;+   O mere ìgwè kpakpando bụ́ Ash, ìgwè kpakpando bụ́ Kisịl,Tinyere ìgwè kpakpando bụ́ Kaịma+ nakwa ọnụ ụlọ ndị dị n’ime, n’ebe Ndịda; 10  Ọ na-eme oké ihe ndị a na-apụghị ịchọpụtacha achọpụtacha,+Na ihe dị ebube a na-apụghị ịgụta ọnụ.+ 11  Lee! Ọ na-agafere m ma adịghị m ahụ ya,Ọ na-agafere ma adịghị m amata na ọ bụ ya.+ 12  Lee! Ọ na-anapụ ihe. Ònye pụrụ igbochi ya?Ònye pụrụ ịsị ya, ‘Gịnị ka ị na-eme?’+ 13  Chineke agaghị eme ka iwe ya dajụọ;+Ndị na-enyere ihe na-eme ihe ike aka+ ga-ada n’ụkwụ ya, 14  Ma ya fọdụzie mgbe m sara ya okwu!M ga-ahọ okwu m ga-agwa ya ahọ,+ 15  Bụ́ onye m na-agaghị asa okwu, a sịgodị na m bụ onye ziri ezi.+M ga-arịọ onye mụ na ya nwere ikpe arịrịọ.+ 16  Ọ bụrụ na mụ akpọọ ya, ọ̀ ga-aza m?+Ekwetaghị m na ọ ga-ege ntị n’olu m; 17  Bụ́ onye ji oké ifufe mmiri na-emerụsị m ahụ́,Na-emekwa ka ọnyá m dị ọtụtụ n’enweghị ihe m mere.+ 18  Ọ gaghị ekwe ka m kuru ume ndụ,+N’ihi na ọ na-eme ka ihe dị ilu zuo m ahụ́. 19  Ọ bụrụ na e nwere onye dị ike, ọ bụ ya;+Ọ bụrụkwa na e nwere onye dị ike, nke na-ekpekwa ikpe ziri ezi, ọ ga-adị m mma ma ọ kpọọ m! 20  Ọ bụrụ na m bụ onye ziri ezi, ọnụ m ga-akpọ m onye ajọ omume;A si na mụ enweghị ihe a ga-eji taa m ụta, ọ ga-akpọ m onye aghụghọ. 21  A sị na mụ enweghị ihe a ga-eji taa m ụta, agaghị m ama mkpụrụ obi m;M ga-akpọ ndụ m asị. 22  E nwere otu ihe. Ọ bụ ya mere m ji asị,‘Ọ na-ala ma onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ma onye ajọ omume n’iyi.’+ 23  Ọ bụrụ na oké idei mmiri akpata ọnwụ mberede,Ọ ga-akwa obi nkoropụ nke ndị aka ha dị ọcha emo. 24  E nyefewo ụwa n’aka onye ajọ omume;+Ọ na-ekpuchi ihu ndị ikpe ya.Ma ọ́ bụghị ya, ọ̀ bụzi onye? 25  Ụbọchị niile nke ndụ m efewokwa ọsọ karịa onye na-agba ọsọ;+Ha agbaferewo, ọ dịghị ihe ọma ha ga-ahụ. 26  Ha agafewo dị ka ụgbọ epeepe e ji ahịhịa amị rụọ,Dị ka ugo nke na-efegharị na-achọ ihe ọ ga-eri.+ 27  A sị na m sịrị, ‘Ka m chefuo nchegbu m,+Ka m kwụsị ịgbarụ ihu+ m ma gbasapụ ihu m,’ 28  Ụjọ ihe mgbu m niile na-atụ m;+Amaara m na ị gaghị agụ m n’onye aka ya dị ọcha. 29  M ga-aghọ onye ọjọọ.Gịnị mere m ji na-adọgbu onwe m n’ọrụ n’efu?+ 30  Ọ bụrụ na mụ asaa ahụ́ ná mmiri snoo,Jirikwa ncha+ kwọọ aka m, 31  N’ime olulu ka ị ga-asụnye m,Uwe m ga-akpọkwa m asị. 32  N’ihi na ọ bụghị mmadụ+ dị ka mụ onwe m nke na m ga-asa ya okwu,Nke na anyị ga-ezukọ ka e kpeere anyị ikpe. 33  E nweghị onye ọ bụla ga-ebiri mụ na ya ikpe,+Nke na ọ ga-ebikwasị anyị abụọ aka. 34  Ya wepụ ụtarị ya n’ahụ́ m,+Ka ụjọ ya gharakwa imenye m egwu. 35  Ka m kwuo okwu n’atụghị ya egwu,N’ihi na adịghị m eme otú ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji